< Ibraniyawa 10 >

1 Bara lidu cas nshinari min nimon icine na iba dak, na innere kidegene atimine ba, lidu wansa litaa alenge na idi kupopo Kutelle iti lau ba nin leli uni lite, nworu upirist din nlii abun nizuwe likus udu likus.
Iwu ahụ bụ naanị onyinyo na-egosi ihe ọma gaje ịbịa. Nʼihi ya, o zughị oke nʼonwe ya isite nʼaja ndị ahụ a na-achụ mgbe mgbe kwa afọ, mee ka ndị ahụ na-abịaru nso ife ofufe zuo oke.
2 sa iwasa isuna unizu nlenge ugutuzunu nmii ye? nanya nani anan tumuzunu Kutelle ina malu ukusu nani, na iwa kuru ise uyiru kulapi ba.
Ma ọ bụghị otu a, ọ bụ na a gabeghị akwụsị ịchụ aja ndị a? Ọ bụrụ na a sachapụla njọ ndị na-efe ofufe na mbụ, akọnuche ha agaghịkwa ama ha ikpe mmehie ha.
3 Bara nanya nle ugutunu nmii, imon nlizinu duku usu kulapi likus udu likus.
Ma nke bụ eziokwu bụ na ihe aja ndị a na-eme bụ ichetara ha mmehie ha kwa afọ niile.
4 Bara uwasa uso nani ba, bara nmii na daki nin niyin kalla alapi ba.
Nʼihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie.
5 Kubi na Kristi wa dak nanya nyulele, awa woro “na anug dinin nayi kitene ngutunu nmii sa unzu ba, nin nani anung kellen nidowo mine bara myeg.
Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị, “Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ kama ị kwadoro ahụ nye m.
6 Na fe dimun liburi liboo nanya vat ufilizinu nin ngutunu nmii bara kulapi.
Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie, ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị.
7 sanan meng woro “yene, kikane meng ba su imonfe, Kutelle, nafo na inyertin kitene mighe nanya kubaga.
Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ. Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’”
8 Amini wa woro nafo udi nbune “nafe dinin su, ngutunu nmii bara kulapi na udinin suwe ba” ugutunu nmii na iwa ni bara lidu.
O kwuru na mbụ, “Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị” (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị).
9 Amini nworo “yene” kukane nsu unufife” ana ceo usu nbrune, bara anan damun unbe.
O kwukwara ọzọ, “Lee abịala m ime uche gị.” Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya.
10 Nanya usu unbe, tinanse ukusu kiti Kutelle unuzun nnii kidowo Kristi Yesu urum cas.
Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro.
11 Kidegenari ko uyeme upirist as ayisina kolome liyiri nsu katuwa, nnizu ngutunu nmii, ulenge na uwasa ukalla alapi ba.
Onye nchụaja ọbụla na-eguzo kwa ụbọchị na-efe ofufe, na-achụkwa otu aja ahụ ugboro ugboro, bụ aja nke na-enweghị ike ịsachapụ mmehie.
12 Bara kubi na Kiristi wa gutun nmii urum bara alapi udu sa ligan, amini sosin ncara ulime Kutelle,
Ma mgbe Kraịst chụchara naanị otu aja ahụ, otu ugboro nʼihi mmehie niile, ọ nọdụrụ ala nʼaka nri Chineke.
13 ncawe udu kubi na iba toltunu unan nivira, aso unan patilu nin nabunu.
Ebe ahụ ka ọ nọ ugbu a na-eche ka ndị iro ya niile bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
14 Bara uni urum, amini nati annit lau sa ligan, alenge na ina kusu nani.
Nʼihi na o sitela nʼotu aja mee ka ndị ahụ a na-eme ka ha dịrị nsọ zuo oke mgbe niile.
15 Nin nfip milau tutun nso iyizi inba kiti bite, bara nin cizine ana woro,
Mmụọ nsọ na-agbakwara anyị ama banyere ihe ndị a mgbe o buru ụzọ kwuo:
16 “alelereld alikawali na nwansu nan ghinu, mamal nayiri ane” ubellun ncikilari; meng ba ciu adu nighe nanya nayi mine, mba kuru nnyertu anin nanya nibinai mine”
“Nke a bụ ọgbụgba ndụ ahụ mụ na ha ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m etinye iwu m nʼobi ha. Aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.”
17 Amini wa woro “na nbakuru nlizin nin nalapi sa usu ngbas mine ba.
O kwukwara sị, “Agaghị m echetakwa mmehie ha na mmebi iwu ha niile ọzọ.”
18 Nene kikanga na ushawu nile imone, unizu mine ba lawu una kulapi ba.
Ya mere, ebe ọ bụ na a gbagharala mmehie ndị a, ọ dịkwaghị mkpa ịchụ ajọ ọzọ maka mgbaghara mmehie.
19 Bara nani linuana, tidi nin nayi akone npiru nanya kiti kilau unzu nmii Yesu.
Nʼihi nke a, ụmụnna m, ebe anyị nwere nkwuwa okwu ịbanye nʼEbe Kachasị Nsọ site nʼọbara Jisọs,
20 lolere libau na an punari mun linnere kidowo mye lipese nin lin nlai unzu kuzani kibulun
bụ ụzọ ọhụrụ nke o meghere nye anyị, nke dị ọhụrụ ma dịkwa ndụ site nʼakwa mgbochi ahụ nke bụ ahụ ya,
21 Nin bara ti dimun npirist udia kitene kilari Kutelle.
ebe anyị nwekwara onye nchụaja dị ukwuu, nke na-elekọta ụlọ Chineke,
22 Na ti dak kupopo mye nin nayi kidegen nin yardu a uyinnu sa uyenn, nin nayi bite tizamin nlau ku nin nlah liburi, tikusu nidowo bite nin nmyen milau.
ka anyị bịaruo nso site nʼobi dị ọcha, na ntụkwasị obi zuru ezu nke okwukwe, ka anyị bụrụ ndị a sachara obi ha site nʼakọnuche rụrụ arụ, ka anyị bụrụkwa ndị e ji mmiri dị ezigbo ọcha sachaa ahụ anyị.
23 Na tutun timin ubellu nalapi bite gangan, ticeau nibinai nin nayi akone, sa uketizu, bara ame Kutelle na ana su nari alkawali unan kidegenari.
Ya mere, ka anyị jidesie nkwupụta nke olileanya anyị ike, nʼihi na onye ahụ kwere nkwa kwesiri ntụkwasị obi.
24 Na tiyene ndah na tiba gpinu ati bite agang, ti su usu nin lidu licine.
Ka anyị tụgharịa uche otu anyị ga-esi kpalie ibe anyị nʼịhụnanya na ezi ọrụ.
25 Na tiwa ciin uzursu ligowe ba, nafo na among di nsuwe, nin nani na ti bun ati bite kang, nafo na idin yenju liyiri lole din dasu susut.
Ka anyị gharakwa ichefu nzukọ anyị dị ka ụfọdụ na-eme, kama ka anyị na-agbarịta onwe anyị ume, karịsịa, ugbu a ụbọchị ahụ na-abịa nso.
26 Asa arike dagangan tisu kulapi, nbaya na tina malu useru uyiru kidegen, na ugutunu nmii bara kulapi duuku ba.
Ọ bụrụ na anyị akpachapụ anya na-anọgide na mmehie mgbe anyị matachara eziokwu ahụ, o nwekwaghị aja ọzọ fọdụrụ a ga-achụ banyere mmehie niile.
27 Nin nani umong uciu kibinai fiu duku, unwucu kidegen nin nla npiu gwagwai uba juju ansn nivira nin Kutelle.
Kama naanị ikpe dị oke egwu, nke ga-adị ka ọkụ na-ere ike ike, nke ga-erechapụ ndị niile bụ ndị iro.
28 Vat ulenge na anari lidu Musa aba kuu sa nkunekune, nin bellu niyizi inba nan waba sa an watat.
Onye ọbụla dara iwu Mosis, na-anwụ na-enweghị ebere, site nʼakaebe mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara megide ya.
29 Iyaghari ba yitu ngbardang nhoro nafe din kpilizu ucaun ini ulenge na a patila Gono Kutelle, ulenge na anaa nmii nalikawali nafo imomon indinong nmii ye mongo na awa kusu - vat ulenge na azogo nfip mitope?
Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ụdị ahụhụ unu chere na a ga-enye onye lelịrị Ọkpara Chineke, gịnị ka a ga-eme onye merụrụ ọbara nke ọgbụgba ndụ nke e ji doo ya nsọ, na onye kpasuru mmụọ nke amara ahụ iwe?
30 Bara tiyinu ulenge na ana woro “utune una nighari meng ba biyiu” nin tutun cikilari ba wucu kidegen nanit mye”.
Nʼihi na anyị maa onye ahụ kwurunụ, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ọzọkwa, “Onyenwe anyị ga-ekpe ndị ya ikpe.”
31 Iso imon fiuwari, udiu nacara Kutelle nlai.
Ọ bụ ihe dị oke egwu ịdaba nʼaka Chineke dị ndụ.
32 Bara lizino nin nayiri kidung, na iwa yinin-inani wa teru ayi nin nzapi nin niuu.
Ma chetakwanụ ụbọchị mbụ ndị ahụ, mgbe unu natachara ìhè, unu nọgidesikwara ike nʼagbanyeghị oke ahụhụ niile unu tara.
33 fe iwa sufi tizogo inutun fi fong, itafi unieo amini wa munu nin nalenge na iwa piru nanya nleli uniuwe.
Mgbe ụfọdụ, a kparịrị unu nʼihu ọha, unu natakwara mkpagbu. Nʼoge ọzọ, unu soro ndị e si otu a mesoo mmeso.
34 Bara fe wa dinin nkunekune kiti nalenge na idi licin, umini wa seru nin lanzu nmang, ubulu nimon nacarafe, nin nyiru fe litife udinin nimon na cara igegeme saligan.
Unu were obi ebere soro ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ taa ahụhụ, unu jikwa ọṅụ nabata ya mgbe a nakọrọchara unu ihe niile unu nwere, nʼihi na unu onwe unu matara na unu nwere ihe ka mma, nke na-anọgide.
35 Bara nani, na iwa fiilin ayi akone fe ba, alenge na adinin nduk udia.
Ya mere, unu ahapụkwala ntụkwasị obi unu ahụ, nʼihi na ọ na-eweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu.
36 Bara udinin su nhakuri, bara unan sere imon ile na Kutelle na sufi alikawali, kubi na usu katuwa mye.
Nʼihi ya, unu kwesiri inwe ndidi ka ọ ga-abụ na mgbe unu mere uche Chineke unu ga-anata ihe e kwere na nkwa.
37 “Bara nanya kubi cingling, ame ulenge na adin ncinu, gbas aba dak na nin dandaunu ba.
Nʼihi, “Na oge na-adịghị anya, onye ahụ nke na-abịa ga-abịa ọ gaghị anọkwa ọdụ.”
38 Anit alau nighe ba se ulai kiti nyinnu sa uyenu, asa a kpilla, na meng ba lanzu nmang mye ba”.
Ma, “Onye ezi omume nkem ga-esite nʼokwukwe dị ndụ. Mkpụrụobi m agaghị e nwee mmasị nʼime onye ọbụla na-alaghachi azụ.”
39 Bara nani na arike di nafo alenge na ina kpillin kiti nmusuzu nin nani, tidi nafo alenge na imin uyinnu mine sa uyennu bara uciu nidowo mine.
Ma anyị abụghị ndị na-alaghachi azụ si otu a laa nʼiyi. Kama anyị dịnyere ndị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.

< Ibraniyawa 10 >