< 1 Utasalonika 5 >

1 Nbelen na biri nin na kus, na ubelen woru i nyertin minu imomon diba.
Ugbu a, ụmụnna, banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-emezu. Echeghị m na ọ dị mkpa i degara unu akwụkwọ.
2 Anun atimine yiru chaut lirin Chikilari nofo ukiri nin kitik.
Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị.
3 Asa iworo, “Mmang nin taup,” umolsu ba dak nani. Nnafo uwan nmaru na asa alanza ukonu. Na nnere na iba nyeshu nu ba.
Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ.
4 Anun linuana, na idi nyan nsirt ba bari lo lire wa tuu minu nofo ukiri.
Ma unu onwe unu, ụmụnna, anọghị nʼọchịchịrị, nke ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dịka onye ohi.
5 Bara anun vat nonon nkanangari nin nnonon lirin. Na arik nono kiti kari ba sa nonon sirt.
Unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie, anyị abụkwaghị nke ọchịchịrị maọbụ nke abalị.
6 Bara nani, na tiwa sun mmoro nofo nigisine ba na ti yenje kiti tikpilza kidung.
Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị.
7 Alenge na idin moro idin su nin kitikari, alenge tutung na idin soh idin su nin kitikari.
Nʼihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. Ọ bụkwa nʼabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke.
8 Bara na arik nono liri gnari, na ti kpilza kidung. Na ti shon kuyangi kidegen nin suu, a, kitik, kidegen tuchu uchin dak.
Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe.
9 Na Kutelle na che na bara tinana nayi mere ba, bara usen tuchu nyan Cikilari Yesu Kristi.
Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
10 Ulenge na aku bara arik, Sa tidin yenju kiti sa ti din moro, ti so ligowe nin ghe.
Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ.
11 Bara nanitan linuana nofo na ina man su.
Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.
12 Ti din belu minu, linuana, yinnan nin na lenge na ina su kataah nyan mine nin nalenge na itaa minu akara.
Anyị na-arịọsị unu ike, ụmụnna, ka unu na-asọpụrụ ndị niile na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼihi unu, ndị ahụ na-elekọta unu nʼime ọrụ Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adụ unu ọdụ.
13 Tikuru tibelin minu minon nani kang nyan suu bara kataah mine. Son mang nya mine.
Ka unu na-akwanyere ha ugwu site nʼịhụnanya nʼihi ụdị ọrụ ha na-arụ. Ka unu na mmadụ ibe unu birikwa nʼudo.
14 Ti din ti minu akara, linuana: ale na isosin sa ukpadu wunon nani atuf, ale na nibinei mine kete ita nani akara nibinei, wutun kimal na le na idi gugur, nonkon nibinei.
Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ.
15 Yenje umon wa kurtung imon inan zan nin ni nanzang udu kitin mong. Tenzinen nimon ichine udu linuana nin vat.
Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ.
16 Suun liburi libo-o kolome liri.
Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile.
17 Suun nlira sa ligang.
Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka.
18 Nya nimon vat nan ugodo. Bara ulelere usu Kutelle nyan Kristi Yesu bara anun.
Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.
19 Yenje uwa bicho Ufunu.
Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ.
20 Yenje uwa nari ni dura.
Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya.
21 Dumuna imon vat. Mino ile imon a ichineari.
Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike.
22 Chino vat nimon inanzan.
Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile.
23 Na Kutelle mmang litime akusu fi vat, ulai nin kidowo fe so sa ndinon udak Ncikilari Yesu Kristi.
Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
24 Unan kidegen ame ulenge na adin yichu fi, ulenge na aba su.
Onye ahụ kpọrọ unu ga-emezu ihe ndị a, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.
25 Linuana, sun nlira bara arik.
Biko ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere.
26 Lison linuana vat nin lulu na kpan nnuu ulau.
Werenụ isurita ọnụ dị nsọ na-ekele ụmụnna anyị dum.
27 Ndin for achara nyan Cikilari nworu ikaranta iyert ilele udu linuana vat.
Iwu m na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị bụ ka unu gụpụta akwụkwọ a nʼihu ụmụnna niile.
28 Na nshew Cikilari bite Yesu Kristi so nan ghinu anun.
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu niile.

< 1 Utasalonika 5 >