< 1 Yuhana 1 >

1 Inlele wadi infune, elena tina mali lazu ilena tina mali yenu nin nizi bit, ilena tina mali gwinu, nin nachara bi na kifoo, kitene tipin lai.
Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị site na mmalite, nke anyị nụrụ, nke anyị jikwa anya anyị hụ, nke anyị lekwasịrị anya, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ.
2 Ulaiye na ina yinin nin yenu, nin tinizi iba nin beling minu ulai sali ligang, ulena wadi nin ncife, na tina yino kiti bit. (aiōnios g166)
Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. (aiōnios g166)
3 Ilele na ti yene nin lanzu tima belin minu, bara usuu usujaida ligowe nin narik nin usujaida ligowe nin Ncif nin Uson, Yesu Kristi
Anyị na-ekwusara unu ihe anyị hụrụ na nke anyị nụrụ, ka unu soro anyị nwee nnwekọ. Nʼezie nnwekọ anyị bụ nke anyị na Nna na nke Ọkpara ya bụ Jisọs Kraịst, na-enwekọ.
4 Tinanin yrtine elemone bara ti timinu liburi liboo kaan.
Anyị na-edere unu ihe ndị a nʼihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke.
5 Ulelere uliru umagulete dana tina laza tidin belin minu: Kutelle nkanan ghari nanya me na mbibit diku ba vat.
Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nʼaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọbụla adịghịkwa nʼime ya.
6 Andi tibenle tidin su usujaida ligowe nin ghe tinani din chin nanya sirti tia kinu, natidin su kidegen ghe ba.
Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nʼezi nnwekọ ma na-ebi nʼime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu ahụ adịghịkwa nʼime anyị.
7 Bara nani andi tidin chin nanya nkana ghe nafo amen in nkanan ghe, tinani dinin dimun usujaida ligowe nin kogha, nin mmii Yesu uson me kusu nari lau unu nalapi bit.
Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nʼìhè, dị ka ya onwe ya si nọọ nʼìhè, mgbe ahụ anyị na ibe anyị na-enwe ezi nnwekọ. Ọbara Jisọs bụ Ọkpara ya na-asachapụkwa anyị mmehie anyị niile.
8 Andi ti woro tidinin kulapi ba, tidin rusuzu atibitari na kidegen di nanya bi ba.
Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị, na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ nʼime anyị.
9 Bara nani anadi benle alapi bit, ame dinin kibinai kisheu ma shawu nin na lapi bite anin kusu nari lau unuzu salinlaubite.
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, onye ahụ kwesiri ntụkwasị obi na onye ezi omume, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile, sachapụkwa anyị site nʼajọ omume anyị niile.
10 Andi tibenle ti dinin na lapi ba tita ghe unan kinu, nin nani tipipin me di nanya bit ba.
Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọbụla, anyị na-akpọ ya onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nʼime anyị.

< 1 Yuhana 1 >