< 1 Ukorintiyawa 16 >

1 Nene nbelen mapitiru pitiru nanit alau, nafo na nna bellin anan dortu Kutellẹ nati nlira in Galantiya, nanere anung wang sun.
Nʼihe niile banyere ụtụ ihe onyinye nke ndị nsọ, gbalịanụ mee dịka m nyere ndị chọọchị dị nʼakụkụ Galeshịa nʼiwu.
2 Liri lin cizinu nayiri kuzor, na kogha mine rafa imoimon likot ligan kayiri me. Asa nda na mapitiru pitire ma yituku ba.
Ụbọchị ụka niile, ka onye ọbụla site nʼihe ọ kpatara nʼizu ụka ahụ wepụta ụfọdụ ihe nke ọ ga-eji nye onyinye a. Unu e cherekwala ịnakọta ihe onyinye ndị a ruo mgbe m ga-abịa. Ka a hapụ iche tutu ruo mgbe m bịara.
3 Asa nda duru, alenge na anung yinna mung, mba tu nani nin niyerti idi ni mapitiru pitiru mine in Urshalima.
Mgbe m bịara, aga m edenye ndị ahụ kwesiri ntụkwasị obi, bụ ndị unu họpụtara akwụkwọ nkọwa, ziga ha ibugara ndị nọ na Jerusalem onyinye obiọma unu.
4 Andi uma caunu meng wang do, ima du nan mi.
Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa na m ga-eso ha gaa, mụ na ha ga-esoro.
5 Mba dak kitime, asa nda kata in Makidoniya-bara nma katun Makidoniya.
Aga m abịa ileta unu mgbe m gasịrị Masidonia. Nʼihi na ana m ezube isi nʼụzọ Masidonia abịa.
6 Nmoti nanghinuere mbaso udu kubin pitiru kiti, bara inan buni ncinnighe, vat kiti kanga na nma du.
Mgbe m bịara, ọ na-adị m ka mụ na unu ga-anọ ogologo oge. Ma eleghị anya, anyị ga-anọ tutu oge oyi agwụ. Mgbe ahụ site, nʼinyeaka unu, aga m ahapụ unu gaa ebe ọzọ.
7 Bara na ndi nin su in yene munu nene nan nya kubiri bat ba, ndi cissu kibinayi ntinayiri gbardang nan ghinu, andi Cikilare in yinna.
Nʼihi na-achọghị m ileta unu ugbu a m nọ nʼije ngafere. Kama ana m ezube ịbịa nọnyere unu nwa oge, ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị e kwenye.
8 Vat nani meng ba so in Afisos nduru kubin pentecost,
Ma aga m anọ nʼEfesọs tutu ruo oge Pentikọọsụ,
9 Vat nin woru katwa puni pash, a anan shina yita ku gbardang.
nʼihi na-emegheela ọnụ ụzọ dị ukwuu nke na-arụpụta ezi ọrụ nye m, ma ha dị ọtụtụ bụ ndị na-eguzogide m.
10 Nene asa Timitawus nda, na aso nan ghinu sa fiu, bara adin su katwa in Cikilari nafo menghe.
Ọ bụrụ na Timoti abịa, lezienụ anya mee ka ọ ghara inwe ihe ọ ga-atụ egwu mgbe ọ nọ nʼetiti unu, nʼihi na ọ bụ onye na-arụ ọrụ Onyenwe anyị dịka m si arụ ya.
11 Na umong wa yasighe ba. Buno ghe nya shewu anan da kiti ning, bara ndin cissu iyizi in yene ghe ada ligowe nan nya linuana.
Ka onye ọbụla ghara ileda ya anya. Kama, dupunụ ya nʼije ya nʼudo ka o nwe ike lọghachikwute m. Mụ na ụmụnna ndị ọzọ na-ele anya nlọta ya.
12 Nengene ubelen Apolos gwana bit: Nna ghe likara kibinayi a dak kitimine nin linuana, na a yinna udake nene ba; ama dak asa ase kubi.
Arịrịọ m nwanne anyị Apọlọs ka o soro ụmụnna ndị ọzọ bịa leta unu, ma ọ bụghị uche ya ma ọlị ịbịakwute unu ugbu a. Ọ ga-abịa mgbe ọbụla ohere pụtara.
13 Sun lissosi nca, yisinan nin nakara nan nya yinu sa uyenu mine, sun nafo nanilime, yitan nin nakara.
Na-echenụ nche mgbe niile, guzosienụ ike nʼime okwukwe unu. Dịrịnụ ka ndị tozuru dimkpa, ndị dị ike.
14 Vat nimon ile na ima su sun nan nya kauna.
Werenụ ịhụnanya na-arụ ọrụ ọbụla unu na-arụ.
15 Iyiru anan kilarin Istifanas, inughere anan cizinun seru nlirun tucu Akaya, inughe na ni atimine kiti katwa nanit alau. Nene ndi minu kucukusu, nuana nilime nan nishono,
Ugbu a, arịọ m unu ụmụnna m, unu maara na ezinaụlọ Stefanas bụ ndị mbụ kwere ekwe nʼala Akaịa. Ha nyekwara onwe ha maka ijere ndị nsọ ozi.
16 nakpan atimine kiti inmusu nanit ane, nin vat lenge na adin bunu nan nya katwa a anontizo ligowe nan ghirik.
Ana m arịọ unu ka unu na-asọpụrụ ndị dị otu a, nakwa onye ọbụla bụ onye otu anyị na onye ọrụ anyị.
17 Ndi su liburi libo nin dakin Istifanas, Furtunatus, a Akaikus; inun kulo kika na anun duku ba.
Obi tọrọ m ụtọ nʼọbịbịa nke Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs. Ha emelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nʼebe a.
18 Bara ina da ghantini uruhu nighe nin na lele. Bara nani cau iyinni nin nimus nanit nafo alengene.
Ha kwalitere mmụọ m dịka ha kwalitere nke unu. Nyenụ ndị dị otu a nsọpụrụ.
19 Anan dortu Kutellẹ in Asiya din lissu minu. Akila nin Briskila din lissu nan nya NCikilari, nin nanan dortu Kutellẹ nan nya ngamine.
Ụlọ chọọchị niile dị nʼokpuru Eshịa na-ezitere unu ozi ekele. Akwila na Prisila, na nzukọ dị nʼụlọ ha na-enye unu ekele obiọma nʼime Onyenwe anyị.
20 Vat nuana nilime nan nishono din lissu minu. Lisson atimine nin ni lip icine.
Ụmụnna niile nọ nʼebe a na-ekele unu. Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.
21 Meng, Bulus, nsu ile iyerte nin nilip ncara ning.
Ọ bụ mụ onwe m bụ Pọl ji aka m na-ede ekele nke a.
22 Andi ko uyeme unit na adi nsu usun Cikalari ba, na utin nu kifo ghe. Na Cikilari bite dak!
Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụghị Onyenwe anyị nʼanya, ka ọ bụrụ onye a bụrụ ọnụ. Onyenwe anyị bịa!
23 Na ubolu Ncikilari Yisa so nan ghinu.
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
24 Usu ning so nan ghinu vat nan nya Kristi Yisa. Uso nani.
Ka ịhụnanya m dịnyere unu niile site nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst. Amen.

< 1 Ukorintiyawa 16 >