< 1 Ukorintiyawa 1 >

1 Meng Bulus, uyiculun Kristi Yisa nso unan kadura bara uyinnu Kutellẹ, a Sostanisu gwana bit,
Pọl, onye a kpọrọ ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst site nʼọchịchọ Chineke, na nwanna anyị nwoke Sostenis,
2 udu kiti na nan tortu Kutellẹ na idi in Korintus, alenge na Kristi Yisa nati nani iso lan, iwa yiwa nani iso anit alau, vat nan na lenge na idin yicu lissan Cikilari bite Yisa Kristi in ko kame kiti, Cikilari mine nini unbit.
Ọ bụ unu nzukọ Chineke dị na Kọrint ka a na-edere akwụkwọ a, ndị e doro nsọ nʼime Kraịst Jisọs, na ndị a kpọrọ ibi ndụ dị nsọ, tinyere ndị ahụ niile na-akpọku aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye bụ Onyenwe ha na Onyenwe anyị:
3 Na ubolu me nin lissosin lisheu unuzu kitiin Kutellẹ ucif bit a Cikilari Yisa Kristi.
Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
4 Ndin godu Kutelle ning ko kome kubi bara anughe, nan nyan bolu Kutellẹ na Kristi Yisa nani minu.
Ana m ekele Chineke ekele nʼihi onyinye amara niile o nyere unu site na Kraịst Jisọs.
5 Ana tti minu anan se nan nya ko lome libau, nan nya nliru nin yiru vat.
Nʼihi na e emeela ka unu baa ụba nʼụzọ niile, nʼime ya, ma nʼokwu unu ma na nghọta unu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu niile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwupụta okwu banyere oziọma ya.
6 Ana ti minu ita imon nacara, nafo na ubellee nimon liburu libo litin Kristi, na nuzu kanang nan nya mine.
Nʼihi na ịgba akaebe banyere Kraịst pụtara ihe, guzosiekwa ike na ndụ unu.
7 Bara nani na idiira ufilllu nruhuba, naffo na ina yita nin tok ncaa nnuzu kanang in Cikilari bite Yisa Kristi.
Otu ihe si dị, ọ dịghị onyinye mmụọ fọdụrụ unu nke unu na-enweghị, ka unu nọrọ na-eche mgbe Chineke ga-egosipụta Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
8 Ame ni minu akara tutung udi duri imaline, bara inan so sa alapi lirin Cikilari bite Yisa Kristi.
Ọ ga-eme ka unu dị ike ruo na mgbe ikpeazụ, meekwa ka unu bụrụ ndị na-enweghị ịta ụta nʼụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
9 Kutellẹ di nin yinnu, ame ulenge na ana yicila minu nan nya lissosin ligo nin saunne, Yisa Kristi Cikilari bite.
Chineke, onye kpọbatara unu ka unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na-enwe mmekọrịta kwesiri ntụkwasị obi.
10 Nene ndi munu kucukusu, nuana nilime nan nishono, nan nya lissan Cikilari bite Yisa Kristi, na vat mine na yinin, na i wa se uwucu nati nati nan nya mine ba. Ndi kucukusu imunu ati umalizinu kugir kun lo ligowe nin kibinai kirum a udalili urim.
Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu niile na-ekwekọrịta nʼihe ọbụla unu kwuru, ka nkewa ọbụla gharakwa ịbata nʼetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nʼotu, nʼechiche obi unu na nʼizu unu.
11 Nani anan gan kuluwi na da tyi vet natuf nbeleng nworu uwutuzunu din piun nan nya mine.
Nʼihi na ụmụnna m, esi m nʼọnụ ndị si nʼezinaụlọ Kloyi bịara nʼebe a nụta na esemokwu dị nʼetiti unu.
12 Nene uliru niighe ule: Ko gha mine din su, “Mengg un Bulus ari,” “Meng un Apolos” “Meng un Kefas,” sa, “Mengg un Kristi.”
Anụrụ m na ịkpa iche iche abatala nʼetiti unu. Na ụfọdụ nʼime unu na-asị, “Abụ m onye na-eso Pọl”; ndị ọzọ na-asịkwa, “Abụ m onye na-eso Apọlọs”; ndị ọzọkwa na-asị, “Ana m eso Sefas”; ma ndị ọzọ na-asịkwa, “Ọ bụ Kraịst ka m na-eso.”
13 Kristẹ nkoso kidowa? iwa kotun Bulus ku kuca bara anughe? Iwa shintin munu nmyen nan nya lissan Bulussa?
Kraịst, ọ dị abụọ? Ọ bụ Pọl ka a kpọgidere nʼobe nʼihi unu? Ọ dị onye e mere baptizim nʼaha Pọl?
14 Ndi nin liburi libo kiti Kutellẹ na nna shintin umon mine nmyen ba, se kiribun nin Gayus.
Ana m ekele Chineke ekele na ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu m mere baptizim, ewezugakwa Krispọs na Gaiọs.
15 Una so nani bara na umong mine man woru miyari na shintin ghe nmyen nan nya lissa ning ba.
Ya mere, ọ dịghị onye nʼime unu ga-asị na e mere ya baptizim nʼaha m.
16 Ina kuru nshintino anan gan Istifanus ku. Nbanda nani, nan yiru sa nnakuru nshinto among tutung ba.
(Ahaa! Emekwara m Stefanas na ezinaụlọ ya baptizim. Ewezuga ndị a, amaghị m ma m ga-echetakwa onye ọzọ m mere baptizim nʼonwe m.)
17 Bara ana Kristi na tuyi nshitu anitari nmyen ba nani nsu uwazi nliru ntucuari na nin nagbulan njinjin nnit ba, bara kuca nkootunu in Kristi wa so imon ihe.
Nʼihi na Kraịst ezighị m ime ndị mmadụ baptizim. O zitere m iji okwu dị mfe kwusaa oziọma ya. Ọ bụghị iji okwu oke mmụta na amamihe nke mmadụ ka ike nke obe Kraịst ghara ịbụ ihe efu.
18 Bara kadura kuca nkotunuee tilalanghari kiti na lenge na i din nan nya nkul. Nani kitii na lenge na Kutellẹ din kacisso mine, likara Kutellẹ ari.
Nʼihi na okwu maka obe bụ ihe nzuzu nye ndị na-efu efu, ma nye anyị ndị a na-azọpụta, ọ bụrụ anyị ike nke Chineke.
19 Bara ina nyertin, “Meng ma malu kiti nin dadiu na yinjini” mma canu uyinnu na nan yiru.
E dere ya, “Aga m emebi amamihe ndị maara ihe. Aga m emekwa ka oke nghọta nke ndị maara ihe bụrụ ihe efu.”
20 Unit ujinjinghe din weri? Unan ni nyerte din we? Unan piziru in yinnu nko kuje din we? Na Kutellẹ na kpilya njinjin in yeh misoo tilalang ba? (aiōn g165)
Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu? (aiōn g165)
21 Bara na uyih vat nin jinjing nnin na una yinnin Kutellẹ ba, una poah Kutellẹ liburi nan nya tilalan nbellu nliru Kutelle kiti na lenge na iyinna.
Ma ebe ọ bụ site nʼamamihe nke Chineke, ụwa enweghị ike ịmata Chineke site na amamihe nke ya, ọ dị Chineke ezi mma isite nʼoziọma nke a na-ekwusa nke ndị mmadụ na-akpọ ihe nzuzu zọpụta ndị kweere.
22 A Yahudawa wa piziru imon al'ajibi a Hilinawa pizira njinjing.
Ndị Juu chọrọ ịhụ ihe ịrịbama, ndị Griik na-achọkwa amamihe.
23 Nani arik din uwazi nkotunu in Kristi, litala ntizuru na Yahudawa a tilalang kiti na Hilinawa.
Ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, onye a kpọgburu nʼobe, onye bụ ihe mgbochi nʼebe ndị Juu nọ, ma na ntị ndị mba ọzọ, ọ dị ka okwu nzuzu.
24 Kiti na lenge na Kutellẹ na yicila, a Yahudawa nin na Hilinawa, ti din su uwazi in Kristi nafo Likara nin kujinjin Kutellẹ.
Ma nye ndị niile a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Griik, Kraịst bụ ike nke Chineke bụrụkwa amamihe nke Chineke.
25 Bara tilalang Kutellẹ katin likara njinjing nanit, a usali likara Kutellẹ katina akara nanit.
Nʼihi na nzuzu Chineke dị mma karịa amamihe niile nke mmadụ, adịghị ike Chineke dịkwa ukwuu karịa ike niile nke mmadụ.
26 Yenen imusun in yicilue na Kutellẹ na yicila munu mun, nuana nilime nin nishono. Na gbardan mine wa di jinjing ba nan nya yenjun nanit. Na gbardang mine wadi nin gongong mbun nanit ba.
Ụmụnna m, chetakwanụ ihe unu bụ mgbe a kpọrọ unu. Chetanụ na ọ bụ ole na ole nʼime unu bụ ndị maara ihe nʼusoro ogugo mmadụ, ndị dị ike, na ndị a maara aha ha nʼobodo.
27 Nani Kutellẹ wa fere imon ilalang in yih ani unit ujinjing ncin. Kutellẹ waa fere imon nsali nakara in yih ani imon nakara in yih ncin mun.
Ma lee na ọ bụ ihe ahụ ụwa gụrụ dịka ihe nzuzu, ka Chineke họrọ iji mee ka ihere mee ndị amamihe. Ọ bụkwa ihe ha gụrụ dịka ihe na-adịghị ike ka Chineke họọrọ iji mee ka ihere mee ndị dị ike.
28 Kutellẹ wa fere imon igugur na ina filing in yih umunu imon ile na tiyira inin nafo imon ile na arik in yira imon icinari.
Nʼihi na Chineke họọrọ ihe dịkarịrị ala nke ụwa, na ihe a jụrụ ajụ, jiri ha mee ka ihe ụwa chere na ọ baghị uru, bụrụ ihe bara uru.
29 Ana su nani bara ummong wa se imon for figiri mbun me.
Ka mmadụ ọbụla ghara ịnya isi nʼebe Chineke nọ.
30 Bara imon ile na Kutellẹ na su, nene i di nan nyan Kristi Yisa, Ulenge na ana so nari njinjing kiti Kutellẹ katwa kacine bite, nlau bite nin utucu bite.
Ma ọ bụ nʼihi ya ka unu ji nọrọ nʼime Kraịst Jisọs, onye ghọrọ isi amamihe nye anyị site na Chineke, nke bụ ezi omume anyị na nke ido anyị nsọ, na onye mgbapụta anyị.
31 Nafo, na i nyerte nabelin, “Na ulenge na ana fo figiri na a fo nan nyan Cikilari.”
Ya mere, dịka e dere ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.”

< 1 Ukorintiyawa 1 >