< Књига пророка Језекиља 31 >

1 А једанаесте године, трећег месеца, првог дана, дође ми реч Господња говорећи:
O ruo, nʼafọ nke iri na otu, nʼọnwa nke atọ, nʼụbọchị nke mbụ ya, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
2 Сине човечји, кажи Фараону цару мисирском и народу његовом: На шта си налик у величини својој?
“Nwa nke mmadụ, gwa Fero eze Ijipt na ndị agha ya niile okwu sị ha, “‘Olee onye ahụ yiri gị nʼịdị ukwuu?
3 Ето, Асирац беше кедар на Ливану, лепих грана и дебелог хлада и високог раста, коме врхови беху међу густим гранама.
Tulee nʼobi gị ihe gbasara Asịrịa, nke bụ oke obodo bụrụkwa mba a maara aha ya. Ọ dị ka osisi sida nke Lebanọn, nke jupụtara nʼalaka mara mma, nke ọtụtụ alaka ya na-enye ndo, nke dị ezi ogologo, nke alaka ọnụ ya topụrụ tokarịa osisi ọhịa niile.
4 Вода га одгоји, бездана га узвиси; она рекама својим течаше око његовог стабла и пушташе потоке своје к свим дрветима пољским.
O nwetara mmiri mere ka o buo ibu, na isi iyi mmiri miri emi nke mere ka o too ogologo. Iyi ha niile na-asọ nʼokpuru ya. Ebe ahụ ka ha si ezipu ụzọ mmiri ndị na-enye osisi ndị ọzọ dị nʼọhịa mmiri.
5 Зато раст његов надвиси сва дрвета пољска, и умножише се гране његове, и од мноштва воде раширише се одводе његове кад их пушташе.
Nʼihi ya, o toro tokarịa osisi niile nʼogologo. Ngalaba ya bara ụba, alaka ya topụkwara ogologo nʼihi ịdị ukwuu nke mmiri ha na-enweta.
6 На гранама његовим вијаху гнезда све птице небеске, и под гранама његовим све звери пољске лежаху се, и у хладу његовом сеђаху сви велики народи.
Nʼalaka ya niile ka anụ ufe niile nke eluigwe na-akpa akwụ, nʼokpuru ndo nke alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa niile mụrụ ụmụ, oke mba niile dị iche iche bikwara nʼokpuru ndo ya.
7 И беше леп величином својом и дужином грана својих, јер му корен беше код велике воде.
Ọ mara mma nʼịdị ukwuu ya, nʼogologo nke alaka ya nʼawasa, nʼihi na mgbọrọgwụ ya mibara emiba nʼebe mmiri dị ukwuu.
8 Кедри у врту Божјем не могаху га заклонити, јеле не могаху се изједначити с његовим гранама, и јавори не беху као огранци његови; ниједно дрво у врту Божјем не беше на лепоту тако као он.
Osisi sida niile dị nʼubi Chineke a gbara ogige erughị ya nʼọtụtụ. Ọ dịghị osisi junipa niile nwere ngalaba a ga-eji tụnyere nke ya, osisi plenụ niile adịghịkwa ka alaka ya, ọ dịghịkwa osisi dị nʼubi Chineke a gbara ogige, nke yiri ya nʼịma mma ya
9 Учиних га лепог мноштвом грана да му завиђаху сва дрвета едемска што беху у врту Божјем.
Emere m ya ka ọ maa mma site nʼịba ụba nke alaka o nwere, ọ bụ ihe ekworo nye osisi niile nọ nʼIden nʼubi Chineke a gbara ogige.
10 Зато овако вели Господ Господ: Што је висок нарастао, и дигао врх свој међу густе гране, и срце се његово понело висином његовом,
“‘Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼihi na o toro ogologo tokarịa osisi ọhịa niile, nʼihi na ọ nyara isi banyere ọnọdụ ịdị ogologo ya karịa ndị ọzọ,
11 Зато га дадох у руку најсилнијем међу народима да чини с њим шта хоће, одвргох га за безбожност његову.
Eweere m ya nyefee nʼaka onye ahụ na-achị mba niile, ka o mesie ya ike, dịka ịba ụba nke ajọ omume ya si dị. Ewezugakwara m ya nʼakụkụ.
12 И туђинци, најљући између народа, посекоше га и оставише га; гране му попадаше по горама и по свим долинама, и огранци му се изломише по свим потоцима на земљи; и сви народи земаљски отидоше из хлада његовог и оставише га.
Mba ahụ kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere gbuturu ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼala. Ngalaba ya dara nʼelu ugwu ukwu niile nakwa nʼime ndagwurugwu niile. Alaka ya kwa dajisịrị danyesịa nʼime ebe niile gbawara agbawa nke ala mmiri si eru. Mba niile nke ụwa sitere nʼokpuru ndo ya pụta wezuga onwe ha.
13 На изваљеном пању његовом станују све птице небеске, и на гранама су његовим све звери пољске,
Ụmụ nnụnụ niile bere nʼelu ukwu osisi ahụ dara ada, nʼetiti alaka ya niile ka ụmụ anụ ọhịa bịara biri.
14 Да се не поноси висином својом ни једно дрво крај воде и не диже врха свог међу густе гране, и од свих што се натапају да се ни једно не узда у себе ради своје величине; јер су сви предани на смрт, бачени у најдоњи крај земље међу синове људске с онима који силазе у јаму.
Ya mere, ka osisi niile nke dị nʼakụkụ mmiri gharakwa eto ogologo, maọbụ ka ọnụ ọnụ ya ghakwara ịdị elu karịa alaka ndị ahụ bara ụba. Nyekwa na ọ dịkwaghị osisi ọbụla na-enwetazu mmiri nke ga-etoru osisi ndị ahụ nʼogologo. Nʼihi na edebela ha nye ọnwụ, nye ịrịdaru nʼokpuru ụwa, nʼetiti ndị mmadụ ndị na-arịda nʼolulu omimi ahụ.
15 Овако вели Господ Господ: У који дан сиђе у гроб, учиних жалост, покрих бездану њега ради, и уставих реке њене, и велика вода стаде, и расцвелих за њим Ливан, и сва дрвета пољска повенуше за њим. (Sheol h7585)
“‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya. (Sheol h7585)
16 Праском падања његовог устресох народе, кад га свалих у гроб с онима који силазе у јаму; и утешише се на најдоњој страни земље сва дрвета едемска, што је најбоље и најлепше на Ливану, сва што се натапаху. (Sheol h7585)
Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma. (Sheol h7585)
17 И они сиђоше с њим у гроб к онима што су побијени мачем, и мишица његова, и који сеђаху у хладу његовом међу народима. (Sheol h7585)
Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche. (Sheol h7585)
18 На које си међу дрветима едемским налик славом и величином? Али ћеш бити оборен с дрветима едемским у најдоњи крај земље, међу необрезанима ћеш лежати с онима који су побијени мачем. То је Фараон и сав народ његов, говори Господ Господ.
“‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo. “‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’”

< Књига пророка Језекиља 31 >