< ایّوب 29 >

و ایوب باز مثل خود را آورده، گفت: ۱ 1
Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
«کاش که من مثل ماههای پیش می‌بودم و مثل روزهایی که خدا مرا در آنها نگاه می‌داشت. ۲ 2
“Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga, dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m,
هنگامی که چراغ او بر سر من می‌تابید، و با نور او به تاریکی راه می‌رفتم. ۳ 3
mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.
چنانکه در روزهای کامرانی خود می‌بودم، هنگامی که سر خدا بر خیمه من می‌ماند. ۴ 4
Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma, mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,
وقتی که قادر مطلق هنوز با من می‌بود، و فرزندانم به اطراف من می‌بودند. ۵ 5
mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,
حینی که قدمهای خود را باکره می‌شستم و صخره، نهرهای روغن را برای من می ریخت. ۶ 6
mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.
چون به دروازه شهر بیرون می‌رفتم وکرسی خود را در چهار سوق حاضر می‌ساختم. ۷ 7
“Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo were ọnọdụ m nʼama.
جوانان مرا دیده، خود را مخفی می‌ساختند، وپیران برخاسته، می‌ایستادند. ۸ 8
Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha, ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;
سروران از سخن‌گفتن بازمی ایستادند، و دست به دهان خودمی گذاشتند. ۹ 9
ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu ma were aka ha kpuchie ọnụ ha;
آواز شریفان ساکت می‌شد وزبان به کام ایشان می‌چسبید. ۱۰ 10
olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ, ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ.
زیرا گوشی که مرا می‌شنید، مرا خوشحال می‌خواند و چشمی که مرا می‌دید، برایم شهادت می‌داد. ۱۱ 11
Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m, ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m.
زیرافقیری که استغاثه می‌کرد او را می‌رهانیدم، ویتیمی که نیز معاون نداشت. ۱۲ 12
Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka, napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.
برکت شخصی که در هلاکت بود، به من می‌رسید و دل بیوه‌زن راخوش می‌ساختم. ۱۳ 13
Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m; emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.
عدالت را پوشیدم و مراملبس ساخت، و انصاف من مثل ردا و تاج بود. ۱۴ 14
Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe, ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.
من به جهت کوران چشم بودم، و به جهت لنگان پای. ۱۵ 15
Abụ m anya nye onye ìsì, bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.
برای مسکینان پدر بودم، و دعوایی را که نمی دانستم، تفحص می‌کردم. ۱۶ 16
Abụ m nna nke onye nọ na mkpa; bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.
دندانهای آسیای شریر را می‌شکستم و شکار را ازدندانهایش می‌ربودم. ۱۷ 17
Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume, si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu.
«و می‌گفتم، در آشیانه خود جان خواهم سپرد و ایام خویش را مثل عنقا طویل خواهم ساخت. ۱۸ 18
“Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m, na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.
ریشه من به سوی آبها کشیده خواهدگشت، و شبنم بر شاخه هایم ساکن خواهد شد. ۱۹ 19
Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri, na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.
جلال من در من تازه خواهد شد، و کمانم دردستم نو خواهد ماند. ۲۰ 20
Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m, ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’
مرا می‌شنیدند و انتظارمی کشیدند، و برای مشورت من ساکت می‌ماندند. ۲۱ 21
“Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị, ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.
بعد از کلام من دیگر سخن نمی گفتند و قول من بر ایشان فرو می‌چکید. ۲۲ 22
Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ. Okwu m na-ada juu na ntị ha.
و برای من مثل باران انتظار می‌کشیدند و دهان خویش را مثل باران آخرین باز می‌کردند. ۲۳ 23
Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo, na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị.
اگر بر ایشان می‌خندیدم باور نمی کردند، و نور چهره مرا تاریک نمی ساختند. ۲۴ 24
Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya; ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.
راه را برای ایشان اختیار کرده، به ریاست می‌نشستم، و در میان لشکر، مثل پادشاه ساکن می‌بودم، و مثل کسی‌که نوحه‌گران را تسلی می‌بخشد. ۲۵ 25
Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha; ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya; na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.

< ایّوب 29 >