< اشعیا 39 >

در آن زمان مرودک بلدان بن بلدان پادشاه بابل مکتوبی و هدیه‌ای نزدحزقیا فرستاد زیرا شنیده بود که بیمار شده وصحت یافته است. ۱ 1
Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa ma nwe ahụ ike.
و حزقیا از ایشان مسرورشده، خانه خزاین خود را از نقره و طلا و عطریات و روغن معطر و تمام خانه اسلحه خویش و هرچه را که در خزاین او یافت می‌شد به ایشان نشان دادو در خانه‌اش و در تمامی مملکتش چیزی نبودکه حزقیا آن را به ایشان نشان نداد. ۲ 2
Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ nke ọma gosi ha ihe ndị dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ, ezigbo mmanụ oliv, ụlọ niile ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha.
پس اشعیانبی نزد حزقیا پادشاه آمده، وی را گفت: «این مردمان چه گفتند و نزد تو از کجا آمدند؟» حزقیاگفت: «از جای دور یعنی از بابل نزد من آمدند.» ۳ 3
Mgbe ahụ, Aịzaya onye amụma jekwuru eze Hezekaya jụọ ya sị, “Gịnị ka ndị ikom ndị ahụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịakwute gị?” Hezekaya zara sị, “Ọ bụ nʼala dị anya ka ha si bịakwute m, ha si Babilọn.”
او گفت: «در خانه تو چه دیدند؟» حزقیا گفت: «هرچه در خانه من است دیدند و چیزی درخزاین من نیست که به ایشان نشان ندادم.» ۴ 4
Onye amụma jụrụ, “Gịnị ka ha hụrụ nʼụlọ gị?” Hezekaya zara sị, “Ihe niile nke dị nʼụlọ m ka ha hụrụ. Ọ dịghị ihe niile dị nʼụlọakụ m nke m na-egosighị ha.”
پس اشعیا به حزقیا گفت: «کلام یهوه صبایوت را بشنو: ۵ 5
Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị Hezekaya, “Gee ntị nụrụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
اینک روزها می‌آید که هرچه در خانه تو است و آنچه پدرانت تا امروز ذخیره کرده‌اند به بابل برده خواهد شد. و خداوندمی گوید که چیزی از آنها باقی نخواهد ماند. ۶ 6
Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa Babilọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
وبعضی از پسرانت را که از تو پدید آیند و ایشان راتولید نمایی خواهند گرفت و در قصر پادشاه بابل خواجه‌سرا خواهند شد.» ۷ 7
A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị, ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze Babilọn.”
حزقیا به اشعیا گفت: «کلام خداوند که گفتی نیکو است و دیگر گفت: هرآینه در ایام من سلامتی و امان خواهد بود.» ۸ 8
Hezekaya zaghachiri, “Okwu Onyenwe anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Udo na nchekwa ga-adị nʼoge ndụ m.”

< اشعیا 39 >