< عبرانیان 4 >

پس بترسیم مبادا با آنکه وعده دخول درآرامی وی باقی می‌باشد، ظاهر شود که احدی از شما قاصر شده باشد. ۱ 1
Ya mere, ebe ọ bụ na nkwa nke ịba nʼizuike ya ka ghere oghe, ka anyị kpachapụ anya hụ na o nweghị onye ọbụla a ga-ahụta dịka onye etozughị ya.
زیرا که به ما نیز به مثال ایشان بشارت داده شد، لکن کلامی که شنیدند بدیشان نفع نبخشید، از اینرو که باشنوندگان به ایمان متحد نشدند. ۲ 2
Nʼihi na-eziela anyị oziọma ahụ, dị ka ezikwara ha: ma oziọma ahụ ha nụrụ abaraghị ha uru nʼihi na ha ejighị okwukwe nara ya.
زیرا ما که ایمان آوردیم، داخل آن آرامی می‌گردیم، چنانکه گفته است: «در خشم خود قسم خوردم که به آرامی من داخل نخواهند شد.» و حال آنکه اعمال او از آفرینش عالم به اتمام رسیده بود. ۳ 3
Ma anyị bụ ndị kweere na-abanye nʼebe izuike ahụ, dị ka Chineke si kwuo, “Aṅụrụ m iyi nʼiwe m, ‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’” O kwuru nke a nʼagbanyeghị na ọ rụchaala ọrụ ya site na ntọala ụwa.
ودر مقامی درباره روز هفتم گفت که «در روز هفتم خدا از جمیع اعمال خود آرامی گرفت.» ۴ 4
Nʼihi nʼotu ebe, o nweela ihe o kwuru banyere ụbọchị nke asaa site nʼokwu ndị a: “Chineke zuru ike site nʼọrụ ya niile, nʼụbọchị nke asaa.”
و بازدر این مقام که «به آرامی من داخل نخواهند شد.» ۵ 5
Ma nʼebe a kwa, e kwuru, “Ha agaghị abanye nʼebe izuike m ma ọlị.”
پس چون باقی است که بعضی داخل آن بشوند و آنانی که پیش بشارت یافتند، به‌سبب نافرمانی داخل نشدند، ۶ 6
Ebe ọ bụ na ohere dịịrị ụfọdụ mmadụ ịbanye nʼime ya, ma ndị ahụ buru ụzọ nata oziọma ahụ abanyeghị nʼihi nnupu isi.
باز روزی معین می‌فرماید چونکه به زبان داود بعد از مدت مدیدی «امروز» گفت، چنانکه پیش مذکور شدکه «امروز اگر آواز او را بشنوید، دل خود راسخت مسازید.» ۷ 7
O wepụtara ụbọchị ọzọ nke ọ kpọrọ Taa, o sitere nʼọnụ Devid kwuo okwu ahụ e kwurula ihe banyere nʼoge gara aga sị, “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu emela ka obi unu sie ike.”
زیرا اگر یوشع ایشان را آرامی داده بود، بعد از آن دیگر را ذکر نمی کرد. ۸ 8
Nʼihi na a sị na Joshua nyere ha ezumike, ọ gaghị ekwu banyere ụbọchị ọzọ.
پس برای قوم خدا آرامی سبت باقی می‌ماند. ۹ 9
Otu ụbọchị izuike fọdụrụ nye ndị nke Chineke.
زیراهر‌که داخل آرامی او شد، او نیز از اعمال خودبیارامید، چنانکه خدا از اعمال خویش. ۱۰ 10
Nʼihi na onye ọbụla banyere nʼezumike ya esitela nʼọrụ nke ya onwe ya nwee izuike dị ka Chineke siri banye nʼizuike nke ya.
پس جد و جهد بکنیم تا به آن آرامی داخل شویم، مبادا کسی در آن نافرمانی عبرت آمیز بیفتد. ۱۱ 11
Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nʼebe izuike ahụ, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọbụla nke na-agaghị aba nʼihi ịṅomi ekweghị ekwe ha.
زیرا کلام خدا زنده و مقتدر و برنده تر است ازهر شمشیر دودم و فرورونده تا جدا کند نفس وروح و مفاصل و مغز را و ممیز افکار و نیتهای قلب است، ۱۲ 12
Nʼihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọbụla. Ọ na-adụba ruo na-ikewa mkpụrụobi na mmụọ, ma rukwaa na ebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.
و هیچ خلقت از نظر او مخفی نیست بلکه همه‌چیز در چشمان او که کار ما باوی است، برهنه و منکشف می‌باشد. ۱۳ 13
Ọ dịghị ihe ọbụla nʼime ihe niile e kere eke pụrụ izo onwe ya site nʼebe Chineke nọ. Ihe niile ghere oghe, ma gbarakwa ọtọ nʼihu anya ya. Ọ bụ nʼihu ya ka anyị niile ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị niile.
پس چون رئیس کهنه عظیمی داریم که ازآسمانها درگذشته است یعنی عیسی، پسر خدا، اعتراف خود را محکم بداریم. ۱۴ 14
Ebe ọ bụ na anyị nwere onyeisi nchụaja dị ukwuu, onye nke gaferela nʼeluigwe, Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesienụ okwukwe anyị ike.
زیرا رئیس کهنه‌ای نداریم که نتواند همدرد ضعفهای مابشود، بلکه آزموده شده در هر چیز به مثال مابدون گناه. ۱۵ 15
Nʼihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara ya ọnwụnwa nʼụzọ niile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma, o meghị mmehie nʼụzọ ọbụla mgbe a nwara ya.
پس با دلیری نزدیک به تخت فیض بیاییم تا رحمت بیابیم و فیضی را حاصل کنیم که در وقت ضرورت (ما را) اعانت کند. ۱۶ 16
Ya mere, ka anyị bịaruo ocheeze amara ahụ nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nʼoge mkpa.

< عبرانیان 4 >