< پیدایش 33 >

پس یعقوب چشم خود را باز کرده، دید که اینک عیسو می‌آید و چهارصدنفر با او. آنگاه فرزندان خود را به لیه و راحیل و دوکنیز تقسیم کرد. ۱ 1
Jekọb lepụrụ anya nʼihu, hụ Ịsọ ka ọ na-abịa, ya na narị ndị ikom anọ ndị so ya. Nʼihi ya, o kesara ụmụntakịrị ndị ahụ, nʼetiti Lịa, na Rechel na ndị odibo nwanyị ya abụọ.
و کنیزان را با فرزندان ایشان پیش داشت و لیه را با فرزندانش در عقب ایشان، وراحیل و یوسف را آخر. ۲ 2
O mere ka ndị odibo nwanyị ya abụọ ahụ na ụmụ ha buru ụzọ, Lịa na ụmụ ya esoro nʼazụ, ebe Rechel na Josef nọ nʼazụ azụ.
و خود در‌پیش ایشان رفته، هفت مرتبه رو به زمین نهاد تا به برادر خودرسید. ۳ 3
Ma ya onwe ya buru ụzọ na-aga nʼihu ha niile, na-akpọ isiala nye Ịsọ ugboro asaa, tutu ruo mgbe ọ bịarutere nwanne ya nwoke nso.
اما عیسو دوان دوان به استقبال او آمد واو را در بر‌گرفته، به آغوش خود کشید، و او رابوسید و هر دو بگریستند. ۴ 4
Ma Ịsọ gbaara ọsọ bịakwute ya, makụọ ya, jikụọ ya aka nʼolu, sutu ya ọnụ. Ha abụọ kwara akwa.
و چشمان خود را بازکرده، زنان و فرزندان را بدید و گفت: «این همراهان تو کیستند؟» ۵ 5
Mgbe Ịsọ lelitere anya hụ ndị inyom ndị a na ụmụntakịrị ndị ahụ. Ọ sịrị, “Ndị ole bụ ndị a gị na ha so?” Jekọb sịrị, “Ha bụ ụmụ Chineke sitere nʼamara ya nye ohu gị.”
آنگاه کنیزان با فرزندان ایشان نزدیک شده، تعظیم کردند. ۶ 6
Mgbe ahụ, ndị odibo nwanyị abụọ na ụmụ ha rutere nso, kpọọ isiala.
و لیه با فرزندانش نزدیک شده، تعظیم کردند. پس یوسف و راحیل نزدیک شده، تعظیم کردند. ۷ 7
Lịa na ụmụ ya bịarutekwara kpọọ isiala, nʼikpeazụ Rechel na Josef bịara kpọọkwa isiala.
و او گفت: «از تمامی این گروهی که بدان برخوردم، چه مقصود داری؟» گفت: «تا در نظر آقای خود التفات یابم.» ۸ 8
Ịsọ sịrị, “Igwe ewu na atụrụ ndị a niile m zutere nʼụzọ, gịnị ka ọ pụtara?” Jekọb zara, “Ha bụ maka ịnata ihuọma nʼaka gị, onyenwe m.”
عیسوگفت: «ای برادرم مرا بسیار است، مال خود را نگاه دار.» ۹ 9
Ma Ịsọ sịrị, “Nwanne m nwoke, debere onwe gị ihe i nwere, nʼihi na enwere m akụ hie nne.”
یعقوب گفت: «نی، بلکه اگر در نظرت التفات یافته‌ام، پیشکش مرا از دستم قبول فرما، زیرا که روی تو را دیدم مثل دیدن روی خدا، ومرا منظور داشتی. ۱۰ 10
Jekọb sịrị, “E, biko, ọ bụrụ na m achọtala ihuọma nʼanya gị, nara m onyinye ndị a. Nʼihi na ịhụ gị anya dịka ilekwasị Chineke anya nʼihu, nke ka nke, otu a i ji ihu ọcha nabata m.
پس هدیه مرا که به حضورت آورده شد بپذیر، زیرا خدا به من احسان فرموده است و همه‌چیز دارم.» پس او را الحاح نمود تا پذیرفت. ۱۱ 11
Biko nara onyinye ndị ahụ e wetaara gị, nʼihi na Chineke emelara m amara. Enwekwara m ihe ga-ezuru m.” Jekọb kwagidere ya, ọ naara onyinye ndị ahụ.
گفت: «کوچ کرده، برویم و من همراه تو می‌آیم.» ۱۲ 12
Mgbe ahụ, Ịsọ sịrị, “Bilienụ ka anyị malite ije ịlaghachi. Aga m esonyere unu.”
گفت: «آقایم آگاه است که اطفال نازکند وگوسفندان و گاوان شیرده نیز با من است، و اگرآنها را یک روز برانند، تمامی گله می‌میرند؛ ۱۳ 13
Ma Jekọb sịrị ya, “Onyenwe m, ị maara na ụmụntakịrị ndị a adịghị ike, aga m ejikwa nwayọọ chịa ụmụ atụrụ ndị a na ehi ndị na-enye ụmụ ha ara. Ọ bụrụ na a chịa ha nʼike nʼime otu ụbọchị, ụmụ anụmanụ ndị a niile ga-anwụ.
پس آقایم پیشتر از بنده خود برود و من موافق قدم مواشی که دارم. و به حسب قدم اطفال، آهسته سفر می‌کنم، تا نزد آقای خود به سعیربرسم. ۱۴ 14
Ya mere, ka onyenwe m buru ohu ya ụzọ na-aga, ma ka m jiri nwayọọ nwayọọ na-abịa, dịka ike igwe anụ ndị a na ụmụaka ndị a si dị. Tutu ruo mgbe m ga-ezute onyenwe m na Sia.”
عیسو گفت: «پس بعضی از این کسانی را که با منند نزد تو می‌گذارم.» گفت: «چه لازم است، فقط در نظر آقای خود التفات بیابم.» ۱۵ 15
Ịsọ sịrị, “Ọ bụrụ otu a, ka m hapụrụ gị ụfọdụ ndị a mụ na ha so.” Ma Jekọb sịrị, “Nʼihi gịnị kwanụ? Ka m hụta naanị ihuọma nʼanya onyenwe m.”
در همان روز عیسو راه خود را پیش گرفته، به سعیرمراجعت کرد. ۱۶ 16
Ịsọ laghachikwara azụ na Sia nʼotu ụbọchị ahụ.
و اما یعقوب به سکوت سفرکرد و خانه‌ای برای خود بنا نمود و برای مواشی خود سایبانها ساخت. از این سبب آن موضع به «سکوت» نامیده شد. ۱۷ 17
Ma Jekọb na ezinaụlọ ya jere Sukọt, ebe o wuuru onwe ya ụlọ obibi, wuokwara anụ ụlọ ya ụlọ obibi ha. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ Sukọt.
پس چون یعقوب از فدان ارام مراجعت کرد، به سلامتی به شهر شکیم، در زمین کنعان آمد، و در مقابل شهر فرود آمد. ۱۸ 18
Mgbe Jekọb si Padan Aram lọghachi, o rutere obodo Shekem nke dị nʼala Kenan nʼudo. O mara ụlọ ikwu ya nʼihu obodo ahụ.
و آن قطعه زمینی را که خیمه خود را در آن زده بود ازبنی حمور، پدر شکیم، به صد قسیط خرید. ۱۹ 19
Ọ zụrụ ala ebe o mara ụlọ ikwu ya nʼaka ụmụ Hamọ, nna Shekem, ọ kwụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha maka ala ahụ.
ومذبحی در آنجا بنا نمود و آن را ایل الوهی اسرائیل نامید. ۲۰ 20
Nʼebe ahụ, o wuru ebe ịchụ aja, kpọọ aha ya El Elohe Izrel.

< پیدایش 33 >