< حزقیال 7 >

و کلام خداوند بر من نازل شده، گفت: ۱ 1
Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
«وتو‌ای پسر انسان (بگو): خداوند یهوه به زمین اسرائیل چنین می‌گوید: انتهایی بر چهارگوشه زمین انتها رسیده است. ۲ 2
“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ala Izrel: “‘Ọgwụgwụ! Ọgwụgwụ abịakwasịla akụkụ anọ nke ala ahụ.
الان انتها بر تورسیده است و من خشم خود را بر تو واردآورده‌ام و بر وفق راههایت ترا داوری نموده، تمامی رجاساتت را بر تو خواهم نهاد. ۳ 3
Ugbu a ka ọgwụgwụ bịakwasịrị unu. Lee, aga m eme ka iwe m bịakwasị unu; aga m ekpe unu ikpe dịka omume unu si dị, aga m ata unu ahụhụ maka arụ unu niile.
و چشم من برتو شفقت نخواهد کرد و رحمت نخواهم فرمود بلکه راههای تو را بر تو خواهم نهاد ورجاسات تو در میانت خواهد بود. پس خواهی دانست که من یهوه هستم.» ۴ 4
Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ, agaghị m emekwara gị ebere, kama aga m ata unu ahụhụ maka omume unu na arụ niile dị nʼetiti unu. “‘Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’
خداوند یهوه چنین می‌گوید: «بلا هان بلای واحد می‌آید! ۵ 5
“Nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, “‘Oke mbibi, oke mbibi nke a na-anụbeghị ụdị ya mbụ. Lee, ka ọ na-abịa.
انتهایی می‌آید، انتهایی می‌آید وبه ضد تو بیدار شده است. هان می‌آید. ۶ 6
Ọgwụgwụ abịala! Ọgwụgwụ abịala! Ọ kpalitela onwe ya imegide unu. Lee, ka ọ na-abịa!
‌ای ساکن زمین اجل تو بر تو می‌آید. وقت معین می‌آید و آن روز نزدیک است. روز هنگامه خواهد شد و نه روز آواز شادمانی بر کوهها. ۷ 7
Oke nsogbu abịakwasịla gị, gị onwe gị bi nʼala ahụ. Oge ahụ abịala! Ụbọchị ahụ dịkwa nso! Ọgbaaghara dị ebe niile, ọ bụghị ọṅụ dị nʼelu ugwu niile.
الان عنقریب غضب خود را بر تو خواهم ریخت و خشم خویش را بر تو به اتمام رسانیده، تو را موافق راههایت داوری خواهم نمود و جمیع رجاساتت را بر تو خواهم نهاد. ۸ 8
Ejikerela m ịwụkwasị gị ọnụma m nʼahụ mee ka oke iwe m zuo gị ahụ niile. Aga m ekpe gị ikpe dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ gị niile.
و چشم من شفقت نخواهدکرد و رحمت نخواهم فرمود، بلکه مکافات راههایت را به تو خواهم رسانید و رجاسات تو درمیانت خواهد بود و خواهید دانست که زننده تو من یهوه هستم. ۹ 9
Agaghị m emere gị ebere, agakwaghị m ahapụ ịta gị ahụhụ. Aga m akwụghachi gị dịka omume gị si dị, kwụghachikwa gị nʼihi ibi ndụ rụrụ arụ niile nke dị nʼetiti unu. “‘Mgbe ahụ, ị ga-amata na ọ bụ mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, na-eti unu ihe ndị a.
اینک آنروز هان می‌آید! اجل تو بیرون آمده و عصا شکوفه آورده و تکبر، گل کرده است. ۱۰ 10
“‘Lee, ụbọchị ahụ! Lee, ka ọ na-abịa! Oke nsogbu enupụtala, mkpanaka agbala okoko nganga amaala ifuru!
ظلم عصای شرارت گشته است. ازایشان و از جمعیت ایشان و از ازدحام ایشان چیزی باقی نیست و در میان ایشان حشمتی نمانده است. ۱۱ 11
Ihe ike ebilitala, mkpọrọ eji ata ndị ajọ omume ahụhụ. O nweghị onye ọbụla nʼime ha nke ga-afọdụ, maọbụ igwe mmadụ maọbụ ụba ha, o nweghịkwa nke bara uru.
وقت می‌آید و آنروز نزدیک است. پس مشتری شادی نکند و فروشنده ماتم نگیرد، زیرا که خشم بر تمامی جمعیت ایشان قرار گرفته است. ۱۲ 12
Mgbe ahụ abịala! Ụbọchị ahụ abịakwala nso. Ka onye na-azụ ahịa ghara ịṅụrị ọṅụ ka onye na-ere ere ghara iru ụjụ, nʼihi na ọnụma ahụ dịrị igwe mmadụ niile.
زیرا که فروشندگان اگر‌چه در میان زندگان زنده مانند، به آنچه فروخته باشندنخواهند برگشت، چونکه غضب بر تمامی جمعیت ایشان قرار گرفته است. ایشان نخواهندبرگشت و هیچکس به گناه خویش زندگی خود راتقویت نخواهد داد. ۱۳ 13
Onye rere ahịa agaghị enwetaghachi ngwa ahịa nke erere ere ọ bụladị dịka onye rere na onye zụrụ na-adị ndụ. Nʼihi na ọhụ nke a gbasara igwe mmadụ niile bụ nke a na-apụghị ịgbanwe. Nʼihi mmehie ha niile, o nweghị onye nʼime ha nke pụrụ ichebe ndụ ya.
کرنا را نواخته و همه‌چیزرا مهیا ساخته‌اند، اما کسی به جنگ نمی رود. زیراکه غضب من بر تمامی جمعیت ایشان قرار گرفته است. ۱۴ 14
“‘Ha afụọla opi ike, ha edoziela ihe niile ma o nweghị onye ga-aga ibu agha nʼihi na ọnụma m dịkwasịrị igwe mmadụ ahụ niile.
شمشیر در بیرون است و وبا و قحط دراندرون. آنکه در صحرا است به شمشیر می‌میرد وآنکه در شهر است قحط و وبا او را هلاک می‌سازد. ۱۵ 15
Mma agha dị nʼezi; ajọ ọrịa na-efe efe na ụnwụ dịkwa nʼime. Onye nọ nʼọhịa ga-anwụ site na mma agha, ndị nọ nʼime obodo ukwu ka ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-eripịa.
و رستگاران ایشان فرار می‌کنند ومثل فاخته های دره‌ها بر کوهها می‌باشند. و هرکدام از ایشان به‌سبب گناه خود ناله می‌کنند. ۱۶ 16
Ma ndị gbapụrụ agbapụ ga-agbaga nọrọ nʼugwu. Ọ bụ dịka nduru nke ndagwurugwu, ha niile ga-asụ ude akwa, onye ọbụla nʼihi mmehie ha.
همه دستها سست شده و جمیع زانوها مثل آب بیتاب گردیده است. ۱۷ 17
Aka niile ga-akụda, ikpere niile ka a ga-eji amịrị nyụdee.
و پلاس در برمی کنند و وحشت ایشان را می‌پوشاند و بر همه چهره‌ها خجلت و بر جمیع سرها گری می‌باشد. ۱۸ 18
Ha ga-eyikwasị akwa mkpe, oke ihe egwu ga-ekpuchi ha. Ọ bụkwa ihu niile ka ihere ga-ekpuchi, a ga-akpụchakwa isi niile.
نقره خود را در کوچه‌ها می‌ریزند و طلای ایشان مثل چیز نجس می‌باشد. نقره و طلای ایشان در روز غضب خداوند ایشان را نتواندرهانید. جانهای خود را سیر نمی کنند و بطنهای خویش را پر نمی سازند زیرا گناه ایشان سنگ مصادم آنها شده است. ۱۹ 19
“‘Ha ga-etufu ọlaọcha ha niile nʼokporoụzọ niile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe na-adịghị ọcha. Ọlaọcha na ọlaedo ha agaghị enwe ike napụta ha nʼụbọchị nrubiga oke nke oke iwe Onyenwe anyị. Ha agaghị eme ka agụ gharakwa ịgụ ha, maọbụ mee ka afọ ju ha, nʼihi na ọ bụụrụ ha ihe ịsọ ngọngọ nke ịdaba na mmehie.
«و او زیبایی زینت خود را در کبریایی قرارداده بود، اما ایشان بتهای مکروهات و رجاسات خویش را در آن ساختند. بنابراین آن را برای ایشان مثل چیز نجس خواهم گردانید. ۲۰ 20
Ihe ịchọ mma ha ghọọrọ ha ihe ịkpa nganga, ha jikwa ya mepụta arụsị rụrụ arụ ha dị iche iche. Ha ji ya metakwa oyiyi ihe arụ niile jọgburu onwe ya; ya mere, aga m eme ka ọ bụụrụ ha ihe rụrụ arụ.
و آن رابه‌دست غریبان به تاراج و به شریران جهان به غارت خواهم داد و آن را بی‌عصمت خواهندساخت. ۲۱ 21
Aga m ewere akụnụba ha nye ndị mba ọzọ dịka ihe apụnatara nʼagha, nyekwa ya ndị ajọ omume nke ụwa dịka ihe nkwata ndị ga-emerụ ya.
و روی خود را از ایشان خواهم برگردانید و مکان مستور مرا بی‌عصمت خواهندنمود و ظالمان داخل آن شده، آن را بی‌عصمت خواهند ساخت. ۲۲ 22
Aga m esite nʼebe ha nọ wezuga ihu m ndị ohi ga-emerụkwa ebe ahụ m kpọrọ ihe dị oke ọnụahịa. Ha ga-abata nʼime ya merụọkwa ya.
زنجیر را بساز، زیرا که زمین از جرمهای خونریزی پر است و شهر از ظلم مملو. ۲۳ 23
“‘Kwadoonụ ụdọ igwe. Nʼihi na ala ha jupụtara nʼigbu ọchụ na ịwụsa ọbara, obodo ahụ jupụtara nʼihe ike.
و اشرار امت‌ها را خواهم آورد و درخانه های ایشان تصرف خواهند نمود و تکبرزورآوران را زایل خواهم ساخت و آنهامکان های مقدس ایشان را بی‌عصمت خواهندنمود. ۲۴ 24
Aga m akpọta mba ndị ahụ jọgburu onwe ha ka ha bịa nwetara onwe ha ụlọ ha niile. Aga m eme ka mpako nke ndị bụ dike kwụsị, meekwa ka ebe nsọ ha niile bụrụ ebe e merụrụ emerụ.
هلاکت می‌آید و سلامتی را خواهندطلبید، اما یافت نخواهد شد. ۲۵ 25
Mgbe ihe mmekpa ahụ bịara, ha ga-achọ udo ma o nweghị nke ga-adị.
مصیبت برمصیبت می‌آید و آوازه بر آوازه مسموع می‌شود. رویا از نبی می‌طلبند، اما شریعت از کاهنان ومشورت از مشایخ نابود شده است. ۲۶ 26
Mbibi ga-esochi mbibi, akụkọ na-enweghị isi ga-esochikwa akụkọ na-enweghị isi. Ha ga-agagharị na-achọ ọhụ site nʼaka onye amụma, ntụziaka onye nchụaja ga-akwụsị, ndụmọdụ nke ndị okenye agaghị adịkwa.
پادشاه ماتم می‌گیرد و رئیس به حیرت ملبس می‌شود ودستهای اهل زمین می‌لرزد. و موافق راههای ایشان با ایشان عمل خواهم نمود و بر وفق استحقاق ایشان ایشان را داوری خواهم نمود. پس خواهند دانست که من یهوه هستم؟ ۲۷ 27
Eze ga-eru ụjụ, nwa eze ga-eyikwasị ịda mba nke obi dịka uwe, aka ga-ama ndị ala ahụ niile jijiji nʼihi egwu. Aga m emeso ha dịka omume ha si dị, aga m ekpekwa ha ikpe dịka ihe ha kwenyeere si dị. “‘Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”

< حزقیال 7 >