< حزقیال 45 >

«و چون زمین را به جهت ملکیت به قرعه تقسیم نمایید، حصه مقدس را که طولش بیست و پنج هزار (نی ) و عرضش ده هزار(نی ) باشد هدیه‌ای برای خداوند بگذرانید و این به تمامی حدودش از هر طرف مقدس خواهدبود. ۱ 1
“‘Mgbe unu ga-eke ala ahụ dịka ihe nketa, unu ga-ebu ụzọ nye Onyenwe anyị otu oke nʼime ya ka ọ bụrụ oke dị nsọ nke ala ahụ. Ogologo ya ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita iri na otu. Ihe dị nsọ ka ala ahụ niile ga-abụ gbaa gburugburu.
و از این پانصد در پانصد (نی ) از هر طرف مربع برای قدس خواهد بود و نواحی آن از هرطرفش پنجاه ذراع. ۲ 2
Site nʼala, otu akụkụ dị narị mita abụọ na iri itoolu na otu, na iri sentimita asaa na ise, ga-abụ maka ebe nsọ. A ga-ahapụ ala dị iri mita abụọ na itoolu gburugburu ya.
و از این پیمایش طول بیست و پنج هزار و عرض ده هزار (نی ) خواهی پیمود تا در آن جای مقدس قدس‌الاقداس باشد. ۳ 3
Site nʼoke ebe ahụ dị nsọ, tụpụta oke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, obosara ya kilomita ise na ọkara. Ọ bụ nʼime ya ka ebe nsọ, ya bụ Ebe ahụ Kachasị Nsọ ga-adị.
و این برای کاهنانی که خادمان مقدس باشند و به جهت خدمت خداوند نزدیک می‌آیند، حصه مقدس از زمین خواهد بود تا جای خانه‌ها به جهت ایشان و جای مقدس به جهت قدس باشد. ۴ 4
Ọ ga-abụ oke ala ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼebe nsọ, na ndị na-abịa nso ije ozi nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-abụkwa ebe ụlọ obibi ha ga-adị, bụrụkwa ebe dị nsọ maka ebe nsọ ahụ.
و طول بیست و پنج هزار و عرض ده هزار (نی )به جهت لاویانی که خادمان خانه باشند خواهدبود تا ملک ایشان برای بیست خانه باشد. ۵ 5
Ala ọzọ dị ya nʼakụkụ, nke ga-adị kilomita iri na atọ nʼogologo, kilomita ise na ọkara nʼobosara ya, ga-abụ ebe obibi ndị Livayị, ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwuu ahụ.
و ملک شهر را که عرضش پنجهزار و طولش بیست وپنجهزار (نی ) باشد موازی آن هدیه مقدس قرار خواهید داد و این از آن تمامی خاندان اسرائیل خواهد بود. ۶ 6
“‘Nʼakụkụ obodo nsọ ka a ga-ekewapụta ala nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dịkwa kilomita abụọ na ọkara, nke a ga-abụ nke ndị Izrel.
و از اینطرف و از آنطرف هدیه مقدس و ملک شهر مقابل هدیه مقدس و مقابل ملک شهر از جانب غربی به سمت مغرب و ازجانب شرقی به سمت مشرق حصه رئیس خواهدبود و طولش موازی یکی از قسمت‌ها از حدمغرب تا حد مشرق خواهد بود. ۷ 7
“‘A ga-ewepụta ala pụrụ iche maka nwa eze. Ala a ga-adị nʼakụkụ abụọ nke ala nsọ ahụ, na obodo ahụ. Ala a ga-agbatịrị site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ebe oke ya dị ruo nʼosimiri Mediterenịa. Ọ ga-esitekwa nʼoke ala ya nʼọwụwa anyanwụ gbatịrị ruo nʼebe ebo Izrel nwere ala ha. Nʼụzọ dị otu a, ala a ga-aha ka ala ebo Izrel ketara.
و این در آن زمین در اسرائیل ملک او خواهد بود تا روسای من بر قوم من دیگر ستم ننمایند و ایشان زمین را به خاندان اسرائیل بر‌حسب اسباط ایشان خواهندداد. ۸ 8
Ala a ga-abụrụ ya ihe nketa nʼIzrel. Ndịisi m agaghị emegbu ndị m ọzọ, ma ha ga-ahapụ ndị Izrel ka ha keta ala ndị a dịka ebo niile ha si dị.
«خداوند یهوه چنین می‌گوید: ای سروران اسرائیل باز ایستید و جور و ستم را دور کنید وانصاف و عدالت را بجا آورید و ظلم خود را ازقوم من رفع نمایید. قول خداوند یهوه این است: ۹ 9
“‘Nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: O zuolara unu, unu ụmụ ndị eze Izrel. Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe ha nwere nʼike, kpeenụ ikpe ziri ezi na-emekwa ihe kwesiri ekwesi. Kwụsịnụ ịchụpụ ndị m site nʼihe ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
میزان راست و ایفای راست و بت راست برای شما باشد ۱۰ 10
Ka ihe ọtụtụ unu ji ere ahịa unu bụrụ ezigbo efa na ezigbo baf nke a na-ejighị aghụghọ kpụọ.
و ایفا و بت یکمقدار باشد به نوعی که بت به عشر حومر و ایفا به عشر حومر مساوی باشد. مقدار آنها بر‌حسب حومر باشد. ۱۱ 11
Ka ihe ọtụtụ homa bụrụ ihe unu ga-eji na-atụ ihe niile, ma mmanụ, ma ọka. Ihe ọtụtụ ndị ọzọ unu ga-enwe ga-abụ efa, nke bụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka ọka. Nke ọzọ bụ baf, nke bụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka mmanụ.
و مثقال بیست جیره باشد. و منای شما بیست مثقال وبیست و پنج مثقال و پانزده مثقال باشد. ۱۲ 12
Ihe ọtụtụ a ga-eji mata ịdị arọ nke ihe ọbụla ga-abụ shekel. Ihe a ga-eji gbanwere shekel a bụ iri gera abụọ naanị. Iri shekel isii ka a ga-ejikwa gbanwere otu mina.
«و هدیه‌ای که بگذرانید این است: یک سدس ایفا از هر حومر گندم و یک سدس ایفا ازهر حومر جو بدهید. ۱۳ 13
“‘Nke a bụ onyinye pụrụ iche unu ga-enye: otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa, site nʼotu homa nke ọka wiiti unu. Unu ga-enyekwa otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa site nʼotu homa ọka balị unu.
و قسمت معین روغن برحسب بت روغن یک عشر بت از هر کر یا حومرده بت باشد زیرا که ده بت یک حومر می‌باشد. ۱۴ 14
Dịka e nyere ya nʼiwu, unu ga-eji ihe ọtụtụ baf, weta mmanụ oliv bụ otu ụzọ nʼime ụzọ iri site nʼotu kọ ọbụla (kọ na-erita baf iri, nʼihi na baf iri, bụ ọtụtụ otu homa).
و یک گوسفند از دویست گوسفند از مرتع های سیراب اسرائیل برای هدیه آردی و قربانی سوختنی و ذبایح سلامتی بدهند تا برای ایشان کفاره بشود. قول خداوند یهوه این است. ۱۵ 15
Ọzọkwa, otu atụrụ nke sitere nʼigwe atụrụ dị narị atụrụ abụọ, nke si nʼebe ịta nri nke Izrel a gbara mmiri nke ọma ka unu ga-eweta. A ga-eji ndị a chụọ aja mkpụrụ ọka, na aja nsure ọkụ, na aja udo, maka ikpuchiri ndị wetara ha mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.
وتمامی قوم زمین این هدیه را برای رئیس دراسرائیل بدهند. ۱۶ 16
Ndị niile nke nʼala ahụ ga-eso nwa eze Izrel bute onyinye ndị a.
و رئیس قربانی های سوختنی و هدایای آردی و هدایای ریختنی را در عیدها وهلال‌ها و سبت‌ها و همه مواسم خاندان اسرائیل بدهد واو قربانی گناه و هدیه آردی و قربانی سوختنی و ذبایح سلامتی را به جهت کفاره برای خاندان اسرائیل بگذراند.» ۱۷ 17
Nwa eze ahụ ka ọ dịrị iweta ihe eji achụ aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka, aja ihe ọṅụṅụ niile, na nke Ọnwa ọhụrụ nakwa nke ụbọchị izuike niile, nʼoge mmemme niile nke ndị Izrel. Ọ ga-ewetakwa ihe eji achụ aja mmehie, aja mkpụrụ ọka, aja nsure ọkụ, aja udo maka ikpuchiri ụmụ Izrel mmehie ha.
خداوند یهوه چنین می‌گوید: «در غره ماه اول، گاوی جوان بی‌عیب گرفته، مقدس را طاهرخواهی نمود. ۱۸ 18
“‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ ọbụla, unu ga-ewere nwa oke ehi nke na-enweghị ntụpọ, chụọ aja ido ụlọnsọ m nsọ.
و کاهن قدری از خون قربانی گناه گرفته، آن را بر چهار چوب خانه و بر چهارگوشه خروج مذبح و بر چهار چوب دروازه صحن اندرونی خواهد پاشید. ۱۹ 19
Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara nke aja mmehie ahụ tee ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ m, na nʼakụkụ anọ nke ọnụ ebe ịchụ aja, na nʼahụ ibo nke ọnụ ụzọ ogige ime.
و همچنین درروز هفتم ماه برای هر‌که سهو یا غفلت خطا ورزدخواهی کرد و شما برای خانه کفاره خواهیدنمود. ۲۰ 20
Unu ga-emekwa otu ihe ahụ nʼabalị asaa nke ọnwa ahụ nʼihi onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maka ikpuchi mmehie metụtara ụlọnsọ m.
و در روز چهاردهم ماه اول برای شماهفت روز عید فصح خواهد بود که در آنها نان فطیر خورده شود. ۲۱ 21
“‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka unu ga-edebe Mmemme Ngabiga. Ọ ga-abụ mmemme abalị asaa. Nʼụbọchị ndị a, naanị achịcha nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ka unu ga-eri.
و در آن روز رئیس، گاوقربانی گناه را برای خود و برای تمامی اهل زمین بگذراند. ۲۲ 22
Nʼụbọchị ahụ, onyeisi ga-eweta otu nwa oke ehi maka aja mmehie nke onwe ya, na maka mmehie mmadụ niile nke ala ahụ.
و در هفت روز عید، یعنی در هر روزاز آن هفت روز، هفت گاو و هفت قوچ بی‌عیب به جهت قربانی سوختنی برای خداوند و هر روزیک بز نر به جهت قربانی گناه بگذارند. ۲۳ 23
Nʼụbọchị asaa nke mmemme ahụ, kwa ụbọchị, ọ ga-eweta oke ehi asaa na ebule asaa, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, dịka ihe ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ ga-enyekwa nwa mkpi kwa ụbọchị maka aja mmehie.
و هدیه آردیش را یک ایفا برای هر گاو و یک ایفا برای هرقوچ و یک هین روغن برای هر ایفا بگذراند. ۲۴ 24
Ọ ga-ewetakwa nʼihi onyinye ịnata ihuọma, narị lita ọka anọ na iri itoolu, nke bụ otu ọtụtụ otu oke ehi, otu ọtụtụ otu ebule. Tinyere lita mmanụ oliv atọ na ụma asatọ. Lita mmanụ atọ na ụma asatọ dịkwara otu efaf ọka.
واز روز پانزدهم ماه هفتم، در وقت عید موافق اینهایعنی موافق قربانی گناه و قربانی سوختنی و هدیه آردی و روغن تا هفت روز خواهد گذرانید.» ۲۵ 25
“‘Nʼoge mmemme ụbọchị asaa ahụ, nke ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, ọ ga-ewetakwa ihe a ga-eji chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na mmanụ.

< حزقیال 45 >