< حزقیال 10 >

پس نگریستم و اینک بر فلکی که بالای سر کروبیان بود چیزی مثل سنگ یاقوت کبود و مثل نمایش شبیه تخت بر زبر آنهاظاهر شد. ۱ 1
Mgbe ahụ, elere m anya hụ ocheeze ọma e ji nkume safaia wuo ka ọ pụtara ihe na mbara eluigwe, nʼelu ebe ahụ isi cherubim ndị ahụ dị.
و آن مرد را که به کتان ملبس بودخطاب کرده گفت: «در میان چرخها در زیرکروبیان برو و دستهای خود را از اخگرهای آتشی که در میان کروبیان است پر کن و بر شهربپاش.» و او در نظر من داخل شد. ۲ 2
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha, “Baa nʼetiti ụkwụ ụgbọala ahụ dị nʼokpuru cherubim ndị ahụ. Site nʼetiti cherubim ndị ahụ kpojuo icheku ọkụ nke na-ere ere nʼaka gị, fesachaa ha nʼime obodo ahụ niile.” Ọ bara nʼime ka m nʼele ya anya.
و چون آن مردداخل شد، کروبیان بطرف راست خانه ایستاده بودند و ابر، صحن اندرونی را پر کرد. ۳ 3
Cherubim ndị ahụ na-eguzo nʼakụkụ ndịda nke ụlọnsọ ahụ mgbe nwoke ahụ banyere. Igwe ojii jupụtakwara nʼogige ime ụlọnsọ ahụ.
و جلال خداوند از روی کروبیان به آستانه خانه برآمد وخانه از ابر پر شد و صحن از فروغ جلال خداوندمملو گشت. ۴ 4
Mgbe ahụ, ebube Onyenwe anyị sitere nʼelu cherubim bilie, bịa guzo nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Ụlọnsọ ahụ jupụtakwara nʼigwe ojii, ihe nke ebube Onyenwe anyị jupụtakwara nʼogige ụlọnsọ ahụ.
و صدای بالهای کروبیان تا به صحن بیرونی مثل آواز خدای قادر مطلق حینی که تکلم می کند، مسموع شد. ۵ 5
Ụzụ nke nku cherubim ndị ahụ na-eme dịkwa ka olu Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. A na-anụkwa ụzụ nku ndị ahụ nʼogige ụlọnsọ ahụ dị nʼezi.
و چون آن مرد را که ملبس به کتان بود امرفرموده، گفت که «آتش را از میان چرخها از میان کروبیان بردار.» آنگاه داخل شده، نزد چرخهاایستاد. ۶ 6
Mgbe Onyenwe anyị nyere nwoke ahụ yi uwe ezi akwa ọcha iwu, sị, “Gaa nʼetiti cherubim ahụ gụta ụfọdụ icheku ọkụ dị nʼetiti wịịlu ụgbọala ahụ,” nwoke ahụ banyere guzo nʼakụkụ otu wịịlu ahụ.
و یکی از کروبیان دست خود را از میان کروبیان به آتشی که در میان کروبیان بود درازکرده، آن را برداشت و به‌دست آن مردی که به کتان، ملبس بود نهاد و او آن را گرفته، بیرون رفت. ۷ 7
Mgbe ahụ, otu nʼime ndị cherubim ahụ setịpụrụ aka ya nʼebe ọkụ ahụ dị nʼetiti ha. Ọ gụtara ụfọdụ icheku ọkụ tinye nʼaka nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha onye weere ya pụọ.
و در کروبیان شبیه صورت دست انسان زیربالهای ایشان ظاهر شد. ۸ 8
Nʼokpuru nku ndị cherubim ahụ ka a na-ahụta ihe yiri aka mmadụ.
و نگریستم و اینک چهار چرخ به پهلوی کروبیان یعنی یک چرخ به پهلوی یک کروبی وچرخ دیگر به پهلوی کروبی دیگر ظاهر شد. ونمایش چرخها مثل صورت سنگ زبرجد بود. ۹ 9
Elere m anya hụ wịịlu anọ, nke dị nʼakụkụ cherubim ndị ahụ. Cherubim ọbụla nwere otu wịịlu nʼakụkụ ya. Wịịlu ndị a niile na-egbu maramara dịka nkume beril.
و اما نمایش ایشان چنین بود. آن چهار را یک شباهت بود که گویا چرخ در میان چرخ باشد. ۱۰ 10
Wịịlu anọ ndị ahụ yiri onwe ha. Nke ọbụla nʼime ha dịka wịịlu a rụnyere nʼetiti wịịlu ọzọ.
وچون آنها می‌رفت بر چهار جانب خود می‌رفت وحینی که می‌رفت به هیچ سو میل نمی کرد، بلکه به‌جایی که سر به آن متوجه می‌شد از عقب آن می‌رفت. و چون می‌رفت به هیچ سو میل نمی کرد. ۱۱ 11
Mgbe ha na-aga, ha niile na-eche ihu nʼakụkụ ọbụla nke cherubim ndị ahụ chere ihu. Wịịlu ndị a adịghị echigharị echigharị mgbe cherubim ndị a na-agagharị. Kama ebe isi cherubim ndị ahụ chere ihu ka wịịlu ndị ahụ na-aga. Ha adịghị elekwa anya nʼazụ dịka ha na-aga.
و تمامی بدن و پشتها و دستها وبالهای ایشان و چرخها یعنی چرخهایی که آن چهار داشتند از هر طرف پر از چشمها بود. ۱۲ 12
Gburugburu ha, nʼanụ ahụ ha niile, ma nʼazụ ha, ma nʼaka ha, ma na nku ha, ma na wịịlu ndị ahụ, ihe jupụtara ha bụ anya. Anya dị nʼakụkụ ha niile.
وبه سمع من به آن چرخها ندا در‌دادند که «ای چرخها!» ۱۳ 13
Aha m nụrụ a na-akpọ wịịlu ndị ahụ bụ, Ọgba gburugburu.
و هر یک را چهار رو بود. روی اول روی کروبی بود و روی دوم روی انسان و سوم روی شیر و چهارم روی عقاب. ۱۴ 14
Nke ọbụla nʼime cherubim ndị a nwere ihu anọ. Ihu nke mbụ dịka ihu cherub. Nke abụọ dịka ihu mmadụ; nke atọ dịka ihu ọdụm, ma nke anọ dịka ihu ugo.
پس کروبیان صعود کردند. این همان حیوان است که نزد نهر خابور دیده بودم. ۱۵ 15
Mgbe ahụ, Cherubim ndị ahụ buliri onwe ha elu. Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ nke m hụrụ na mbụ nʼakụkụ osimiri Keba.
و چون کروبیان می‌رفتند، چرخها به پهلوی ایشان می‌رفت و چون کروبیان بالهای خود را برافراشته، از زمین صعود می‌کردند، چرخها نیز از پهلوی ایشان برنمی گشت. ۱۶ 16
Mgbe cherubim ndị ahụ na-aga, wịịlu ndị ahụ dị nʼakụkụ ha na-eso ha na-aga. Mgbe ha na-achili nku ha i si nʼala bulie onwe ha elu, wịịlu ha na-anọgidekwa nʼakụkụ ha.
چون ایشان می‌ایستادندآنها می‌ایستاد و چون ایشان صعود می‌نمودند، آنها با ایشان صعود می‌نمود، زیرا که روح حیوان در آنها بود. ۱۷ 17
Mgbe cherubim ndị ahụ guzoro nʼotu ebe, wịịlu ahụ na-eguzokwa. Mgbe ha na-ebuli onwe ha elu, wịịlu ndị ahụ na-ebulikwa onwe ha elu, nʼihi na mmụọ nke ihe ahụ dị ndụ dị nʼime ha.
و جلال خداوند از بالای آستانه خانه بیرون آمد و بر زبر کروبیان قرار گرفت. ۱۸ 18
Emesịa, ebube nke Onyenwe anyị sitere na mbata ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ pụọ, gaa guzo nʼelu cherubim ndị ahụ.
وچون کروبیان بیرون رفتند بالهای خود رابرافراشته، به نظر من از زمین صعود نمودند. وچرخها پیش روی ایشان بود و نزد دهنه دروازه شرقی خانه خداوند ایستادند. و جلال خدای اسرائیل از طرف بالا بر ایشان قرار گرفت. ۱۹ 19
Mgbe m nọ na-ele anya, cherubim ahụ gbasapụrụ nku ha felie, wịịlu ha niile dịkwa nʼakụkụ ha. Ha guzoro na mbata ọnụ ụzọ nke dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọ Onyenwe anyị, na ebube nke Chineke nke Izrel dịkwa nʼelu ha.
این همان حیوان است که زیر خدای اسرائیل نزد نهرخابور دیده بودم، پس فهمیدم که اینان کروبیانند. ۲۰ 20
Ndị a bụ ihe ndị ahụ dị ndụ, nke m hụrụ nʼokpuru Chineke Izrel nʼakụkụ osimiri Keba, amatara m na ha bụ cherubim.
هر یک را چهار روی و هر یک را چهار بال بودو زیر بالهای ایشان شبیه دستهای انسان بود. ۲۱ 21
Nke ọbụla nʼime ha nwere ihu anọ na nku anọ, na ihe yiri aka mmadụ nʼokpuru nku ha.
واما شبیه رویهای ایشان چنین بود. همان رویها بودکه نزد نهر خابور دیده بودم. هم نمایش ایشان وهم خود ایشان (چنان بودند) و هر یک به راه مستقیم می‌رفت. ۲۲ 22
Ihu ha yikwara ihu ihe ndị ahụ m hụrụ nʼakụkụ osimiri Keba. Nke ọbụla na-agakwa ije nʼihu ihu na-eleghị anya nʼazụ.

< حزقیال 10 >