< ヨブ 記 12 >

1 そこでヨブは答えて言った、
Mgbe ahụ, Job zara:
2 「まことに、あなたがたのみ、人である、知恵はあなたがたと共に死ぬであろう。
“Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe, unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.
3 しかしわたしも、あなたがたと同様に悟りをもつ。わたしはあなたがたに劣らない。だれがこのような事を知らないだろうか。
Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu; abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ. Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?
4 わたしは神に呼ばわって、聞かれた者であるのに、その友の物笑いとなっている。正しく全き人は物笑いとなる。
“Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ, nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za, onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!
5 安らかな者の思いには、不幸な者に対する侮りがあって、足のすべる者を待っている。
Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.
6 かすめ奪う者の天幕は栄え、神を怒らす者は安らかである。自分の手に神を携えている者も同様だ。
Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ; ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo, bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.
7 しかし獣に問うてみよ、それはあなたに教える。空の鳥に問うてみよ、それはあなたに告げる。
“Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị, maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.
8 あるいは地の草や木に問うてみよ、彼らはあなたに教える。海の魚もまたあなたに示す。
Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị, maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.
9 これらすべてのもののうち、いずれか主の手がこれをなしたことを知らぬ者があろうか。
Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?
10 すべての生き物の命、およびすべての人の息は彼の手のうちにある。
Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị, ya na ndụ ụmụ mmadụ
11 口が食物を味わうように、耳は言葉をわきまえないであろうか。
Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu, otu ire si anwale ihe oriri?
12 老いた者には知恵があり、命の長い者には悟りがある。
Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye? Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?
13 知恵と力は神と共にあり、深慮と悟りも彼のものである。
“Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike, ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.
14 彼が破壊すれば、再び建てることができない。彼が人を閉じ込めれば、開き出すことができない。
Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ; mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.
15 彼が水を止めれば、それはかれ、彼が水を出せば、地をくつがえす。
Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa. Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.
16 力と深き知恵は彼と共にあり、惑わされる者も惑わす者も彼のものである。
Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị; ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.
17 彼は議士たちを裸にして連れ行き、さばきびとらを愚かにし、
Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha, ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.
18 王たちのきずなを解き、彼らの腰に腰帯を巻き、
Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere, ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.
19 祭司たちを裸にして連れ行き、力ある者を滅ぼし、
Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha, kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.
20 みずから頼む者たちの言葉を奪い、長老たちの分別を取り去り、
Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi, wepụkwa nghọta nke ndị okenye.
21 君たちの上に侮りを注ぎ、強い者たちの帯を解き、
Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị, napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.
22 暗やみの中から隠れた事どもをあらわし、暗黒を光に引き出し、
Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.
23 国々を大きくし、またこれを滅ぼし、国々を広くし、また捕え行き、
Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi; Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.
24 地の民の長たちの悟りを奪い、彼らを道なき荒野にさまよわせ、
Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha, zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.
25 光なき暗やみに手探りさせ、酔うた者のようによろめかせる。
Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè. Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.

< ヨブ 記 12 >