< Zefanaya 3 >

1 Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu, na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya. 2 Ọ naghị ege onye ọbụla ntị, ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị. Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi, ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso. 3 Ndịisi nọ nʼetiti ya dịka ọdụm na-agbọ ụja, ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị, nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ. 4 Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ, ha bụkwa ndị aghụghọ. Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ na-ejikwa ike emebi iwu. 5 Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume. Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ. Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè; ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya, ma ndị ajọ omume enweghị ihere. 6 “Egbuchapụla m mba niile dị iche iche, kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike. Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ, ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga. A laala obodo ha niile nʼiyi, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye. 7 Asịrị m, banyere Jerusalem, ‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m, ma nabatakwa ntụziaka.’ Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya, ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya. Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere. 8 Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe. Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile. 9 “Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe. 10 Site nʼofe osimiri niile nke Kush, bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche. 11 Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m. 12 Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa nʼaha Onyenwe anyị. 13 Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.” 14 Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem. 15 Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. 16 Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba. 17 Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba, kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.” 18 “Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị. 19 Nʼoge ahụ, aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike. Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ, chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ. Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere. 20 Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ; mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ. Aga m eme ka unu na-ewu ewu ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa, mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu nʼihu anya unu.” Ka Onyenwe anyị kwuru.

< Zefanaya 3 >