< Zekaraya 9 >

1 Okwu Amụma. Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak, na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike, nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile na ebo niile nke Izrel dị. 2 Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu. 3 Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike, tụkọba ọlaọcha dịka aja, na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ. 4 Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri, ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya. 5 Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme. Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu. Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla. A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya. Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn. 6 Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd, aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị. 7 Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha, wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya. Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị, ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda. Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus. 8 Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche, ka ndị iro ghara ịbata na ya. Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha, nʼihi na anọ m na nche ugbu a. 9 Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn! Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem! Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị, onye ezi omume na onye nwere mmeri, onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu. 10 Ọ ga-ewezuga ụgbọ ịnyịnya niile nke Ifrem, na ịnyịnya agha niile nke Jerusalem; a ga-agbajikwa ụta agha. Ọ ga-ewetara mba niile udo, ọchịchị ya ga-esite nʼotu oke osimiri ruo nʼosimiri nke ọzọ, sitekwa nʼOsimiri Yufretis ruo na nsọtụ niile nke ụwa. 11 Ma gị onwe gị kwa, aga m eme ka ndị a tụrụ mkpọrọ nʼolulu nke mmiri na-adịghị nwere onwe ha, nʼihi ọbara nke ọgbụgba ndụ ahụ mụ na unu gbara. 12 Lọghachinụ nʼebe unu niile e wusiri ike, unu bụ ndị mkpọrọ nwere olileanya. Ọ bụladị taa, ana m ekwupụta ya na m ga-eme ka unu lọta, gọziekwa unu okpukpu abụọ. 13 Aga m agbagọ Juda dịka m si ekwe ụta m, tinye Ifrem dịka àkụ. Aga m akwali ụmụ gị ndị ikom, gị Zayọn, ka ha megide ụmụ ndị ikom ndị Griis. Aga m eme gị ka ị dịrị ka mma agha dị nʼaka dike nʼagha. 14 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị ga-egosi onwe ya nʼebe dị elu karịa ha, àkụ ya ga-efekwa dịka amụma. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-afụ opi ike, ọ ga-azọkwa ije nʼoke ifufe nke si na ndịda. 15 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-echebe ha. Ha ga-ebibi, zọdakwa nkume ịtụ iche nʼebe niile. Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ mekwa mkpọtụ site na mmanya; ha ga-ejupụta dịka efere, dịka efere eji efesa ihe nʼakụkụ niile ebe a na-achụ aja na-ejupụta. 16 Mgbe ụbọchị ahụ bịara, Onyenwe anyị bụ Chineke ha ga-azọpụta ndị ya, dịka onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta igwe ewu na atụrụ ya. Ha ga-acha, na-egbuke nʼala ya, dịka nkume dị oke ọnụahịa e tinyere nʼokpueze si na-egbuke. 17 Nʼezie, lee ka ịdị mma nke ala ahụ si dị ukwuu! Leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu! Mkpụrụ ubi ga-eme ka ụmụ okorobịa tozuo oke nke ọma, mmanya vaịnị ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ doo ahụ.

< Zekaraya 9 >