< Abụ nke Abụ 6 >

1 Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom, ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere? Olee ụzọ o sitere? Ka anyị soro gị chọọ ya. 2 Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige, nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ, ijegharị nʼetiti okoko urodi, na ịchịkọta okoko lili. 3 Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi. 4 Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ. Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem; Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ. 5 Wepụ anya gị nʼebe m nọ, nʼihi na i jirila anya gị dọta m. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu nke na-arịdata site nʼugwu Gilead. 6 Eze gị dị ka igwe atụrụ nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha. 7 Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet e kere abụọ. 8 E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii, na iri ndị iko nwanyị asatọ, na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, 9 ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile. Naanị otu nwanyị nne ya nwere, ọ masịrị onye mụrụ ya. Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi, ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya. 10 Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ, nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ, dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị? 11 Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi, ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu, ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị, na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru. 12 Tupu m mata ebe m nọ, agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m. 13 Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ; laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya. Onye hụrụ ibe ya nʼanya Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya dịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?

< Abụ nke Abụ 6 >