< Ndị Rom 6 >

1 Gịnị ọzọkwa ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-anọgide nʼime mmehie ka amara na-aba ụba?
Tubaye buli? Tuyendeli musambi lenga uruma iyongeseke?
2 E e! O kwesighị! Olee otu anyị ga-esi na-adị ndụ nʼime mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị?
Ata. twenga twatuwile musambi, tulowa wesa buli Kai tama mo?
3 Ọ bụ na unu amataghị na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtakwara anyị na ya nʼọnwụ.
Mutangite Lili balo baba batisilwe nkati ya Kirisitu babatizwi mumaiti gake?
4 Ya mere, esitere na baptizim likọọ anyị na ya nʼọnwụ, dịka e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie nʼebube nke Nna, ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ.
Twabile twasikilwa pamope na jwembe pitya mu utizo mukiwo. Ayee yapangilwe linga Kati Kirisitu mwajumwike buka mukiwo pitya mu utukufu wa Tate, lenga na twenga tuweze tyanga mu wayambie wa maisa.
5 Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nʼọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nʼọnwụ.
Mana mana-tuunganisilwe pamope na jwembe katika mfano wa kiwo sake, tuunganisilwe mu ufufuo wake.
6 Nʼihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ nke ochie anyị na Kraịst nʼelu obe, iji mee ka anụ ahụ nke mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nʼiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nʼịbụ ohu nke mmehie.
Twenga tutangite nyonyo, umundu witu wa zamani wati sulubiswa pamope na jwembe lenga yega ya sambi ualibikwe. Aye yabu nkati lenga wite kana tuyende lii batwa utumwa ba sambi.
7 Nʼihi na onye nwụrụ anwụ agụọla ya dịka onye nwere onwe ya site nʼebe mmehie dị.
Jwembe ywabile apangilwe mwene haki lingana sambi.
8 Ọ bụrụkwa nʼeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.
Lakini mana tuwile pamope na Kirisitu, tuaminiya panga twalowa tama na jwembe kai.
9 Nʼihi na anyị maara na ebe e mere ka Kraịst site nʼọnwụ bilie, ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọbụla nʼebe ọ nọ ọzọ.
Tutangite panga Kirisitu atijifufulilwa buka mukiwo, na jwembe maiti-lii. Kiwo kitawala lili kae.
10 Ọ nwụrụ naanị otu mgbe nʼihi mmehie. Ma ndụ ọ na-adị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke.
Mana kwa abari ya kiwo chabwile mu sambi, awhile mara jimo kwaajili ya boti, hata nyoo maisa gatama, atama kwajili ya Nnongo.
11 Ya mere, gụọ onwe unu ugbu a dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dịka ndị dị ndụ nʼebe Chineke nọ nʼime Kraịst, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
Kwa ndela yoo, na mwenga na mwemupalikwa kwibalanga muwile katika sambi, ila mwakoto kwa Nnongo nkati ya Kirisitu Yesu.
12 Unu ekwela ka mmehie na-achị eze nʼahụ unu ọzọ, nke ga-eme ka unu na-erubere agụụ nke anụ ahụ isi.
Kwasababu yo kana uyeketi sambi itawale payega yako lenga uweze kwitii tamaa zake.
13 Unu a nakwala eche akụkụ ahụ unu ọbụla ka ọ bụrụ ngwa ọrụ ajọ omume. Kama cheenụ onwe unu nʼihu Chineke, dịka ndị esi nʼọnwụ kpọpụta nyefee na ndụ. Cheenụ akụkụ ahụ unu niile nʼihu Chineke dịka ngwa ọrụ nke ezi omume.
Kene wapiye seme ya yenga yako musambi kati yombo yange haki, ila wipiye wamwene kwa Nnongo, kati bababile akoto buka mukiwo. Namwipeye sehemu ya yenga jinu kati yombo ya haki kwa Nnongo.
14 Nʼihi na unu ekwesighị ị bụ ohu mmehie, ebe ọ bụ na unu anọkwaghị nʼokpuru iwu ọzọ, kama unu nọ nʼokpuru amara.
Kana mwileke sambi itawale kwa kuwa mubili paie ya seliya, ila pae ya uruma.
15 Gịnịkwa? Anyị ga-eme mmehie nʼihi na anyị anọghị nʼokpuru iwu kama nʼokpuru amara? Mba! O kwesighị.
Kinamanile? Tupange sambi kwa sababu tubuli-lii pae ya seliya, ila pae ya uruma? Ataa.
16 Ọ bụ na unu amataghị na mgbe unu weere onwe unu nye mmadụ irubere ya isi dịka ohu, unu bụ ohu nye onye ahụ unu na-erubere isi, maọbụ ohu nye mmehie nke na-eduba nʼọnwụ, ma ọ bụkwanụ irube isi nke na-eduba nʼezi omume?
Mutangitelili panga kwake jwembe jwa ipiya mwene Kati atumishi jwembe ngamupanga mtumisi wake jwo, jwembe ngamupalikwa kumtii? Ayee kweli hata kwa mwenga mwatumwa a'sambi yaipelekya kukiwo, kutumwa wautii waukepeleka ku haki.
17 Ma ekele dịrị Chineke nʼihi na ọ bụ ezie na unu bụrịị ohu nye mmehie, ma ugbu a, unu ejirila obi unu niile kpebie ịnabatara onwe unu ozizi ahụ e nyefere nʼaka unu.
Lakini tushukuru Nnongo! Kwa kuwa mwabi mwatumwa ba sambi, lakini muyomwile tii buka kumwoyo kati mapundiso ga mpokile.
18 Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie, unu abụrụla ndị ohu ezi omume.
Mupangilwa uru buka mu sambi na mutangite mwatumwa ba haki.
19 Ana m eji ihe ịmaatụ site na ndụ a na-ebi kwa ụbọchị, nʼihi adịghị ike nke anụ ahụ mmadụ. Ya mere, dịka unu si were ahụ unu dị iche iche nye ịbụ ohu adịghị ọcha na ajọ omume nke na-abawanye ụba, sitekwanụ otu a were ha nye ugbu a ka ha bụrụ ohu ezi omume nke na-eduba nʼịdị nsọ.
Ninalongela kati na mundu kwasababu ya mapungufu nga miili yinu. Kwa mana kati mwebile mwamwipiyele iungo ya yenga jino, ba mwatumwa wa haki kwa takasika.
20 Mgbe unu bụ ohu mmehie, o nweghị ihe megidere unu ime ezi omume.
Kwa kuwa mwapoki atumwa ba sambi, mwabile uru kutolu na haki.
21 Ma gịnị bụ uru unu nwetara nʼoge ahụ site nʼọrụ ahụ niile unu rụrụ, bụ ihe ndị ahụ na-eme ka ihere mee unu? Ihe ndị ahụ na-eduba nʼọnwụ.
Kwa muda woo, mwabile na litunda gani kwa makowe na kwa saa yeno mwibona oni kwa ago? Kwasababu matokeo ga makowe ago ni kiwo.
22 Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Lakini kwa saa yeno mupangilwe uru kutolu na sambi na mupangike mwa atumwa kwa Nnongo, mubi na litunda kwa ajili ya utakaso. Buka ukoto wangeyomoka. (aiōnios g166)
23 Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. (aiōnios g166)
Kwasababu msaala wa sambi ni kiwo, ila sawadi ya bure ya Nnongo ni bwomi wangeyomoka kwa Kirisitu Nngwana witu. (aiōnios g166)

< Ndị Rom 6 >