< Abụ Ọma 87 >

1 Abụ Ọma ụmụ Kora. Otu Abụ. Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ;
可拉后裔的诗歌。 耶和华所立的根基在圣山上。
2 Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya, karịa ebe obibi niile nke Jekọb.
他爱锡安的门, 胜于爱雅各一切的住处。
3 Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị, O obodo Chineke; (Sela)
神的城啊, 有荣耀的事乃指着你说的。 (细拉)
4 “Aga m agụnye Rehab na Babilọn, dịka ndị na-asọpụrụ m, aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush, aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’”
我要提起拉哈伯和巴比伦人, 是在认识我之中的; 看哪,非利士和泰尔并古实人, 个个生在那里。
5 Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị, “A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya, ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.”
论到锡安,必说: 这一个、那一个都生在其中, 而且至高者必亲自坚立这城。
6 Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ: “A mụrụ onye a na Zayọn.”
当耶和华记录万民的时候, 他要点出这一个生在那里。 (细拉)
7 Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị, “Isi iyi m niile dị na gị.”
歌唱的,跳舞的,都要说: 我的泉源都在你里面。

< Abụ Ọma 87 >