< Abụ Ọma 86 >

1 Ekpere Devid. Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m, nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa.
A prayer of David. Listen, Yahweh, and answer me, for I am poor and oppressed.
2 Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi; zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi. Ị bụ Chineke m;
Protect me, for I am loyal; my God, save your servant who trusts in you.
3 meere m ebere, O Onyenwe m, nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile.
Be merciful to me, Lord, for I cry out to you all day long.
4 Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m, ka m na-eweliri mkpụrụobi m.
Make your servant glad, for to you, Lord, I lift up my soul.
5 Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m, i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị.
You, Lord, are good, and ready to forgive, and you show great mercy to all those who cry out to you.
6 O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m; gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere.
Yahweh, listen to my prayer; hear the sound of my pleas.
7 Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị, nʼihi na ị ga-aza m.
In the day of my trouble I call on you, for you will answer me.
8 Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m; ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ.
There is no one who compares to you among the gods, Lord. There are no deeds like your deeds.
9 Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị, fee gị ofufe, O Onyenwe anyị; ha ga-ebutere aha gị ebube.
All the nations that you have made will come and bow before you, Lord. They will honor your name.
10 Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche; ọ bụ naanị gị bụ Chineke.
For you are great and do wonderful things; you only are God.
11 Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị.
Teach me your ways, Yahweh. Then I will walk in your truth. Unite my heart to reverence you.
12 Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m; aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi.
Lord my God, I will praise you with my whole heart; I will glorify your name forever.
13 Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. (Sheol h7585)
For great is your covenant faithfulness toward me; you have rescued my life from the depths of Sheol. (Sheol h7585)
14 O Chineke, ndị mpako na-emegide m; otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla.
God, the arrogant have risen up against me. A gang of violent men seek my life. They have no regard for you.
15 Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
But you, Lord, are a merciful and gracious God, slow to anger, and abundant in covenant faithfulness and trustworthiness.
16 Chee m ihu, mekwaara m amara. Nye ohu gị ike gị, zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị nʼihi na m na-ejere gị ozi.
Turn toward me and have mercy on me; give your strength to your servant; save the son of your servant woman.
17 Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị, ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme, nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.
Show me a sign of your favor. Then those who hate me will see it and be put to shame because you, Yahweh, have helped me and comforted me.

< Abụ Ọma 86 >