< Abụ Ọma 83 >

1 Abụ, bụ Abụ Ọma Asaf. O! Chineke agbachikwala nkịtị. Biko, Chineke, ahapụkwala ikwu okwu, anọkwala jụụ. 2 Lee na ndị iro gị nọ na-ebigbọ, ndị kpọrọ gị asị na-eweli isi ha. 3 Ha ji aghụghọ na-agba izu imegide ndị gị; ha na-atụ atụmatụ ọjọọ megide ndị ị hụrụ nʼanya. 4 Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.” 5 Ha ji otu obi na-agbarịta izu; ha agbaala ndụ imegide gị, 6 ụlọ ikwu niile nke ndị Edọm, na ndị Ishmel, na ndị Moab, na ndị Haga, 7 na ndị Gebal, na ndị Amọn, na ndị Amalek, na ndị Filistia, ha na ndị Taịa. 8 Ọ bụladị ndị Asịrịa esorokwala ha, ịgba ndị agbụrụ Lọt ume. (Sela) 9 Mee ha dịka i si mee ndị Midia, na dịka i mere Sisera na Jabin, nʼakụkụ iyi Kishọn, 10 ndị lara nʼiyi nʼEndoa ma ghọọ ihe dịka nsị anụ e kpofuru ekpofu nʼala. 11 Mee ka ndị ọgaranya ha dịka Oreb na Zeeb, ka ụmụ ndị ikom eze ha niile dịka Zeba na Zalmuna, 12 ndị sịrị, “Ka anyị nwetara onwe anyị, ebe ịta nri ụmụ anụmanụ niile nke Chineke.” 13 O Chineke m, mee ha ka dịka ahịhịa ifufe na-efegharị gburugburu, maọbụ dịka igbugbo ọka nʼebe ifufe dị. 14 Dịka ọkụ na-erepịa oke ọhịa, maọbụ nke na-ere nʼelu ugwu, 15 si otu a were oke ifufe chụọ ha ọsọ, jiri oke ifufe nke na-eso mmiri ozuzo mee ka ha nọrọ nʼọnọdụ obi ọlụlọ mmiri. 16 Were ihere kpuchie ha ihu, ka ndị mmadụ si otu a chọọ aha gị, O Onyenwe anyị. 17 Ka ha nọdụ nʼọnọdụ ihere na ịda mba mgbe niile; ka ha laa nʼiyi nʼọnọdụ mweda nʼala. 18 Mee ka ha mata na gị, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, na ọ bụ naanị gị bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile.

< Abụ Ọma 83 >