< Abụ Ọma 71 >

1 Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ; ekwela ka ihere mee m.
In you, Yahweh, I take refuge; let me never be put to shame.
2 Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m; tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m.
Rescue me and make me safe in your righteousness; turn your ear to me and save me.
3 Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; nye iwu maka nzọpụta m, nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike.
Be to me a rock for refuge where I may always go; you have given a command to save me, for you are my rock and my fortress.
4 O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, ndị afọ tara mmiri, gbapụta m.
Rescue me, my God, out of the hand of the wicked, out of the hand of the unrighteous and cruel.
5 Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị, ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.
For you are my hope, Lord Yahweh. I have trusted in you ever since I was a child.
6 Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Aga m anọgide na-eto gị.
By you I have been supported from the womb; you are he who took me out of my mother's belly; my praise will be always about you.
7 Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ, ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike.
I am an example to many people; you are my strong refuge.
8 Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile.
My mouth will be filled with your praise, all the day with your honor.
9 Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi; ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m.
Do not throw me away in my time of old age; do not abandon me when my strength fails.
10 Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m; ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo.
For my enemies are talking about me; those who watch for my life are plotting together.
11 Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ; chụọ ya ọsọ, jidekwa ya, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.”
They say, “God has forsaken him; pursue and take him, for there is no one to save him.”
12 O Chineke, anọla m ebe dị anya; O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka.
God, do not be far from me; my God, hurry to help me.
13 Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha; ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ.
Let them be put to shame and destroyed, those who are hostile to my life; let them be covered with rebuke and dishonor, those who seek my hurt.
14 Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile; aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ.
But I will always hope in you and will praise you more and more.
15 Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya.
My mouth will tell about your righteousness and your salvation all the day, although I cannot understand it.
16 Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị, aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị.
I will come with the mighty acts of the Lord Yahweh; I will make mention of your righteousness, yours alone.
17 O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile.
God, you have taught me from my youth; even now I declare your wonderful deeds.
18 O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi, mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m, tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa, na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu.
Indeed, even when I am old and gray-headed, God, do not forsake me, as I have been declaring your strength to the next generation, your power to everyone who is to come.
19 O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe, gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu. O Chineke, onye dị ka gị?
Your righteousness also, God, is very high; you who have done great things, God, who is like you?
20 Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu nke dị ilu, ị ga-atụte ndụ m ọzọ; site nʼebe dị omimi nke ụwa, ị ga-adọkpụpụta m ọzọ.
You who made me see many troubles will revive us again and will bring us up again from the depths of the earth.
21 Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ. Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ.
May you increase my honor; turn again and comfort me.
22 O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị, nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị; aga m eji une bụkuo gị abụ otuto, gị Onye nsọ nke Izrel.
I will also give thanks to you with the harp for your trustworthiness, my God; to you I will sing praises with the harp, Holy One of Israel.
23 Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ mgbe m na-abụku gị abụ otuto, mụ, onye ị gbapụtara.
My lips will shout for joy when I sing praises to you— even my soul, which you have redeemed.
24 Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta ọrụ ezi omume gị niile, nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ, ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.
My tongue will also talk about your righteousness all day long; for they have been put to shame and are confused, those who sought my hurt.

< Abụ Ọma 71 >