< Abụ Ọma 51 >

1 Abụ dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Mgbe Netan bụ onye amụma bịakwutere Devid nʼoge ya na Batsheba kwara iko. O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. 2 Sachapụ mmehie m niile, ma mee m ka m dị ọcha. 3 Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. 4 Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. 5 Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m. 6 Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo. 7 Were hisọp sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo. 8 Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa. 9 Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile. 10 Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. 11 Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị. 12 Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m. 13 Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị. 14 O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị. 15 O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị. 16 Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ. 17 Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị. 18 Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem. 19 Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị.

< Abụ Ọma 51 >