< Abụ Ọma 38 >

1 Abụ Ọma Devid. Arịrịọ. Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe, maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ. 2 Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ, aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ. 3 Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m. 4 Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m. 5 Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi nʼihi mmehie enweghị uche m. 6 Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ. 7 Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu ahụ adịghịkwa m. 8 Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi. 9 O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m; ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ. 10 Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m, ìhè esitekwala nʼanya m pụọ. 11 Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m, ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya. 12 Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya, ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m; ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ. 13 Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya. 14 Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu. 15 O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza. 16 Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.” 17 Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu. 18 Ana m ekwupụta mmehie m; mmehie m na-ewute m. 19 Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ, ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba. 20 Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe, na-ebo ebubo megide m nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe. 21 O Onyenwe anyị, ahapụkwala m; O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya. 22 Bịa ọsịịsọ inyere m aka Onyenwe m na Onye nzọpụta m.

< Abụ Ọma 38 >