< Abụ Ọma 36 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid, bụ ohu Onyenwe anyị. E nwere m ozi dị nʼime obi nke sitere nʼaka Chineke banyere ndụ mmehie nke ndị na-eme ajọ ihe: Ọ dịghị ịtụ egwu Chineke dị nʼanya ha. 2 Nʼihi ha na-agwarịta onwe ha okwu ire ụtọ nʼanya ha onwe ha, na o nweghị ụzọ a ga-esi nwe ike ịchọpụta mmehie ha maọbụ kpọọ ya asị. 3 Okwu ọnụ ha niile bụ ihe ọjọọ na aghụghọ; ha adịghị eji uche eme ihe maọbụ mee ihe dị mma. 4 Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼelu ihe ndina ha, ha na-eche echiche ajọ ihe; ha enyefeela onwe ha nʼaka ndụ ajọ omume, ha adịghị ajụkwa ihe na-ezighị ezi. 5 O Onyenwe anyị, ịhụnanya gị na-eru mbara eluigwe, ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa igwe ojii nke eluigwe. 6 Ezi omume gị dịka ugwu dị ukwuu, ikpe ikpe ziri ezi gị dịka omimi nke oke osimiri. O Onyenwe anyị, ị na-echebe ụmụ mmadụ na anụmanụ. 7 Lee ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ si dị oke ọnụahịa, O Chineke! Ụmụ mmadụ na-agbaba nʼokpuru ndo nke nku gị abụọ. 8 Ha na-eri oriri site nʼịba ụba nke ụlọakụ gị; Ị na-enyekwa ha mmiri site nʼiyi nke obi ụtọ gị. 9 Nʼihi na mmiri na-enye ndụ dị na gị; ọ bụkwa nʼìhè gị ka anyị na-ahụ ìhè. 10 Mee ka ịhụnanya gị na-adịgidere ndị maara gị, ka ezi omume gị na-adịgidekwara ndị ziri ezi nʼobi. 11 Ekwela ka ndị mpako a zọọ m ụkwụ nʼisi, ekwekwala ka aka ndị ajọ omume nupu m nʼebe m guzo. 12 Lee ka ndị na-eme ajọ ihe si daa nʼala, a kwatuola ha nʼala, ha apụghịkwa ibilite ọzọ.

< Abụ Ọma 36 >