< Abụ Ọma 22 >

1 Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro olu abụ nke “Nne ele nke ụtụtụ.” Abụ Ọma Devid. Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile?
大卫的诗,交与伶长。调用朝鹿。 我的 神,我的 神!为什么离弃我? 为什么远离不救我?不听我唉哼的言语?
2 O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere.
我的 神啊,我白日呼求,你不应允, 夜间呼求,并不住声。
3 Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel.
但你是圣洁的, 是用以色列的赞美为宝座的。
4 Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha.
我们的祖宗倚靠你; 他们倚靠你,你便解救他们。
5 Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi.
他们哀求你,便蒙解救; 他们倚靠你,就不羞愧。
6 Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya.
但我是虫,不是人, 被众人羞辱,被百姓藐视。
7 Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị.
凡看见我的都嗤笑我; 他们撇嘴摇头,说:
8 “O na-atụkwasị Onyenwe anyị obi; ka Onyenwe anyị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.”
他把自己交托耶和华,耶和华可以救他吧! 耶和华既喜悦他,可以搭救他吧!
9 Ma Onyenwe anyị, ọ bụ gị wepụtara m site nʼafọ nne m. Ọ bụ gị mere ka m tụkwasị gị obi, ọ bụladị mgbe m ka na-aṅụ ara.
但你是叫我出母腹的; 我在母怀里,你就使我有倚靠的心。
10 Site nʼoge amụrụ m ka e nyefere m nʼaka gị. Site nʼafọ nne m, ka gị onwe gị bụ Chineke m.
我自出母胎就被交在你手里; 从我母亲生我,你就是我的 神。
11 Anọla m ebe dị anya, nʼihi na nsogbu dị nso. Ọ dịkwaghị onye inyeaka nọ nso.
求你不要远离我! 因为急难临近了,没有人帮助我。
12 Ọtụtụ oke ehi gbara m gburugburu; oke ehi dị ike nke Bashan gbara m gburugburu.
有许多公牛围绕我, 巴珊大力的公牛四面困住我。
13 Ọdụm ndị na-agbọ ụja mgbe ha na-adọgbu anụ ọhịa asaghepụla ọnụ ha megide m.
它们向我张口, 好像抓撕吼叫的狮子。
14 A wụpụla m dịka mmiri, ọkpụkpụ m niile apụkwaala nʼọnọdụ ha. Obi m agbazela dịka mmanụ, obi ịlọ mmiri ewerela ọnọdụ nʼime m.
我如水被倒出来; 我的骨头都脱了节; 我心在我里面如蜡熔化。
15 Ike ọbụla adịghịkwa m nʼahụ, dịka a ga-asị na m bụ ụrọ nke anwụ mịkọọrọ mmiri dị ya nʼime. Ire m na-araparakwa m nʼọnụ, nʼihi na ị tọgbọrọ m nʼọnụ ọnwụ.
我的精力枯干,如同瓦片; 我的舌头贴在我牙床上。 你将我安置在死地的尘土中。
16 Ọtụtụ nkịta agbaala m gburugburu; otù ndị na-eme ihe ọjọọ agbaala m gburugburu, ha adupuola m aka m na ụkwụ m.
犬类围着我,恶党环绕我; 他们扎了我的手,我的脚。
17 A pụrụ ịgụta ọkpụkpụ m niile ọnụ; ndị mmadụ na-ele m anya na-emikwa ọnụ ọchị
我的骨头,我都能数过; 他们瞪着眼看我。
18 Ha na-eke uwe m nʼetiti ha, ha sitere nʼife nza kee uwe m.
他们分我的外衣, 为我的里衣拈阄。
19 Ma gị, Onyenwe anyị, anọla m ebe dị anya; gị Onye bụ ike m, mee ngwangwa bịa nyere m aka.
耶和华啊,求你不要远离我! 我的救主啊,求你快来帮助我!
20 Napụta ndụ m site na mma agha, site nʼike ụmụ nkịta, napụta ndụ m nke dị oke ọnụahịa.
求你救我的灵魂脱离刀剑, 救我的生命脱离犬类,
21 Gbapụta m site nʼọnụ ọdụm ndị a, zọpụta m site na mpi atụ ndị a.
救我脱离狮子的口; 你已经应允我,使我脱离野牛的角。
22 Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m; nʼetiti ọha mmadụ aga m enye gị otuto.
我要将你的名传与我的弟兄, 在会中我要赞美你。
23 Toonu Onyenwe anyị! Unu niile bụ ndị na-atụ egwu ya; unu bụ ndị agbụrụ Jekọb, sọpụrụnụ ya! Tụọnụ ya egwu, unu agbụrụ Izrel!
你们敬畏耶和华的人要赞美他! 雅各的后裔都要荣耀他! 以色列的后裔都要惧怕他!
24 Nʼihi na o ledaghị ahụhụ onye a na-akpagbu anya maọbụ kwaa ya emo; o lefughị ya anya kama mgbe ọ kpọkuru ya, ọ nụrụ olu akwa ya.
因为他没有藐视憎恶受苦的人, 也没有向他掩面; 那受苦之人呼吁的时候,他就垂听。
25 Isiokwu otuto m nʼetiti ọha mmadụ sitere na gị; aga m emezukwa nkwa niile m kwere gị nʼihu ndị ahụ na-atụ egwu gị.
我在大会中赞美你的话是从你而来的; 我要在敬畏耶和华的人面前还我的愿。
26 Ndị ogbenye ga-eri nri, rijuo afọ ha, ndị niile na-achọ Onyenwe anyị ga-eto ya ka mkpụrụobi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
谦卑的人必吃得饱足; 寻求耶和华的人必赞美他。 愿你们的心永远活着!
27 Nsọtụ elu ụwa niile ga-echeta, ma laghachikwute Onyenwe anyị. Ezinaụlọ nke mba niile dị iche iche ga-akpọ isiala nʼihu ya.
地的四极都要想念耶和华,并且归顺他; 列国的万族都要在你面前敬拜。
28 Nʼihi na ike ọchịchị bụ nke Onyenwe anyị, ọ na-achịkwa mba niile.
因为国权是耶和华的; 他是管理万国的。
29 Ndị ọgaranya niile nke elu ụwa ga-eri oriri ma fee ya; ihe niile na-anwụ anwụ ga-akpọ isiala nʼihu ya; ndị na-apụghị idebe onwe ha ndụ.
地上一切丰肥的人必吃喝而敬拜; 凡下到尘土中—不能存活自己性命的人 —都要在他面前下拜。
30 Agbụrụ anyị ga-ejere ya ozi; a ga-akọrọ ọgbọ ndị na-abịa nʼihu ihe banyere onyenwe anyị.
他必有后裔事奉他; 主所行的事必传与后代。
31 Ha ga-ekwusa ezi omume ya nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu, bụ ndị a na-amụbeghị nʼihi na o meela ya.
他们必来把他的公义传给将要生的民, 言明这事是他所行的。

< Abụ Ọma 22 >