< Abụ Ọma 134 >

1 Abụ nrigo. Toonu Onyenwe anyị, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị nʼoge abalị. 2 Chilienụ aka unu abụọ elu nʼime ụlọnsọ ya ma toonu Onyenwe anyị. 3 Ka Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa site na Zayọn gọzie unu.

< Abụ Ọma 134 >