< Abụ Ọma 124 >

1 Abụ nrigo. Nke Devid. A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo, 2 a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị, 3 mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ; 4 idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị, 5 ebili mmiri niile gaara ebufu anyị. 6 Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị. 7 Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị. 8 Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.

< Abụ Ọma 124 >