< Abụ Ọma 119 >

1 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị. 2 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. 3 Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile. 4 I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi. 5 Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile! 6 Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile. 7 Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. 8 Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m. 9 Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị. 10 Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu. 11 Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị. 12 Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị; kuziere m iwu gị niile. 13 Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị. 14 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba. 15 Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile. 16 Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya. 17 Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; aga m erubere okwu gị isi. 18 Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị. 19 Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile. 20 Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ. 21 Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị. 22 Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile. 23 Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị. 24 Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m. 25 Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị. 26 Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị. 27 Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile. 28 Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị. 29 Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara. 30 Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile. 31 O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m. 32 Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya. 33 O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. 34 Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị ma jiri obi m niile rubere ya isi. 35 Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ. 36 Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. 37 Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị. 38 Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị. 39 Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. 40 Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. 41 O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; 42 mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. 43 Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. 44 Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi ruo mgbe ebighị ebi. 45 Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. 46 Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze ma ihere agaghị eme m, 47 nʼihi na iwu gị na-amasị m nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya. 48 Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile. 49 Cheta okwu i nyere ohu gị, nʼihi na i nyela m olileanya. 50 Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: nkwa gị na-echebe ndụ m. 51 Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m. 52 O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, ha na-ewetara m nkasiobi. 53 Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, ndị gbakụtara iwu gị azụ. 54 Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m ebe ọbụla m na-anọ. 55 Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị, aga m edebekwa iwu gị. 56 Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: ana m erubere ụkpụrụ gị isi. 57 O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m; ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile. 58 Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; meere m ebere dịka nkwa gị si dị. 59 Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile. 60 Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi. 61 A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị. 62 Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi. 63 Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị. 64 O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; kuziere m iwu gị niile. 65 Meere ohu gị ihe ọma dịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị. 66 Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile. 67 Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi. 68 I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; kuziere m iwu gị niile. 69 Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị. 70 Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị. 71 Ọ dị mma na m tara ahụhụ ka m nwee ike mụta iwu gị niile. 72 Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. 73 Aka gị kere m, kpụọkwa m; nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile. 74 Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị. 75 O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ. 76 Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, dịka nkwa i kwere ohu gị si dị. 77 Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m. 78 Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. 79 Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile. 80 Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m. 81 Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị. 82 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” 83 Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ nke dị nʼanwụrụ ọkụ, anaghị m echefu iwu gị niile. 84 Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ? 85 Ndị mpako na-egwuru m olulu, bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị. 86 Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha. 87 Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ. 88 Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị. 89 O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe. 90 Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike. 91 Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi. 92 A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m. 93 Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m. 94 Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. 95 Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. 96 Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, ma iwu gị niile enweghị nsọtụ. 97 O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile. 98 Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, ha na-anọnyere m oge niile. 99 Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile. 100 Enwere m nghọta karịa ndị okenye nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi. 101 Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla ka m nwee ike rubere okwu gị isi 102 Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha. 103 Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ! 104 A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. 105 Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m bụrụkwa ìhè nʼụzọ m. 106 Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile. 107 Ataala m ahụhụ nke ukwuu; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị. 108 O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, kuziekwara m iwu gị niile. 109 Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, ma echezọghị m iwu gị. 110 Ndị ajọ omume esielera m ọnya, ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo. 111 Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. 112 Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị ruo na ngwụcha. 113 Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. 114 Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; olileanya m dị nʼokwu gị. 115 Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m! 116 Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; ekwekwala ka olileanya m daa. 117 Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile. 118 Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi. 119 Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya. 120 Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile. 121 Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m. 122 Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m. 123 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi. 124 Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile. 125 Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile. 126 O Onyenwe anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, nʼihi na a na-emebi iwu gị. 127 Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha, 128 nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị. 129 Iwu gị niile dị ịtụnanya; ya mere, ana m erubere ha isi. 130 Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. 131 Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, na-achọsi iwu gị niile ike. 132 Chee m ihu, meere m ebere, dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. 133 Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; ekwela ka mmehie chịa m. 134 Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, ka m nwee ike debe iwu gị. 135 Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. Kuziere m ụkpụrụ gị niile. 136 Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. 137 O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, iwu gị niile zikwara ezi. 138 Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; ha kwesiri ntụkwasị obi. 139 Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba. 140 Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya. 141 Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya. 142 Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. Iwu gị niile bụkwa eziokwu. 143 Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m. 144 Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ. 145 Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị, aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile. 146 Ana m akpọku gị; zọpụta m aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile. 147 Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; olileanya m dị nʼokwu gị. 148 Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile. 149 Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị. 150 Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya. 151 Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu. 152 Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. 153 Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, nʼihi na echefughị m iwu gị. 154 Kpepụta m, gbapụta m, chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị. 155 Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile. 156 O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị. 157 Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, ma aga m anọgide na-edebe iwu gị. 158 Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi. 159 Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị. 160 Okwu gị niile bụ eziokwu; iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 161 Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere, ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị. 162 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. 163 Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. 164 Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi. 165 Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ. 166 Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, na-agbasokwa iwu gị niile. 167 Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu. 168 Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile. 169 Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị; nye m nghọta dịka okwu gị si dị. 170 Ka arịrịọ m ruo gị ntị; gbapụta m dịka nkwa gị si dị. 171 Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile. 172 Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. 173 Nọọ na njikere oge niile inyere m aka, nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile. 174 Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, iwu gị bụ ihe na-amasị m. 175 Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, ka iwu gị niile gbaa m ume. 176 Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu, chọọ ohu gị, nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile.

< Abụ Ọma 119 >