< Ilu 14 >

1 Nwanyị maara ihe na-ewu ụlọ ya, ma nwanyị nzuzu na-eji aka ya akwada ụlọ ya. 2 Ime ihe ziri ezi bụ ịtụ egwu Onyenwe anyị; ma ndị na-ejehie nʼụzọ ha na-akpọ ya asị. 3 Ọnụ onye nzuzu na-ekwupụta okwu mpako, ma egbugbere ọnụ onye maara ihe na-echebe ha. 4 Mgbe ehi na-adịghị, ụlọ ebe a na-azụ anụ na-adị ọcha, ma site nʼike ehi ihe omume nke ubi na-ejupụta nʼụlọ. 5 Onye akaebe eziokwu adịghị aghọgbu mmadụ, ma onye akaebe ụgha na-agha ụgha mgbe ọbụla. 6 Onye na-akwa emo na-achọ amamihe ma ọ dịghị achọta ya; ma ihe ọmụma na-abịara onye nwere nghọta ọsịịsọ. 7 Si nʼebe onye nzuzu wezuga onwe gị, nʼihi na ị gaghị achọta ihe ọmụma nʼọnụ ya. 8 Amamihe nke onye nwere uche bụ ihe na-eme ka ọ mata ebe ọ na-aga, ma enweghị uche nke ndị nzuzu bụ aghụghọ. 9 Ndị nzuzu na-eji okwu idozi ihe mmehie mebiri akwa emo; ma obi ebere ka a na-achọta nʼetiti ndị omume ha ziri ezi. 10 Ọ bụ naanị onye ihe na-eme maara ụfụ ya, ọ dịghị onye ọzọ ga-eso keta ọṅụ ya. 11 A ga-ala ụlọ onye ajọ omume nʼiyi, ma ụlọ ikwu onye omume ya ziri ezi ga-awasa ka igu. 12 Ọ dị ụzọ nke ziri ezi nʼanya mmadụ, ma nʼikpeazụ ọ na-eduba nʼọnwụ. 13 Ọ bụladị nʼime ọchị obi mgbu na-adị, ma ọṅụ nwere ike kwụsị nʼiru ụjụ. 14 Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi aghaghị inweta ụgwọ ọrụ ha, ma ezi mmadụ ga-enwetakwa ụgwọ ọrụ ya. 15 Onye na-enweghị uche na-ekwenye ihe niile a gwara ya; ma onye nwere uche na-atule mara ebe ọ na-eje. 16 Onye mara ihe na-atụ egwu Onyenwe anyị na-ewezugakwa onwe ya nʼihe ọjọọ, ma onye nzuzu na-ewebiga iwe oke ma na-eche na ọ ka bụ onye kwesiri ntụkwasị obi. 17 Onye iwe ọkụ na-eme ihe nzuzu, ma onye na-echepụta nzube ọjọọ ka a na-akpọ asị. 18 Ndị na-enweghị uche na-enweta ụgwọ ọrụ nke uche gbagọrọ agbagọ, ma onye nwere uche na-enweta ihe ọmụma. 19 Ndị ọjọọ ga-akpọ isiala nʼihu ndị ezi mmadụ, ndị ajọ omume ga-ada nʼọnụ ụzọ ama ndị ezi omume. 20 Ọ bụladị ndị agbataobi onye ogbenye na-akpọ ya asị, ma ọgaranya na-enwe ọtụtụ ndị enyi. 21 Onye na-eleda onye agbataobi ya anya na-emehie, ma onye na-emere ndị ogbenye ebere ka ihe ga-agara nke ọma. 22 Ndị na-ezube ihe ọjọọ, ha ọ naghị akpafu? Ma ndị na-ezube ihe ọma na-achọta ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 23 Ịrụsị ọrụ ike na-eweta uru; ma oke okwu na-eweta ụkpa. 24 Okpueze nke ndị maara ihe bụ akụnụba ha, ma enweghị uche nke ndị nzuzu na-emepụta naanị ihe na-abaghị uru. 25 Onye na-agba akaebe eziokwu na-anapụta ndụ mmadụ, ma onye akaebe ụgha bụ onye aghụghọ. 26 Onye ọbụla na-atụ egwu Onyenwe anyị nwere ebe mgbaba; nye ụmụ ya ọ ga-abụkwa ebe ize ndụ. 27 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ isi iyi nke ndụ; nke na-eme ka mmadụ ghara ịma nʼọnya ọnwụ. 28 Otuto onye eze na-enwe dabeere nʼọnụọgụgụ ndị ọ na-achị, e wezuga ndị ọ na-achị, eze enweghị ugwu ọbụla. 29 Onye na-enwe ndidi nwere ọtụtụ nghọta, ma onye obi ọkụ na-egosi enweghị uche ya. 30 Ndụ dị jụụ na-eme ka ụbọchị mmadụ dị ogologo; ekworo na-eme ka o ree ure. 31 Onye ọbụla na-emegbu onye ogbenye na-elelị Chineke kere ha anya, ma onye na-emere onye ogbenye ebere na-asọpụrụ Chineke. 32 Ọ bụladị nʼọnwụ onye ezi omume nwere ebe mgbaba nʼime Chineke, ma ndị ajọ omume na-ala nʼiyi, mgbe mbibi bịara. 33 Nʼobi onye nwere nghọta ka amamihe na-anọgide, ma ọ bụladị nʼetiti ndị nzuzu ọ na-eme ka amara ya. 34 Ezi omume na-ewuli mba elu, ma mmehie bụ ihe ihere nye ndị ọbụla. 35 Eze na-aṅụrị ọṅụ nʼihi odibo maara ihe; ma odibo na-eweta ihere na-akpali oke iwe ya.

< Ilu 14 >