< Ọnụọgụgụ 7 >

1 Mgbe Mosis guzobesiri ụlọ nzute ahụ ọtọ, o tere ya mmanụ. Doo ya na ihe niile e ji chọọ ya mma nsọ. O tekwara ebe ịchụ aja mmanụ, doo ya nsọ, ya na ngwongwo ya niile.
ויהי ביום כלות משה להקים את המשכן וימשח אתו ויקדש אתו ואת כל כליו ואת המזבח ואת כל כליו וימשחם ויקדש אתם
2 Mgbe ahụ, ndị ndu Izrel, ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndị ndu ebo niile e tinyere ọrụ ịgụ ndị ahụ niile ọnụ wetara onyinye ha.
ויקריבו נשיאי ישראל ראשי בית אבתם הם נשיאי המטת הם העמדים על הפקדים
3 Ha wetara dịka onyinye ha nye Onyenwe anyị ụgbọala isii ihe juputara nʼime ha, na ehi iri na abụọ. Ndị ndu abụọ ọbụla wetara otu ụgbọala, ma ha niile nʼotu na otu wetara otu ehi, otu ehi. Ha chere ihe ndị a niile nʼihu ụlọ nzute ahụ.
ויביאו את קרבנם לפני יהוה שש עגלת צב ושני עשר בקר--עגלה על שני הנשאים ושור לאחד ויקריבו אותם לפני המשכן
4 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
ויאמר יהוה אל משה לאמר
5 “Nabata onyinye ndị a niile, ka e jiri ha rụọ ọrụ ụlọ nzute, were ha nyefee ndị Livayị nʼaka, onye ọbụla dịka mkpa ọrụ ya si dị.”
קח מאתם והיו לעבד את עבדת אהל מועד ונתתה אותם אל הלוים איש כפי עבדתו
6 Ya mere, Mosis nabatara ụgbọala ndị ahụ na ehi ndị ahụ, nyefee ha ndị Livayị nʼaka.
ויקח משה את העגלת ואת הבקר ויתן אותם אל הלוים
7 O nyere ụmụ Geshọn ụgbọala abụọ na ehi anọ, dịka ọrụ ha si dị.
את שתי העגלות ואת ארבעת הבקר--נתן לבני גרשון כפי עבדתם
8 Nye ụmụ Merari, ụgbọala anọ na ehi asatọ, dịka ọrụ ha si dị. Ha niile nọ nʼokpuru nlekọta Itama nwa Erọn, onye nchụaja.
ואת ארבע העגלת ואת שמנת הבקר--נתן לבני מררי כפי עבדתם ביד איתמר בן אהרן הכהן
9 Mosis enyeghị ụmụ Kohat ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ nʼisi mbụ aka ha ka ha ji ebu ihe nsọ ndị ahụ ha ketara ibu.
ולבני קהת לא נתן כי עבדת הקדש עלהם בכתף ישאו
10 Ndị ndu ụmụ Izrel niile wetara onyinye ido nsọ nʼụbọchị e tere ebe ịchụ aja ahụ mmanụ ido ya nsọ. Ha wetara ha, debe ha nʼihu ebe ịchụ aja ahụ.
ויקריבו הנשאים את חנכת המזבח ביום המשח אתו ויקריבו הנשיאם את קרבנם לפני המזבח
11 Nʼihi na Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ka onyendu ọbụla weta onyinye nʼụbọchị dị iche iche, otu onye, otu ụbọchị, maka ido nsọ nke ebe ịchụ aja ahụ.”
ויאמר יהוה אל משה נשיא אחד ליום נשיא אחד ליום יקריבו את קרבנם לחנכת המזבח
12 Ya mere, Nashọn nwa Aminadab onye si nʼebo Juda wetara onyinye nke ya nʼụbọchị nke mbụ.
ויהי המקריב ביום הראשון--את קרבנו נחשון בן עמינדב למטה יהודה
13 Onyinye o wetara bụ: efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere abụọ ndị a ụtụ ọka a gwara mmanụ maka onyinye mkpụrụ ọka.
וקרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
14 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
15 O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule nke gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
16 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
17 na ehi abụọ, na ebule ise, na mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Nashọn nwa Aminadab nyere.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתודים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן נחשון בן עמינדב
18 Nʼụbọchị nke abụọ, Netanel nwa Zua, onyendu ebo Isaka wetara onyinye nke ya.
ביום השני הקריב נתנאל בן צוער--נשיא יששכר
19 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
הקרב את קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
20 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
21 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
22 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
23 na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Netanel nwa Zua.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן נתנאל בן צוער
24 Nʼụbọchị nke atọ Eliab nwa Helọn onyendu ebo Zebụlọn wetakwara onyinye nke ya.
ביום השלישי נשיא לבני זבולן--אליאב בן חלן
25 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
26 O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
27 O wetakwara otu nwa oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
28 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
29 na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Eliab nwa Helọn wetara.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן אליאב בן חלן
30 Nʼụbọchị nke anọ, Elizọ nwa Shedeua onyendu ebo Ruben wetara onyinye nke ya.
ביום הרביעי נשיא לבני ראובן--אליצור בן שדיאור
31 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
32 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
33 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
34 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
35 na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Elizọ nwa Shedeua nyere.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן אליצור בן שדיאור
36 Nʼụbọchị nke ise Shelumiel nwa Zurishadai, onyendu ebo Simiọn butere onyinye nke ya.
ביום החמישי נשיא לבני שמעון--שלמיאל בן צורישדי
37 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
38 O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
39 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
40 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
41 ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Shelumiel nwa Zurishadai nyere.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן שלמיאל בן צורישדי
42 Nʼụbọchị nke isii, Eliasaf nwa Deuel onyendu ebo Gad butere onyinye nke ya.
ביום הששי נשיא לבני גד--אליסף בן דעואל
43 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
44 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
45 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
46 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
47 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Eliasaf nwa Deuel nyere.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן אליסף בן דעואל
48 Nʼụbọchị nke asaa, Elishama, nwa Amihud, onyendu ebo Ifrem butere onyinye nke ya.
ביום השביעי נשיא לבני אפרים--אלישמע בן עמיהוד
49 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
50 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
51 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
52 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
53 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Elishama nwa Amihud nyere.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן אלישמע בן עמיהוד
54 Nʼụbọchị nke asatọ, Gamaliel nwa Pedazo onyendu ebo Manase nyere onyinye nke ya.
ביום השמיני נשיא לבני מנשה--גמליאל בן פדהצור
55 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
56 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
57 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
58 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
59 ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Gamaliel nwa Pedazo nyere.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן גמליאל בן פדהצור
60 Nʼụbọchị nke itoolu, Abidan nwa Gidiọn onyendu ebo Benjamin nyere onyinye nke ya.
ביום התשיעי נשיא לבני בנימן--אבידן בן גדעני
61 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
62 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
63 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
64 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
65 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Abidan nwa Gidiọni nyere.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן אבידן בן גדעני
66 Nʼụbọchị nke iri, Ahieza nwa Amishadai, onyendu ebo Dan butere onyinye nke ya.
ביום העשירי נשיא לבני דן--אחיעזר בן עמישדי
67 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
68 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
69 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
70 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
71 ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Ahieza nwa Amishadai nyere.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן אחיעזר בן עמישדי
72 Nʼụbọchị nke iri na otu, Pagịel nwa Okran, onyendu ebo Asha butere onyinye nke ya.
ביום עשתי עשר יום נשיא לבני אשר--פגעיאל בן עכרן
73 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
74 O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
75 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
76 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
77 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Pagịel nwa Okran nyere.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן פגעיאל בן עכרן
78 Nʼụbọchị nke iri na abụọ, Ahira nwa Enan, onyendu ebo Naftalị nyere onyinye nke ya.
ביום שנים עשר יום נשיא לבני נפתלי--אחירע בן עינן
79 Onyinye o wetara bụ: otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
קרבנו קערת כסף אחת שלשים ומאה משקלה מזרק אחד כסף שבעים שקל בשקל הקדש שניהם מלאים סלת בלולה בשמן--למנחה
80 O wetara otu efere ọlaedo nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
כף אחת עשרה זהב מלאה קטרת
81 O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ.
פר אחד בן בקר איל אחד כבש אחד בן שנתו--לעלה
82 O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie,
שעיר עזים אחד לחטאת
83 na ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Ahira nwa Enan nyere.
ולזבח השלמים בקר שנים אילם חמשה עתדים חמשה כבשים בני שנה חמשה זה קרבן אחירע בן עינן
84 Ndị a bụ onyinye ndị ndu ụmụ Izrel wetara maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ: efere ọlaọcha iri na abụọ, na efere ọlaọcha ịkwọsa mmiri iri na abụọ, na efere ọlaedo iri na abụọ.
זאת חנכת המזבח ביום המשח אתו מאת נשיאי ישראל קערת כסף שתים עשרה מזרקי כסף שנים עשר כפות זהב שתים עשרה
85 Ịdị arọ nke efere ọlaọcha ọbụla dị otu narị shekel na iri shekel atọ. Ịdị arọ nke efere ịkwọsa mmiri ọbụla dị iri shekel asaa. Ịdị arọ efere ọlaọcha niile ha wetara bụ puku shekel abụọ na narị shekel anọ, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị.
שלשים ומאה הקערה האחת כסף ושבעים המזרק האחד כל כסף הכלים אלפים וארבע מאות בשקל הקדש
86 Ịdị arọ nke otu nʼime efere ọlaedo iri na abụọ ndị ahụ ụda nsure ọkụ na-esi isi ụtọ juru nʼime ha bụ iri shekel, dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. Ịdị arọ nke efere ọlaedo ndị ahụ niile bụ otu narị shekel na iri shekel abụọ.
כפות זהב שתים עשרה מלאת קטרת עשרה עשרה הכף בשקל הקדש כל זהב הכפות עשרים ומאה
87 Ọnụọgụgụ anụ ụlọ niile e wetara maka aja nsure ọkụ bụ: oke ehi iri na abụọ, na ebule iri na abụọ, na ụmụ ebule iri na abụọ gbara otu afọ, otu afọ, tinyere ihe niile ha wetara maka aja mkpụrụ ọka. E ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie.
כל הבקר לעלה שנים עשר פרים אילם שנים עשר כבשים בני שנה שנים עשר--ומנחתם ושעירי עזים שנים עשר לחטאת
88 Anụ ụlọ niile e ji chụọ aja udo bụ, iri oke ehi abụọ na anọ, na iri ebule isii, na iri mkpi isii, na ụmụ ebule iri isii ndị gbara naanị otu afọ, otu afọ. Ndị a niile bụ onyinye e nyere maka ido ebe ịchụ aja nsọ nʼoge e tere ya mmanụ.
וכל בקר זבח השלמים עשרים וארבעה פרים אילם ששים עתדים ששים כבשים בני שנה ששים זאת חנכת המזבח אחרי המשח אתו
89 Mgbe Mosis banyere nʼụlọ ikwu ahụ ka ya na Onyenwe anyị kparịa ụka, ọ nụrụ olu ahụ ka ọ na-agwa ya okwu site nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ nʼelu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ gwa ya okwu. Nʼụzọ dị otu a ka Onyenwe anyị si gwa ya okwu.
ובבא משה אל אהל מועד לדבר אתו וישמע את הקול מדבר אליו מעל הכפרת אשר על ארן העדת מבין שני הכרבים וידבר אליו

< Ọnụọgụgụ 7 >