< Ọnụọgụgụ 33 >

1 Ndị a bụ usoro mbili ije ụmụ Izrel, site nʼoge ha hapụrụ Ijipt dịka ha si nọọ nʼigwe nʼigwe. Ọ bụ Mosis na Erọn duuru ha nʼije ndị a.
These are the journeys of the children of Israel, when they went forth out of the land of Egypt by their armies under the hand of Moses and Aaron.
2 Mosis, nʼonwe ya, dere usoro ije ha ndị a nʼakwụkwọ dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu.
Moses wrote their goings out according to their journeys by the commandment of Jehovah: and these are their journeys according to their goings out.
3 Ha biliri njem site na Ramesis, nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke mbụ, ụbọchị na-esota nke e mere Mmemme Ngabiga. Ha niile zọpụrụ ije nʼatụghị egwu nʼihu ndị Ijipt,
They traveled from Rameses in the first month, on the fifteenth day of the first month; on the next day after the Passover the children of Israel went out triumphantly in the sight of all the Egyptians,
4 mgbe ndị ha nọ na-eli ụmụ ha niile ndị e buru ụzọ mụọ, bụ ndị Onyenwe anyị tigburu nʼetiti ha nʼihi na Onyenwe anyị kpere chi ha niile ikpe.
while the Egyptians were burying all their firstborn, whom Jehovah had struck among them: on their gods also Jehovah executed judgments.
5 Ndị Izrel hapụrụ Ramesis, bịa maa ụlọ ikwu ha na Sukọt.
The children of Israel traveled from Rameses, and camped in Succoth.
6 Ha hapụrụ Sukọt bịaruo Etam, nke dị nʼọnụ ọnụ ọzara ahụ.
They traveled from Succoth, and camped in Etham, which is in the edge of the wilderness.
7 Ha hapụrụ Etam laghachi azụ gaa Pi Hahirot, nke dị nso nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Baal-Zefọn, ebe ha manyere ụlọ ikwu ha na ndịda ugwu Migdol.
They traveled from Etham, and turned back to Pihahiroth, which is before Baal Zephon: and they camped before Migdol.
8 Mgbe ha hapụrụ Pi Hahirot, ha sitere nʼetiti Osimiri Uhie gafee gaa ije ụbọchị atọ bata nʼọzara Etam. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mara.
They traveled from before Hahiroth, and passed through the midst of the sea into the wilderness: and they went three days' journey in the wilderness of Etham, and camped in Marah.
9 Mgbe ha hapụrụ Mara, ha batara Elim, ebe e nwere mmiri iri na abụọ si nʼala na-asọpụta, na iri osisi nkwụ asaa. Ha nọrọ ọdụ dị ukwuu nʼebe a.
They traveled from Marah, and came to Elim: and in Elim were twelve springs of water, and seventy palm trees; and they camped there.
10 Mgbe ha hapụrụ Elim, ha wuru ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Osimiri Uhie.
They traveled from Elim, and camped by the Red Sea.
11 Emesịa, ha hapụrụ Osimiri Uhie gaa maa ụlọ ikwu ha nʼọzara a na-akpọ Sin.
They traveled from the Red Sea, and camped in the wilderness of Sin.
12 Ha hapụrụ ọzara Sin gaa maa ụlọ ikwu ha na Dofka.
They traveled from the wilderness of Sin, and camped in Dophkah.
13 Emesịa, ha hapụrụ Dofka bịaruo Alush maa ụlọ ikwu ha.
They traveled from Dophkah, and camped in Alush.
14 Mgbe ha hapụrụ Alush, ha rutere Refidim, ebe ndị Izrel na-ahụghị mmiri ọṅụṅụ.
They traveled from Alush, and camped in Rephidim, where there was no water for the people to drink.
15 Ha hapụrụ Refidim bịaruo nʼọzara Saịnaị ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Rephidim, and camped in the wilderness of Sinai.
16 Ha hapụrụ ọzara Saịnaị bịaruo Kibrọt Hataava ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from the wilderness of Sinai, and camped in Kibroth Hattaavah.
17 Ha hapụrụ Kibrọt Hataava bịaruo Hazerọt ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Kibroth Hattaavah, and camped in Hazeroth.
18 Ha hapụrụ Hazerọt bịaruo Ritma ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Hazeroth, and camped in Rithmah.
19 Ha hapụrụ Ritma bịaruo Rimon-Perez ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Rithmah, and camped in Rimmon Perez.
20 Ha hapụrụ Rimon-Perez bịaruo Libna ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Rimmon Perez, and camped in Libnah.
21 Ha hapụrụ Libna bịaruo Rissa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Libnah, and camped in Rissah.
22 Ha hapụrụ Rissa bịaruo Kehelata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Rissah, and camped in Kehelathah.
23 Ha hapụrụ Kehelata bịaruo nʼugwu Shefa ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Kehelathah, and camped in Mount Shepher.
24 Ha hapụrụ ugwu Shefa bịaruo Harada ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Mount Shepher, and camped in Haradah.
25 Ha hapụrụ Harada bịaruo Makhelot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Haradah, and camped in Makheloth.
26 Ha hapụrụ Makhelot bịaruo Tahat ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Makheloth, and camped in Tahath.
27 Ha hapụrụ Tahat bịaruo Tera ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Tahath, and camped in Terah.
28 Ha hapụrụ Tera bịaruo Mitka ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Terah, and camped in Mithkah.
29 Ha hapụrụ Mitka bịaruo Hashmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Mithkah, and camped in Hashmonah.
30 Ha hapụrụ Hashmona bịaruo Moserot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Hashmonah, and camped in Moseroth.
31 Ha hapụrụ Moserot bịaruo Bene Jaakan ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Moseroth, and camped in Bene Jaakan.
32 Ha hapụrụ Bene Jaakan bịaruo Họ Hagịdgad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Bene Jaakan, and camped in Hor Haggidgad.
33 Ha hapụrụ Họ Hagịdgad bịaruo Jotbata ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Hor Haggidgad, and camped in Jotbathah.
34 Ha hapụrụ Jotbata bịaruo Abrona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Jotbathah, and camped in Abronah.
35 Ha hapụrụ Abrona bịaruo Eziọn Geba ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Abronah, and camped in Ezion Geber.
36 Ha hapụrụ Eziọn Geba bịa maa ụlọ ikwu ha na Kadesh, nke dị nʼọzara Zin.
They traveled from Ezion Geber, and camped in the wilderness of Zin (that is, Kadesh).
37 Ha hapụrụ Kadesh bịa maa ụlọ ikwu ha nʼugwu Hor nʼoke ala ndị Edọm.
They traveled from Kadesh, and camped in Mount Hor, in the edge of the land of Edom.
38 Erọn, bụ onye nchụaja gbagoro nʼugwu Hor site nʼiwu Onyenwe anyị. Nʼebe ọ nọ nwụọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa nke ise, nʼafọ nke iri anọ site na mgbe ụmụ Izrel si Ijipt pụta.
Aaron the priest went up into Mount Hor at the commandment of Jehovah, and died there, in the fortieth year after the children of Israel had come out of the land of Egypt, in the fifth month, on the first day of the month.
39 Erọn gbara narị afọ na iri afọ abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ nʼugwu Hor.
Aaron was one hundred twenty-three years old when he died in Mount Hor.
40 Onye Kenan bụ eze Arad, onye bi na Negev nʼime ala Kenan, nụrụ na ndị Izrel na-abịa.
The Canaanite, the king of Arad, who lived in the Negev in the land of Canaan, heard of the coming of the children of Israel.
41 Ha hapụrụ ugwu Hor bịaruo Zalmona ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Mount Hor, and camped in Zalmonah.
42 Ha hapụrụ Zalmona bịaruo Punon ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Zalmonah, and camped in Punon.
43 Ha hapụrụ Punon bịaruo Obot ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Punon, and camped in Oboth.
44 Ha hapụrụ Obot bịaruo Iye Abarim, nʼoke ala ndị Moab.
They traveled from Oboth, and camped in Iye Abarim, in the border of Moab.
45 Ha hapụrụ Iye Abarim bịaruo Dibọn Gad ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Iyim, and camped in Dibon Gad.
46 Ha hapụrụ Dibọn Gad bịaruo Almon Diblataim ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Dibon Gad, and camped in Almon Diblathaim.
47 Ha hapụrụ Almon Diblataim bịaruo nʼugwu Abarim nke dị nso na Nebo ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from Almon Diblathaim, and camped in the mountains of Abarim, before Nebo.
48 Ha hapụrụ ugwu Abarim bata nʼobosara ala Moab nʼakụkụ osimiri Jọdan, na ncherita ihu Jeriko, ebe ha mara ụlọ ikwu ha.
They traveled from the mountains of Abarim, and camped in the plains of Moab by the Jordan at Jericho.
49 Mgbe ha nọ nʼebe a, ha manyere ụlọ ikwu ha nʼebe dị iche iche nʼakụkụ osimiri Jọdan, site na Bet-Jeshimọt rute rịị ebe a na-akpọ Ebel-Shitim, nʼobosara ala Moab.
They camped by the Jordan, from Beth Jeshimoth even to Abel Shittim in the plains of Moab.
50 Nʼobosara ala Moab, nʼakụkụ Jọdan, na ncherita ihu Jeriko ka Onyenwe anyị nọ gwa Mosis okwu sị ya,
Jehovah spoke to Moses in the plains of Moab by the Jordan at Jericho, saying,
51 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe unu gafere osimiri Jọdan banye nʼala Kenan,
Speak to the children of Israel, and tell them, "When you pass over the Jordan into the land of Canaan,
52 unu aghaghị ịchụpụ ndị niile bi nʼebe ahụ ma bibie chi niile ha na-efe, ndị ha ji nkume tụọ na ndị ha kpụrụ akpụ. Unu ga-ebibikwa ebe niile dị nʼelu ugwu niile, ebe ha na-anọ efe arụsị ha niile ofufe.
then you shall drive out all the inhabitants of the land from before you, destroy all their stone idols, destroy all their molten images, and demolish all their high places.
53 Nwetanụ ala ahụ, birikwa nʼime ya, nʼihi na enyela m unu ala ahụ ka unu nwere ya.
You shall take possession of the land, and dwell in it; for I have given the land to you to possess it.
54 Unu ga-eke ala ahụ site nʼife nza, dịka agbụrụ unu niile si dị. Ndị bara ụba nye ha ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole nye ha ihe nketa dị nta. Ihe ọ bụla ruuru agbụrụ ọbụla site nʼife nza ga-abụ nke ha. Kee ya dịka ebo nna nna unu ha si dị.
You shall inherit the land by lot according to your families; to the more you shall give the more inheritance, and to the fewer you shall give the less inheritance: wherever the lot falls to any man, that shall be his. You shall inherit according to the tribes of your fathers.
55 “‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị niile bi nʼala ahụ, ndị unu hapụrụ ga-abụrụ unu iberibe unyi nʼanya unu. Ha ga-adịkwara unu ka ogwu nke ga-adụkasị unu ahụ. Ha ga-enye unu nsogbu nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya.
"But if you do not drive out the inhabitants of the land from before you, then those you let remain of them will be as pricks in your eyes and as thorns in your sides, and they will harass you in the land in which you dwell.
56 Mgbe ahụ kwa, aga m emeso unu ụdị mmeso ahụ m na-akwado imeso ha ugbu a.’”
It shall happen that as I thought to do to them, so will I do to you."

< Ọnụọgụgụ 33 >