< Levitikọs 14 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis, sị,
Og Herren talte til Moses og sa:
2 “Ndị a bụ usoro iwu gbasara onye ọrịa ekpenta nʼoge a na-eme mmemme ịdị ọcha ya, mgbe e dutere ya bịakwute onye nchụaja.
Dette er loven om den spedalske, når han skal renses: Han skal føres til presten;
3 Onye nchụaja ga-apụ gaa nʼazụ ebe obibi nọdụ nʼebe ahụ lee ya ahụ, ịchọpụta ma ọrịa ekpenta ya ọ laala nʼezie. Ọ bụrụ na ọrịa ya alaala,
og presten skal gå utenfor leiren, og når da presten ser på ham og finner at han er helbredet for sin spedalskhet,
4 onye nchụaja ga-enye iwu ka e weta nnụnụ abụọ dị ndụ, na ụfọdụ osisi sida, na eriri ogho uhie, na hisọp, maka onye ahụ a ga-emere mmemme ịdị ọcha.
da skal presten befale at det for den som lar sig rense, skal tas to levende rene fugler og sedertre og karmosinrød ull og isop,
5 Onye nchụaja ga-enye iwu ka e gbuo otu nʼime nnụnụ abụọ ahụ nʼelu mmiri e si nʼọdọ mmiri na-asọ asọ kute nke dị nʼime ite aja.
og la dem slakte den ene fugl over et lerkar som er fylt med rinnende vann.
6 Ọ ga-ewere nnụnụ nke ọzọ dị ndụ, ya na osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na hisọp ahụ, denye ha nʼime ọbara nnụnụ ahụ e gburu nʼelu mmiri ahụ.
Så skal han ta den levende fugl og sedertreet og den karmosinrøde ull og isopen og dyppe dem sammen med den levende fugl i blodet av den fugl som er slaktet over det rinnende vann,
7 Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-efe ọbara ahụ ugboro asaa nʼahụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha site nʼọrịa ekpenta. Ọ ga-ekwupụtakwa na a gwọọla onye ahụ. Emesịa, ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ ka o felaa nʼọhịa.
og sprenge syv ganger på den som lar sig rense for spedalskhet, og således rense ham, og den levende fugl skal han la flyve sin vei bortover marken.
8 “Onye ahụ e mere ka ọ dị ọcha ga-asacha uwe ya, kpụchaa ntutu isi ya, saakwa ahụ ya. Mgbe ahụ, ọ ga-adị ọcha. Emesịa, ọ ga-esoro ndị mmadụ biri nʼobodo. Ma ọ gaghị abanye nʼụlọ nke aka ya tutu ụbọchị asaa agafee.
Og den som lar sig rense, skal tvette sine klær og rake av alt sitt hår og bade sig i vann, så er han ren, og derefter kan han gå inn i leiren; men han skal holde sig utenfor sitt telt i syv dager.
9 Nʼụbọchị nke asaa, ọ ga-akpụchapụ ntutu isi ya, na afụọnụ ya, na ikuanya ya, na ajị ndị ọzọ dị ya nʼahụ. Ọ ga-asa uwe ya na ahụ ya niile. Mgbe ahụ, a ga-agụ ya nʼonye dị ọcha.
Den syvende dag skal han rake av alt sitt hår, både sitt hodehår og sitt skjegg og sine øienbryn - alt sitt hår skal han rake av, og han skal tvette sine klær og bade sitt legeme i vann, så er han ren.
10 “Nʼụbọchị nke asatọ, ọ ga-ewere ebule abụọ na-enweghị ntụpọ, na otu nne atụrụ nke na-enweghị ntụpọ gbara otu afọ, ya na iri iko ọka a kwọrọ nke ọma a gwakọtara mmanụ oliv maka aja mkpụrụ ọka, na otu iko mmanụ.
Den åttende dag skal han ta to værlam uten lyte og et årsgammelt hunlam uten lyte og til matoffer tre tiendedeler av en efa fint mel, blandet med olje, og så en log olje.
11 Onye nchụaja ahụ lere ya ahụ sị na ha dị ọcha, ga-ewere aja ndị a, ha na onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha chee nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute.
Og presten som forestår renselsen, skal stille den mann som lar sig rense, og de ting han skal ofre, frem for Herrens åsyn, ved inngangen til sammenkomstens telt.
12 “Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-ewere otu nʼime ụmụ ebule ahụ, na otu iko mmanụ chụọ ya dịka onyinye aja ikpe ọmụma. Ọ ga-efufe ha nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mfufe.
Så skal presten ta det ene værlam og bære det frem til skyldoffer sammen med den tilhørende log olje, og han skal svinge dem for Herrens åsyn.
13 Ọ ga-egbu nwa ebule ahụ nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, nʼebe a na-anọ egbu anụ aja mmehie na aja nsure ọkụ. Ọ bụ onye nchụaja ga-ewere anụ aja ikpe ọmụma a, dịka o were nke aja mmehie. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị nsọ.
Værlammet skal slaktes på det sted hvor syndofferet og brennofferet blir slaktet, på det hellige sted; for likesom syndofferet, således hører også skyldofferet presten til, det er høihellig.
14 Onye nchụaja ahụ ga-ewere ụfọdụ nʼime ọbara aja ikpe ọmụma ahụ, tee nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Ọ ga-etekwa ya nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼelu isi mkpụrụ ụkwụ nke ụkwụ aka nri ya.
Så skal presten ta av skyldofferets blod og stryke på den høire ørelapp på den som lar sig rense, og på hans høire tommelfinger og på hans høire stortå.
15 Emesịa onye nchụaja ga-awụnyetụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
Og presten skal ta av den tilhørende log olje og helle i sin venstre hånd
16 ọ ga-arụnye otu mkpịsịaka nri ya nʼime mmanụ dị nʼọbụaka ya, ọ ga-ewere mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ nʼime ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
og så dyppe sin høire pekefinger i oljen som han har i sin venstre hånd, og sprenge av oljen med sin finger syv ganger for Herrens åsyn.
17 Onye nchụaja ga-ewere mmanụ ahụ fọdụrụ nʼọbụaka ya tee ya onye ahụ nʼọnụ ntị aka nri nke onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya, nʼelu ọbara aja ikpe ọmụma ahụ mee.
Og av resten av oljen som er i hans hånd, skal presten stryke noget på den høire ørelapp på den som lar sig rense, og på hans høire tommelfinger og på hans høire stortå, ovenpå blodet av skyldofferet.
18 Ọ ga-ete mmanụ ahụ fọdụrụ nʼaka ya, nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha. Onye nchụaja ga-ekpuchikwara ha mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị.
Og det som enda er tilovers av oljen som presten har i sin hånd, skal han helle på hodet på den som lar sig rense. Og således skal presten gjøre soning for ham for Herrens åsyn.
19 “Mgbe ahụ, onye nchụaja ga-achụ aja mmehie, kpuchiere onye ahụ a ga-eme ka ọ dị ọcha site na-adịghị ọcha ha mmehie ya. Emesịa, onye nchụaja ga-egbu aja nsure ọkụ ahụ,
Så skal presten ofre syndofferet og gjøre soning for den som lar sig rense for sin urenhet; og derefter skal han slakte brennofferet.
20 were ya na onyinye mkpụrụ ọka chụọrọ onye ahụ aja, maka ikpuchiri ya mmehie ya. Mgbe ahụ, a ga-agụ onye ahụ nʼonye dị ọcha.
Og presten skal ofre brennofferet og matofferet på alteret og således gjøre soning for ham, så er han ren.
21 “Ọ bụrụ na ọ bụ ogbenye onye na-enweghị ike iweta ihe ndị a, ha aghaghị iwere otu nwa ebule dịka aja ikpe ọmụma nke a ga-efufe nʼihi aja ikpuchi mmehie ha, Ọ ga-ewetakwa iko ọka a kwọrọ nke ọma asaa maọbụ ihe ọtụtụ efaa a gwara mmanụ oliv dịka aja mkpụrụ ọka, ya na otu iko mmanụ.
Men er det en fattig mann, som ikke har råd til så meget, da skal han ta et værlam til skyldoffer - det skal svinges til soning for ham - og en tiendedel av en efa fint mel, blandet med olje, til matoffer, og en log olje
22 Ọ ga-ewetakwa nduru abụọ maọbụ kpalakwukwu abụọ, nke ọbụla o nwere ike iweta. Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
og to turtelduer eller to dueunger, efter som han har råd til; den ene skal være til syndoffer, og den andre til brennoffer.
23 “Ọ ga-ewere ha nye onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute nʼihu Onyenwe anyị, nʼụbọchị nke asatọ ya, maka ime ka ha dị ọcha.
På den åttende dag av sin renselse skal han bære dette frem til presten, til inngangen til sammenkomstens telt, for Herrens åsyn.
24 Onye nchụaja ga-ewerekwa nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, ya na otu iko mmanụ oliv ahụ, fufee ha nʼihu ebe ịchụ aja nye Onyenwe anyị.
Og presten skal ta skyldofferlammet og den tilhørende log olje og svinge dem for Herrens åsyn.
25 Ọ ga-egbu nwa atụrụ aja ikpe ọmụma ahụ, were ụfọdụ ọbara ya tee nʼọnụ ntị aka nri onye ahụ a na-aga ime ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
Og de skal slakte skyldofferlammet, og presten skal ta av skyldofferets blod og stryke på den høire ørelapp på den som lar sig rense, og på hans høire tommelfinger og på hans høire stortå.
26 Onye nchụaja ahụ ga-awụnye ụfọdụ mmanụ oliv ahụ nʼọbụaka nke aka ekpe ya,
Så skal presten helle av oljen i sin venstre hånd,
27 ọ ga-ewere mkpịsịaka nri ya fesa ụfọdụ mmanụ ahụ nke dị nʼọbụaka ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.
og med sin høire pekefinger skal han sprenge syv ganger for Herrens åsyn av oljen som han har i sin venstre hånd.
28 Ọ ga-etekwa ụfọdụ mmanụ ahụ dị nʼaka ya nʼebe ndị ahụ o tere ọbara ikpe ọmụma ahụ, nke bụ nʼọnụ ntị onye ahụ nke a na-eme ka ọ dị ọcha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya.
Så skal presten stryke noget av oljen som han har i sin hånd, på den høire ørelapp på den som lar sig rense, og på hans høire tommelfinger og på hans høire stortå, ovenpå det sted hvor blodet av skyldofferet er.
29 Mmanụ nke fọdụrụ nʼaka ya ka onye nchụaja ga-ete nʼisi onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha, ikpuchi mmehie ha nʼihu Onyenwe anyị.
Og det som enda er tilovers av oljen som presten har i sin hånd, skal han helle på hodet på den som lar sig rense, for å gjøre soning for ham for Herrens åsyn.
30 Emesịa, ọ ga-eji nduru abụọ ahụ maọbụ kpalakwukwu abụọ ahụ, nke ọbụla o nwere ike iweta, chụọ aja.
Så skal han ofre den ene av turtelduene eller av dueungene - det som han har råd til -
31 Otu ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ, ha na aja mkpụrụ ọka. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-ekpuchiri ya mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, bụ onye ahụ a na-eme ka ọ dị ọcha.”
som syndoffer og den andre som brennoffer sammen med matofferet; og presten skal gjøre soning for den som lar sig rense, for Herrens åsyn.
32 Ndị a bụ usoro iwu dịrị onye ọbụla e sitere nʼọrịa ekpenta mee ka ọ dị ọcha, onye aka ya na-erughị iweta ihe o kwesiri iweta, bụ nke e ji eme ka ọ dị ọcha.
Dette er loven om den som lider av spedalskhet, men ikke har råd til å ofre meget når han skal renses.
33 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
Og Herren talte til Moses og Aron og sa:
34 “Mgbe unu banyere ala Kenan, bụ ala ahụ m na-enye unu, ọ bụrụ na o nwee ụlọ ọbụla m webatara ọrịa na-efe efe,
Når I kommer inn i Kana'ans land, som jeg gir eder til eiendom, og jeg lar spedalskhet komme på noget hus i det land I får i eie,
35 onyenwe ụlọ ahụ ga-ejekwuru onye nchụaja sị ya, ‘Ahụla m ihe yiri ọrịa na-efe efe nʼụlọ m.’
da skal den som eier huset, gå og melde det til presten og si: Det ser ut for mig som det er kommet spedalskhet på huset.
36 Onye nchụaja ahụ ga-enye iwu ka a kwapụsịa ihe niile dị nʼụlọ ahụ tupu ọ gaa lezie ụlọ ahụ anya, ka ihe niile dị nʼụlọ ahụ ghara ịbụ ihe rụrụ arụ, ma ọ bụrụ na achọpụta ọrịa na-efe efe nʼụlọ ahụ. Mgbe a kwapụtasịrị ihe dị nʼụlọ ahụ, onye nchụaja ga-aga lee ụlọ ahụ.
Så skal presten la huset rydde, før han selv kommer for å se på flekkene, så ikke alt det som er i huset, skal bli urent; og derefter skal han komme og se på huset.
37 Ọ ga-ele ntụpọ dị nʼahụ ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ, maọbụ ọbara ọbara, ọ bụrụkwa na ha miri emi karịa aja ụlọ ahụ nʼile anya,
Dersom han da, når han ser på flekkene, finner at flekkene på husets vegger viser sig som grønnlige eller rødlige fordypninger som synes å ligge dypere enn veggen,
38 onye nchụaja ga-esi nʼọnụ ụzọ ụlọ ahụ pụọ, kpọchie ụlọ ahụ ụbọchị asaa.
da skal han gå ut av huset til husets dør, og han skal stenge huset og holde det tillåst i syv dager.
39 Nʼụbọchị nke asaa, onye nchụaja ga-alọghachi bịa lee ụlọ ahụ ọzọ. Ọ bụrụ na ntụpọ ahụ agbasaala nʼaja ụlọ ahụ,
Den syvende dag skal presten komme igjen, og når han da ser på det og finner at flekkene har bredt sig ut på husets vegger,
40 onye nchụaja ga-enye iwu ka e tida akụkụ aja ụlọ ahụ bufuo ya nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
da skal han la de stener som flekkene er på, brytes ut og kastes utenfor byen, på et urent sted.
41 Ọ ga-enyekwa iwu ka a kpụchaa aja ụlọ niile dị nʼime ụlọ ahụ, bufukwaa aja niile a kpụchapụtara nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
Derefter skal huset skrapes innvendig rundt omkring, og det støv som er skrapet av, skal kastes utenfor byen, på et urent sted.
42 A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ.
Så skal de ta andre stener og sette dem inn istedenfor de gamle stener, og de skal ta nytt ler og overstryke huset med.
43 “Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya,
Bryter flekkene ut igjen på huset efterat stenene er tatt ut og huset skrapet og overstrøket,
44 onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe.
da skal presten komme og se på det, og dersom han da finner at flekkene har bredt sig ut på huset, da er det ondartet spedalskhet på huset; det er urent.
45 Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo.
Og da skal de rive huset ned, både stener og treverket og alt leret, og føre det utenfor byen, til et urent sted.
46 “Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi.
Den som går inn i huset i hele den tid det holdes tillåst, skal være uren til om aftenen,
47 Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya.
og den som ligger i huset, skal tvette sine klær, og den som eter i huset, skal tvette sine klær.
48 “Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala.
Men dersom presten, når han kommer og ser på det, finner at flekkene ikke har bredt sig ut på huset efterat det er blitt overstrøket, da skal han si huset rent; for da er ondet borte.
49 Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha.
Så skal han, forat huset kan bli renset, ta to fugler og sedertre og karmosinrød ull og isop.
50 Ọ ga-egbu otu nʼime nnụnụ ndị ahụ nʼelu mmiri e si nʼiyi na-asọ asọ kute, nke dị nʼime ite aja.
Den ene fugl skal han slakte over et lerkar som er fylt med rinnende vann,
51 Ọ ga-edenye osisi sida ahụ, na ogho uhie ahụ, na osisi hisọp ahụ, nʼime ọbara nnụnụ ahụ na mmiri ahụ. Ọ ga-efesa ọbara ahụ nʼụlọ ahụ ugboro asaa.
og så skal han ta sedertreet og isopen og den karmosinrøde ull og den levende fugl og dyppe dem i blodet av den fugl som er slaktet, og i det rinnende vann og sprenge på huset syv ganger.
52 Ọ bụ ọbara nnụnụ ahụ, na mmiri ahụ, na nnụnụ nke ọzọ ahụ dị ndụ, na osisi sida ahụ na hisọp ahụ, na ogho uhie ahụ ka ọ ga-eji mee ka ụlọ ahụ dị ọcha.
Og han skal rense huset med fuglens blod og med det rinnende vann og med den levende fugl og med sedertreet og med isopen og med den karmosinrøde ull
53 Ọ ga-ahapụ nnụnụ ahụ dị ndụ ka o fepụ felaa nʼọhịa dị nʼazụ obodo. Nke a ga-abụ otu e si kpuchiere ụlọ ahụ mmehie ya. Ọ ga-adịkwa ọcha.”
og så la den levende fugl flyve utenfor byen, bortover marken; således skal han gjøre soning for huset, så det blir rent.
54 Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta, na ọkọ,
Dette er loven om alle slags spedalskhet og om skurv
55 na ọrịa na-efe efe dị nʼuwe maọbụ nʼụlọ,
og om spedalskhet på klær og på hus
56 maọbụ etuto, maọbụ ntụpọ, maọbụ ọnya.
og om knuter i huden og om utslett og om lyse flekker på huden -
57 Iwu ndị a ga-enye aka ịmata ihe rụrụ arụ maọbụ ihe na-adịghị ọcha. Ndị a bụ usoro iwu metụtara ọrịa ekpenta na ọrịa na-efe efe.
til oplysning om når noget er urent, og når det er rent. Dette er loven om spedalskhet.

< Levitikọs 14 >