< Ndị Ikpe 2 >

1 Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere na Gilgal bịa Bokim gwa ndị Izrel okwu sị ha, “Mụ onwe m kpọpụtara unu site nʼIjipt, kpọbata unu nʼala a dịka m kwere nna unu ha na nkwa. Asịrị m, ‘Agaghị m ala azụ imezu ọgbụgba ndụ mụ na unu, 2 unu na ndị bi nʼobodo ahụ agbakwala ndụ ọbụla, kama unu ga-etitu ebe ịchụ aja ha.’ Ma unu erubeghị isi nʼokwu a, gịnị mere unu emeghị nke a? 3 Agwara m unu, na ‘agaghị m esite nʼihu unu chụpụ ha; ha ga-adịrị unu dịka ọnya nʼakụkụ niile, ebe chi niile ha ga-abụkwara unu ihe na-eweta ọnwụnwa.’” 4 Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ kwusiri okwu ndị a, ụmụ Izrel niile kwara akwa nke ukwuu. 5 Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Bokim. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ. 6 Mgbe Joshua zilagasịrị ndị Izrel niile, onye ọbụla nʼime ha gara nʼihe nketa ya, inweta ya, dịka ebo ọbụla dị nʼIzrel si dị. 7 Ndị Izrel fereOnyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, bụkwa ndị hụrụ ọrụ ukwuu niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel. 8 Ma Joshua, nwa Nun, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara otu narị afọ, na afọ iri. 9 E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, nʼobodo Timnat Heres, nʼala ugwu ugwu nke ebo Ifrem, nʼụzọ mgbago ugwu Gaash. 10 Emesịa, ọgbọ ahụ niile nwụrụ dịka ndị nna nna ha, ọgbọ ọzọ tolitere, ndị na-amaghị Onyenwe anyị maọbụ ihe ndị nke o mere nye ụmụ Izrel. 11 Mgbe ahụ, ndị Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị site nʼife Baal ofufe. 12 Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. 13 Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe. 14 Ya mere, Onyenwe anyị were iwe megide Izrel, rara ha nye nʼaka ndị ji aka ike pụnara ha ihe ha nwere. O weere ha resi ndị iro ha gbara ha gburugburu, bụ ndị ha enwekwaghị ike iguzogide. 15 Dịka ọ ṅụrụ ya nʼiyi nye ha, mgbe ọbụla ụmụ Izrel pụrụ ibu agha, aka Onyenwe anyị megidere ha ime ka ha bụrụ ndị e meriri emeri. Ọnọdụ ha jọrọ njọ nke ukwuu. 16 Nʼihi ọnọdụ ọjọọ a, Onyenwe anyị mere ka ndị ikpe sị nʼetiti ha pụta, ịnapụta ha site nʼaka ndị a ji ike na-apụnara ha ihe ha nwere. 17 Ma ụmụ Izrel egeghị ndị ikpe ahụ ntị, kama ha nọgidere na-akpọ isiala nye ma na-agbasokwa chi ndị ọzọ. Dịka nna nna ha na-emeghị, ha mere ngwangwa wezuga onwe ha site nʼụzọ Onyenwe anyị, bụrụ ndị na-enupu isi nʼebe iwu Onyenwe anyị dị. 18 Ma mgbe ọbụla Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel onye ikpe, ọ na-anọnyere onye ikpe ahụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Ọ na-esitekwa nʼaka onye ikpe a napụta ụmụ Izrel nʼaka ndị iro ha nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼahụ ụmụ Izrel, mgbe ha na-asụ ude, nʼihi mmegbu na mkpagbu niile ndị iro ha na-emegbu ha, ma na-akpagbukwa ha. 19 Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha. 20 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Izrel, ma sị, “Nʼihi na mba a emebiela ọgbụgba ndụ ahụ m nyere nna ha nʼiwu, jụkwa ige m ntị, 21 agaghị m achụpụkwa site nʼihu ha mba ndị ahụ Joshua hapụrụ mgbe ọ nwụrụ. 22 Aga m eji ha nwalee Izrel, ịchọpụta ma ha ga-elezi anya idebe ụzọ Onyenwe anyị, gaakwa ije nʼime ya dịka nna nna ha mere m.” 23 Onyenwe anyị hapụrụ mba ndị ahụ niile ka ha nọgide. Ọ chụpụghị ha ngwangwa site na inyefe ha nʼaka Joshua.

< Ndị Ikpe 2 >