< Jọn 1 >

1 Na mbụ okwu ahụ dịrịị, okwu ahụ na Chineke nọ, okwu ahụ bụkwa Chineke.
Ekuqaleni wayekhona uLizwi, njalo uLizwi wayeloNkulunkulu, njalo uLizwi wayenguNkulunkulu.
2 Ya na Chineke nọ site na mbụ.
Yena lo wayeloNkulunkulu ekuqaleni.
3 E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya.
Zonke izinto zenziwa ngaye, njalo ngaphandle kwakhe kakulalutho lolulodwa olwenziwayo lolo olwenziweyo.
4 Nʼime ya ka ndụ dịrịị, ndụ ahụ bụkwa ìhè nye mmadụ niile,
Impilo yayikuye, njalo impilo yayiyikukhanya kwabantu,
5 ìhè ahụ na-enwu nʼime ọchịchịrị, ma ọchịchịrị ahụ emenyụghị ya.
lokukhanya kukhanya emnyameni, kodwa ubumnyama kabukwemukelanga.
6 Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn.
Kwavela umuntu ethunywe nguNkulunkulu, obizo lakhe linguJohane;
7 Ọ bịara dị ka onye akaebe ịgba ama banyere ìhè ahụ, ka mmadụ niile site nʼaka ya kwere.
yena lo wezela ubufakazi, ukuze afakaze ngokukhanya, ukuze bonke bakholwe ngaye.
8 Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ, ọ bịara naanị ịgba akaebe banyere ìhè ahụ.
Yena wayengayisikho ukukhanya, kodwa ukuze afakaze ngokukhanya.
9 Ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ ọbụla ìhè na-abịa nʼime ụwa.
Kwakuyikukhanya okuqotho, okukhanyisa wonke umuntu oza emhlabeni.
10 Ọ bịara nʼụwa, ma ụwa bụ ihe e kere site nʼaka ya, ma ụwa amataghị onye ọ bụ.
Wayekhona emhlabeni, njalo umhlaba wenziwa ngaye, kodwa umhlaba kawumazanga.
11 Ọ bịakwutere ihe ndị ahụ bụ ndị nke ya, ma ndị ahụ bụ ndị nke ya anabataghị ya.
Weza kokwakhe, kodwa abakhe kabamemukelanga.
12 Ma ndị ahụ niile nabatara ya, ndị ahụ niile kweere nʼaha ya ka o nyere ike ịghọ ụmụ Chineke.
Kodwa bonke abamemukelayo, wabapha amandla okuthi babe ngabantwana bakaNkulunkulu, labo abakholwa ebizweni lakhe;
13 Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.
abazalwa kungeyisikho ngegazi, langentando yenyama, langentando yendoda, kodwa nguNkulunkulu.
14 Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ birikwa nʼetiti anyị. Anyị ahụla ebube ya, ebube nke onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ, onye si nʼebe Nna nọ bịa, onye jupụtara nʼamara na eziokwu.
ULizwi wasesiba yinyama, wahlala phakathi kwethu, njalo sabona inkazimulo yakhe, inkazimulo injengeyozelwe yedwa kaYise, egcwele umusa leqiniso.
15 Jọn gbara ama banyere ya mgbe ọ na-eti mkpu na-asị, “Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, ‘Onye na-abịa m nʼazụ dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’”
UJohane wafakaza ngaye, wamemeza wathi: Nguye lo ebengisitsho ngaye ukuthi: Lowo ozayo emva kwami uphambi kwami; ngoba wayekhona kuqala kulami.
16 Site nʼịba ụba nke amara ya, anyị niile anatala amara a tụkwasịrị nʼamara.
Lekugcwaleni kwakhe thina semukele sonke, futhi umusa ngomusa;
17 Nʼihi na e nyere iwu site nʼaka Mosis, ma amara na eziokwu bịara site nʼaka Jisọs Kraịst.
ngoba umlayo wanikwa ngoMozisi, umusa leqiniso kweza ngoJesu Kristu.
18 Ọ dịbeghị onye ọbụla hụrụla Chineke, ma Chineke, onye naanị ya bụ Ọkpara Nna mụrụ. Onye ya na Nna dị na mma, emeela ka anyị mata ya.
Kakho owake wabona uNkulunkulu; iNdodana ezelwe yodwa, esesifubeni sikaYise, yiyo emvezileyo.
19 Nke a bụ ịgba ama Jọn mgbe ndị ndu ndị Juu nọ na Jerusalem zipụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị ka ha bịa jụọ ya onye ọ bụ?
Njalo lobu yibufakazi bukaJohane, mhla amaJuda ethuma abapristi lamaLevi bevela eJerusalema ukuze bambuze ukuthi: Wena ungubani?
20 O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.”
Wasevuma, kaphikanga; futhi wavuma wathi: Kangisuye uKristu mina.
21 Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Ị bụkwanụ onye? Ị bụ Ịlaịja?” Ọ zara sị ha, “Abụghị m ya.” “Ị bụ Onye amụma ahụ?” “Mba.”
Bambuza futhi bathi: Kuyini pho? Wena unguElija yini? Wasesithi: Kangisuye. Wena ungulowomProfethi yini? Wasephendula wathi: Hatshi.
22 Ha sịrị ya, “Ị bụ onye? Nye anyị ọsịsa anyị ga-eweghachiri ndị zitere anyị. Gịnị ka i kwuru banyere onwe gị?”
Basebesithi kuye: Ungubani? Ukuze sibaphe impendulo abasithumileyo; uthini ngawe?
23 Ọ sịrị, dịka Aịzaya onye amụma kwuru, “Abụ m onye na-eti mkpu nʼime ọzara, ‘Meenụ ka ụzọ Onyenwe anyị guzozie.’”
Wathi: Mina ngiyilizwi lomemezayo enkangala: Lungisani indlela yeNkosi, njengoba uIsaya umprofethi watsho.
24 Ma ndị Farisii ahụ ezitere
Lalabo ababethunyiwe babevela kubaFarisi.
25 jụrụ ya, sị, “Gịnị mere i ji na-eme baptizim ọ bụrụ na ị bụghị Kraịst maọbụ Ịlaịja, maọbụ onye amụma ahụ?”
Basebembuza, bathi kuye: Ubhabhathizelani pho, uba wena ungeyisuye uKristu, loElija, lalowomProfethi?
26 Jọn zara ha sị, “Eji m mmiri na-eme baptizim, ma ọ dị otu onye nọ nʼetiti unu nke unu na-amaghị.
UJohane wabaphendula, wathi: Mina ngibhabhathiza ngamanzi; kodwa phakathi kwenu kumi, lina elingamaziyo;
27 Onye ahụ nke na-abịa nʼazụ m, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.”
nguye ozayo emva kwami, ophambi kwami, engingafanele mina ukuthukulula umchilo wenyathela lakhe.
28 Ihe a mere na Betani nʼofe osimiri Jọdan bụ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.
Lezizinto zenzeka eBethabara ngaphetsheya kweJordani, lapho uJohane ayebhabhathiza khona.
29 Nʼechi ya, ọ hụrụ ka Jisọs na-abịakwute ya sị, “Leekwa, Nwa Atụrụ Chineke, onye na-ebupụ mmehie ụwa.
Kusisa uJohane wabona uJesu esiza kuye, wathi: Khangelani iWundlu likaNkulunkulu, elisusa isono somhlaba.
30 Ọ bụ onye a ka m kwuru okwu ya mgbe ahụ m sịrị, ‘otu nwoke na-abịa nʼazụ m, onye dị ukwuu karịa m, nʼihi na o bukwa m ụzọ dịrị.’
Nguye lo mina ebengilitshela ngaye ukuthi: Emva kwami kuza indoda, eyayikhona phambi kwami, ngoba yayikhona kuqala kulami.
31 Mụ onwe m amataghị ya, ma a bịara m were mmiri na-eme baptizim nʼihi nke a, ka e kpughee ya nye ndị Izrel.”
Lami bengingamazi; kodwa ukuze abonakaliswe kuIsrayeli, ngalokho mina ngizile ngibhabhathiza ngamanzi.
32 Mgbe ahụ Jọn gbara ama a sị, “Ahụrụ m ka Mmụọ Nsọ sitere nʼeluigwe rịdata dị ka nduru, nọkwasị ya.
UJohane wasefakaza, esithi: Ngibonile uMoya esehla ezulwini njengejuba, wahlala phezu kwakhe.
33 Mụ onwe m amabughị ya, ma onye ahụ zitere m ka m jiri mmiri mee baptizim kwuru, ‘Onye ahụ ị ga-ahụ, onye Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị, ma nọgidekwa, ọ bụ ya ga-eji Mmụọ Nsọ mee baptizim.’
Lami bengingamazi; kodwa owangithumayo ukubhabhathiza ngamanzi, yena wathi kimi: Lowo ozabona uMoya esehlela phezu kwakhe ahlale kuye, nguye obhabhathiza ngoMoya oNgcwele.
34 Mụ onwe m ahụla ya, na-agbakwa ama na onye a bụ Ọkpara Chineke.”
Mina ngibonile, ngafakaza ukuthi lo uyiNdodana kaNkulunkulu.
35 Nʼechi ya, Jọn na mmadụ abụọ ndị na-eso ụzọ ya guzoro nʼebe ahụ ọzọ.
Kusisa futhi uJohane wayemi, lababili kubafundi bakhe;
36 Mgbe ọ hụrụ Jisọs ka ọ na-agafe, ọ sịrị, “Leenụ, Nwa Atụrụ Chineke.”
wasekhangela uJesu ehambahamba, wathi: Khangelani iWundlu likaNkulunkulu.
37 Mgbe mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha tụgharịrị soro Jisọs.
Abafundi ababili bamuzwa ekhuluma, basebemlandela uJesu.
38 Mgbe Jisọs tụgharịrị hụ ka ha na-eso ya, ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ?” Ha sịrị ya, “Rabbi” (nke pụtara “Onye ozizi”), “olee ebe i bi?”
Kwathi uJesu enyemukula ebabona belandela, wathi kubo: Lidingani? Basebesithi kuye: Rabi, (okuyikuthi ngokuphendulelwa, Mfundisi) uhlala ngaphi?
39 Ọ sịrị ha, “Bịanụ, unu ga-ahụ.” Ha sooro ya ga hụ ebe ọ na-anọ. Ha nọnyekwara ya ụbọchị ahụ niile. Ọ bụ nʼihe dị ka elekere anọ nke mgbede.
Wathi kubo: Wozani libone. Beza babona lapho ayehlala khona; bahlala laye ngalolosuku; kwakungaba lihola letshumi.
40 Otu nʼime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru, nke sooro ya bụ Andru nwanne Saimọn Pita.
UAndreya umfowabo kaSimoni Petro wayengomunye wababili ababekuzwe ngoJohane bamlandela.
41 Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst).
Yena wathola kuqala umfowabo uqobo uSimoni, wathi kuye: Simtholile uMesiya, okuphendulelwa ngokuthi, uKristu.
42 Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).
Wasemletha kuJesu. UJesu esemkhangele wathi: Wena unguSimoni indodana kaJona; uzathiwa nguKefasi, okuphendulelwa ngokuthi uPetro.
43 Nʼechi ya, o kpebiri ịga Galili. Mgbe ọ hụrụ Filip, ọ sịrị ya, “Soro m.”
Kusisa uJesu wayefuna ukusuka aye eGalili, wathola uFiliphu, wathi kuye: Ngilandela.
44 Filip bụ onye obodo Betsaida dị ka Andru na Pita.
UFiliphu-ke wayengoweBhethisayida, emzini wakibo kaAndreya loPetro.
45 Filip chọtara Nataniel sị ya, “Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef.”
UFiliphu wathola uNathaniyeli, wathi kuye: Simtholile lowo abhala ngaye uMozisi emlayweni labaprofethi, uJesu weNazaretha, indodana kaJosefa.
46 Nataniel sịrị ya, “Ihe ọma ọbụla ọ pụrụ i si na Nazaret pụta?” Ma Filip sịrị ya, “Bịa ka ị hụrụ.”
UNathaniyeli wasesithi kuye: Kambe kungavela okuhle eNazaretha? UFiliphu wathi kuye: Woza ubone.
47 Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, “Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya.”
UJesu wabona uNathaniyeli esiza kuye, wathi ngaye: Khangelani umIsrayeli uqobo, okungekho nkohliso kuye.
48 Nataniel sịrị ya, “Olee otu i si mata onye m bụ?” Jisọs sịrị ya, “Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka ị nọ nʼokpuru osisi fiig.”
UNathaniyeli wathi kuye: Ungazela ngaphi? UJesu waphendula wathi kuye: UFiliphu engakakubizi, ungaphansi komkhiwa, ngakubona.
49 Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.”
UNathaniyeli waphendula wathi kuye: Rabi, wena uyiNdodana kaNkulunkulu, wena uyiNkosi kaIsrayeli.
50 Jisọs zara sị ya, “I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? Ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a.”
UJesu waphendula wathi kuye: Uyakholwa ngoba ngithe kuwe, bengikubona ungaphansi komkhiwa. Uzabona izinto ezinkulu kulalezi.
51 Ọ sịkwara ya, “Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ.”
Wasesithi kuye: Ngiqinisile, ngiqinisile, ngithi kini: Kusukela khathesi lizabona izulu livulekile, lengilosi zikaNkulunkulu zisenyuka zisehla phezu kweNdodana yomuntu.

< Jọn 1 >