< Job 8 >

1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zaghachiri sị:
Then Bildad the Shuhite answered, and said,
2 “Ruo ole mgbe ka i ga na-ekwu okwu dị otu a? Okwu ọnụ gị bụ naanị ifufe dị ike.
How long will thou speak these things? And how long shall the words of thy mouth be like a mighty wind?
3 Chineke ọ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi? Onye pụrụ ime ihe niile ọ na-eme ka ihe ziri ezi gbagọọ agbagọ?
Does God pervert justice? Or does the Almighty pervert righteousness?
4 Mgbe ụmụ gị mehiere megide ya, o weere ha nyefee nʼikpe ọmụma kwesiri mmehie ha.
If thy sons have sinned against him, and he has delivered them into the hand of their transgression,
5 Ma ọ bụrụ na i ga-achọsi Chineke ike, rịọ Onye pụrụ ime ihe niile,
if thou would seek diligently to God, and make thy supplication to the Almighty,
6 ọ bụrụ na ị bụ onye dị ọcha nʼobi na onye ụzọ ya ziri ezi, ọ bụladị ugbu a, ọ ga-agbachitere gị weghachi gị nʼọnọdụ ịbụ ọgaranya gị.
if thou were pure and upright, surely now he would awake for thee, and make the habitation of thy righteousness prosperous.
7 Ọ bụ ezie, na mmalite gị nwere ike ịdị ala, ma ụbọchị ikpeazụ gị ga-adị elu.
And though thy beginning was small, yet thy latter end would greatly increase.
8 “Jụọ ọgbọ ndị gara aga ma chọpụta ihe ndị bụ nna ha chọpụtara.
For inquire, I pray thee, of the former age, and apply thyself to that which their fathers have searched out
9 Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ndị a mụrụ naanị ụnyaahụ, ndị ọ dịghị ihe ha maara. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dịka onyinyo.
(for we are but of yesterday, and know nothing, because our days upon earth are a shadow).
10 Ọ bụ na ha agaghị agwa gị ma kuziekwara gị ihe? Ọ bụ na ha agaghị esite na nghọta kwuo okwu?
Shall they not teach thee, and tell thee, and utter words out of their heart?
11 Ahịhịa papịrọs o nwere ike ito nʼebe apịtị na-adịghị? Ahịhịa riidi ọ ga-eto nʼebe mmiri na-adịghị?
Can the rush grow up without mire? Can a reed grow without water?
12 Nʼihi na mgbe ha ka na-etopụta etopụta, mgbe a na-egbubibeghị ha, ha na-ebu ahịhịa ndị ọzọ ụzọ kpọnwụọ.
While it is yet in its greenness, and not cut down, it withers before any other herb.
13 Nke a bụ oke ndị na-echefu Chineke, otu a kwa ka olileanya nke onye na-amaghị Chineke si ala nʼiyi.
So are the paths of all who forget God. And the hope of the profane man shall perish,
14 Ihe ọ tụkwasịrị obi bụ ihe na-awa awa; ihe mgbakwasị ụkwụ ya bụ akwụ udide.
whose confidence shall break apart, and whose trust is a spider's web.
15 Ọ bụrụ na ọ dabere na ya, ọ ga-etibi; ọ bụrụ na o jide ya aka, ọ ga-adọbikwa.
He shall lean upon his house, but it shall not stand. He shall hold fast thereby, but it shall not endure.
16 Ọ dị ka ahịhịa ubi a na-agba mmiri nke ọma nʼubi a gbara ogige, nke anwụ na-amụkwasị, nke ome ya na-awasa ruo akụkụ niile nke ogige ahụ.
He is green before the sun, and his shoots go forth over his garden.
17 Mgbọrọgwụ ya tụhịrị gburugburu nkume ndị dị nʼubi ahụ, ma na-achọkwa ọnọdụ nʼetiti nkume ndị a.
His roots are wrapped around the stone heap. He beholds the place of stones.
18 Ma mgbe e si nʼọnọdụ ya hopu ya, ebe ahụ na-agọnarịkwa ya, na-asị, ‘Ahụtụbeghị m gị.’
If he is destroyed from his place, then it shall deny him, saying, I have not seen thee.
19 Nʼezie, ndụ ya na-akpọnwụ, site nʼala ahụ ahịhịa ndị ọzọ na-etopụtakwa.
Behold, this is the joy of his way, and out of the earth others shall spring.
20 “Nʼezie Chineke anaghị agbakụta onye ụzọ ya ziri ezi azụ, maọbụ gbaa aka onye ajọ omume ume.
Behold, God will not cast away a perfect man, nor will he uphold the evildoers.
21 Ọ ga-eme ka ọnụ gị jupụta nʼọchị. Ọ ga-eme ka mkpu ọṅụ si nʼegbugbere ọnụ gị pụta.
He will yet fill thy mouth with laughter, and thy lips with shouting.
22 Ndị iro gị ka a ga-eyikwasị ihere dị ka uwe, ebe obibi nke ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa.”
Those who hate thee shall be clothed with shame, and the tent of the wicked shall be no more.

< Job 8 >