< Job 41 >

1 “Ị pụrụ iji nko azụ jide Leviatan maọbụ jiri ụdọ kegide ire ya bịada ya? 2 Ị pụrụ ikenye eriri nʼimi ya maọbụ were ngu igwe mapuo agba ya? 3 Ọ ga-arịọ gị arịrịọ ka i meere ya ebere? Ọ ga-eji olu dị nro gwa gị okwu? 4 Ọ ga-ekwe ka gị na ya baa nʼọgbụgba ndụ ka i were ya dịka ohu gị ogologo ndụ ya niile? 5 Ị ga-eji ya gwurie egwu dịka nnụnụ? Maọbụ kee ya eriri nye ya ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọ gị? 6 Ndị ahịa ha ga-eji ya zụọ ahịa? Ha ga-eke ya nʼetiti ndị mgbereahịa? 7 Ị pụrụ iji igwe nko mejuo akpụkpọ ahụ ya maọbụ iji ùbe ndị ọkụ azụ dupuo isi ya? 8 Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya aka, ị gaghị echefu ọgụ ọ ga-alụso gị. Ị gakwaghị anwa ya ọzọ. 9 Ọ bụ ime ihe nzuzu bụ mmadụ ịgbalị ijide ya. Naanị ilekwasị ya anya na-eyi egwu. 10 Nʼihi nke a, o nweghị onye nwere obi ike ịkpasu ya iwe. Ọ bụ onye pụrụ iguzogide m? 11 Olee onye m ji ụgwọ nke m na-aghaghị ịkwụ? Ihe niile dị nʼokpuru eluigwe bụ nke m. 12 “Agaghị m akwụsị ikwu ihe banyere ụkwụ na aka Leviatan, na ike ya, na ụdịdị ya mara mma. 13 Onye nwere ike ikpughepụ ihe e ji kpuchie ya ahụ? Onye nwekwara ike ịbanye nʼagba ya apịajiri okpukpu abụọ? 14 Onye pụrụ imeghe ụzọ nke ọnụ ya, nke eze dị oke egwu gbara gburugburu? 15 Azụ ya nwere ọta ndị e doro nʼusoro nke e mechisịrị ike ka ha rapara nʼahụ ibe ha, 16 nke ọbụla dị ibe ya nso, na ikuku enweghị ike gafee nʼetiti ha. 17 E jikọtara ha ọnụ nke ọma, ha na-ejisi onwe ha ike, enweghị ike ikewa ha. 18 Ìhè na-enwupụta mgbe ọbụla o zere uzere; anya ya abụọ na-achakwa dịka anwụ ụtụtụ. 19 Ire ọkụ na-asọpụta site nʼọnụ ya, icheku ọkụ na-ekepụtakwa nʼọnụ ya. 20 Anwụrụ ọkụ na-esi nʼimi ya na-apụta, dịka ukuru ọkụ nke na-esi nʼime mmiri na-agbọ nʼelu osisi achara. 21 Ume ọ na-ekupụta na-afụnwu ọkụ icheku. Ire ọkụ na-esitekwa nʼọnụ ya na-amapụ dịka àkụ. 22 Ike nwere ọnọdụ nʼolu ya, obi ịlọ mmiri na-aga ya nʼihu. 23 Akpụkpọ anụ ahụ ya bụ ihe jikọtara ọnụ nke ọma, ha siri ike na-apụghị inugharị ha. 24 Obi ya dị ike dịka nkume, dịka nkume e ji akwọ ihe. 25 Mgbe o bilitere ọtọ, ndị dike na-atụ oke ụjọ; ha na-alaghachi azụ nʼihi mmagharị ya. 26 O nweghị mma agha ọbụla pụrụ igbochi ya, o nwekwaghị ùbe igwe, maọbụ àkụ maọbụ ihe ọbụla a pịrị ọnụ ya apị nke pụrụ igbochi ya. 27 Nʼebe ọ nọ, igwe dị ka ahịhịa; bronz dịkwa ka osisi rere ure nʼebe ọ nọ. 28 Àkụ adịghị eme ka ọ gbalaga, ịtụ ya nkume dị ka ịtụ ya igbugbo ọka. 29 Mkpọrọ osisi na-adị ya ka ahịhịa ọka, ọ na-achị ọchị na mkpọtụ arụa na-eme. 30 Okpuru afọ ya dị ka ejuju dị nkọ, nke na-ahapụ ụzọ nʼapịtị dịka igwe eji azọcha mkpụrụ ọka site nʼogbe ya. 31 Ọ na-eme mmiri dị ogbu ka ọ gbọọ dịka ite; ọ na-akpagharị oke osimiri ka ọ dị ka mmanụ otite dị nʼite. 32 Ọ na-ahapụ ụfụfụ nʼazụ mgbe ọ na-aga; mmadụ ga-eche na ọ osimiri nwere isi awọ. 33 O nweghị ihe ọzọ dị nʼụwa yiri ya, o nweghị ihe na-emenye ya ụjọ. 34 Ọ na-eleda ndị mpako niile anya. Ọ bụkwa eze nʼebe ndị na-anya isi nọ.”

< Job 41 >