< Job 25 >

1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị: 2 “Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke; Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe. 3 Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ? Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị? 4 Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke? Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha? 5 Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta, ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya, 6 ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru, mmadụ, nke bụ naanị idide.”

< Job 25 >