< Job 18 >

1 Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị:
But Baldad the Suhite responded by saying:
2 “Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu? Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka.
How long will you throw around words? Understand first, and then let us speak.
3 Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa, gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị?
Why have we been treated like mules, as if we were unworthy before you?
4 Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị, a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị? Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha?
You, who ruins your own soul in your fury, will the earth be forsaken because of you, and will the cliffs be moved from their place?
5 “A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu; ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu,
Will not the light of the impious be put out, and the flame of his fire refuse to shine?
6 ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị, oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa.
Light will become darkness in his tabernacle, and the lamp that is over him will be extinguished.
7 Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya; atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala.
His strong steps will be constrained, and his own counsel will cast him down uncontrollably.
8 Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya; ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere.
For he has caused his own feet to go into a net, and he has walked into its web.
9 Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya, ọnya ahụ na-ejidesi ya ike.
His heel will be held in a snare, and thirst will rage against him.
10 E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala, ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya.
A trap has been hidden for him in the earth, and a decoy, along his path.
11 Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile, na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile.
Horrifying things will terrify him everywhere and will entangle his feet.
12 Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike; mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada.
Let his strength be diminished by famine, and let starvation invade his ribs.
13 Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya; ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile.
Let it devour the beauty of his skin; let the ancient death consume his arms.
14 Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile.
Let his confidence be torn away from his tabernacle, and let ruin trample over him like a king.
15 Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya; a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.
Let the companions of he who is not, dwell in his tabernacle; let brimstone rain down upon his tabernacle.
16 Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala, alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu.
Let his roots be dried up from beneath him, and his harvest be crushed from above.
17 A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ, o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya.
Let the memory of him perish from the earth, and let not his name be celebrated in the streets.
18 A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị, otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa.
He will expel him from light into darkness, and he will remove him from the world.
19 O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya, ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ.
Neither his offspring, nor his descendants, will exist among his people, nor will there be any remnants in his country.
20 Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya; oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya.
The last will be astonished at his day, and the first will be overcome with horror.
21 Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị, ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.”
And so, these are the tabernacles of the sinful, and this the place of he who does not know God.

< Job 18 >