< Job 10 >

1 “Ike ịdị ndụ agwụla m. Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi, kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị. 2 Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe, kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe. 3 Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m, si otu a leda ọrụ aka gị anya, mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu? 4 Ị nwere anya nke anụ ahụ? Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ? 5 Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ, ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike? 6 Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m ma nyochaa mmehie m? 7 Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m, na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị. 8 “Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m. Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m? 9 Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ. Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ? 10 Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ? 11 Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ, werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe? 12 I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị, nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m. 13 “Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị, amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche. 14 Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya, ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m. 15 Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m! A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu nʼihi na ejupụtara m nʼihere, bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m. 16 Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ ma werekwa ike gị dị egwu megide m. 17 I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m, mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ; ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri. 18 “Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m? Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m. 19 A sịkwarị na amụpụtaghị m maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili! 20 Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole? Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta, 21 tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ ebe m na-agaghị esi pụtakwa. 22 Nʼala nke oke ọchịchịrị, ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị, ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”

< Job 10 >