< Jeremaya 43 >

1 Mgbe Jeremaya gwasịrị ndị ahụ niile okwu ahụ Onyenwe anyị Chineke ha ziri ya ka o zie ha,
Kwasekusithi lapho uJeremiya eseqedile ukukhuluma kubo bonke abantu wonke amazwi eNkosi uNkulunkulu wabo, iNkosi uNkulunkulu wabo eyayimthume ngawo kibo, ngitsho wonke lamazwi;
2 Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,
wasekhuluma uAzariya indodana kaHoshaya, loJohanani indodana kaKareya, labo bonke abantu abazikhukhumezayo, besithi kuJeremiya: Uqamba amanga. INkosi uNkulunkulu wethu kayikuthumanga ukuze uthi: Lingayi eGibhithe ukuze lihlale njengabezizwe khona;
3 Kama ọ bụ Baruk nwa Neraya na-akwalị gị megide anyị, nʼihi na ọ chọrọ inyefe anyị nʼaka ndị Babilọn ka ha gbuo anyị, maọbụ buru anyị gaa Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha.”
kodwa uBharukhi indodana kaNeriya uyakukhuthaza emelene lathi, ukuze asinikele esandleni samaKhaladiya, ukuze asibulale, asithumbele eBhabhiloni.
4 Ya mere, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha ahụ niile, nakwa ndị mmadụ ahụ niile nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụụ ịnọgide nʼala Juda.
Ngakho uJohanani indodana kaKareya, lazo zonke induna zamabutho, labo bonke abantu, kabalilalelanga ilizwi leNkosi, ukuze bahlale elizweni lakoJuda.
5 Kama Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ, duuru ndị ahụ fọdụrụ na Juda pụọ, ha na ndị ahụ si na mba ndị ọzọ dị iche iche, ebe ha gbagara lọta.
Kodwa uJohanani indodana kaKareya lazo zonke induna zamabutho bathatha yonke insali yakoJuda eyayibuyele ivela kuzo zonke izizwe lapho ababexotshelwe khona, ukuhlala elizweni lakoJuda;
6 Ha duuru ndị ikom niile na ndị inyom niile na ụmụntakịrị niile, na ụmụ ndị inyom eze niile, bụ ndị ahụ Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze Babilọn tinyere na nlekọta Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan na Jeremaya onye amụma na Baruk nwa Neraya.
amadoda, labafazi, labantwana, lamadodakazi enkosi, laye wonke umuntu uNebuzaradani induna yabalindi ayebatshiye kuGedaliya indodana kaAhikhamu indodana kaShafani, loJeremiya umprofethi, loBharukhi indodana kaNeriya.
7 Ya mere, ha nupuru isi nʼebe Onyenwe anyị nọ site nʼịbanye ala Ijipt. Ha jegidere ije ruo nʼobodo Tapanhis.
Basebengena elizweni leGibhithe, ngoba kabalilalelanga ilizwi leNkosi; basebefika eThahaphanesi.
8 Mgbe ha nọ na Tapanhis, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
Laselifika ilizwi leNkosi kuJeremiya eThahaphanesi lisithi:
9 “Mgbe ndị Juu nọ na-ele gị anya, chịrị ụfọdụ nkume buru ibu nʼaka gị, gaa zoo ha nʼime ụrọ dị na mpụta ihu ụlọ e ji aja ụrọ wuo, nke dị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ Fero dị na Tapanhis.
Thatha esandleni sakho amatshe amakhulu, uwafihle ebumbeni ewondweni, esekungeneni kwendlu kaFaro eThahaphanesi, emehlweni amadoda angamaJuda,
10 Mgbe ahụ sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel sịrị, Aga m ezi ozi kpọta ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn. Aga m edokwasịkwa ocheeze ya nʼelu nkume ndị a m zoro nʼebe a, ọ ga-agbasa ụlọ ndo nke ịbụ eze ya nʼelu ha.
uthi kiwo: Itsho njalo iNkosi yamabandla, uNkulunkulu kaIsrayeli: Khangelani, ngizathuma ngilande uNebhukadirezari inkosi yeBhabhiloni inceku yami, ngifake isihlalo sakhe sobukhosi phezu kwalamatshe engiwafihlileyo, endlale ithente lakhe lesikhosini phezu kwawo.
11 Ọ ga-abịa buso Ijipt agha, si otu a mee ka ha nwụọ, bụ ndị ahụ a kwadobere maka ọnwụ, mee ka a dọta ha nʼagha, bụ ndị ahụ a kwadobere na-aga adọta nʼagha; mekwaa ka ha nwụọ site na mma agha bụ ndị ahụ a kwadobere na ha ga-anwụ site na mma agha.
Eze atshaye ilizwe leGibhithe; labo abokufa ekufeni, lalabo abokuthunjwa ekuthunjweni, lalabo abenkemba enkembeni.
12 Ọ ga-esunyekwa ọkụ nʼụlọ ebe a nọ na-efe chi niile nke ndị Ijipt. Ọ ga-esure ụlọ ndị a ọkụ, dọtakwa chi ha niile nʼagha. Dịka onye ọzụzụ atụrụ si ewepụcha igwu site na uwe ya, ọ ga-esikwa otu a wezuga onwe ya nʼudo site nʼIjipt pụọ.
Ngiphembe umlilo ezindlini zabonkulunkulu beGibhithe, abatshise, abathumbe, azithandele ngelizwe leGibhithe njengomelusi ezithandela ngesigqoko sakhe, aphume khona ngokuthula.
13 Nʼime ụlọnsọ anyanwụ dị nʼIjipt, ka ọ ga-akwatu ogidi nsọ niile, surekwaa ụlọnsọ niile nke chi dị iche iche nʼIjipt ọkụ.’”
Njalo uzakwephula insika zeBetshemeshi eziyizithombe eziselizweni leGibhithe, atshise ngomlilo izindlu zabonkulunkulu beGibhithe.

< Jeremaya 43 >