< Jeremaya 41 >

1 Nʼọnwa nke asaa, Ishmel nwa Netanaya, nwa Elishama, onye si nʼagbụrụ eze, na onye naara abụ otu nʼime ndịisi ozi eze, duuru ndị ikom iri bịa nʼụlọ Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa. Mgbe Gedaliya soo ha niile na-eri nri,
And it came to pass in the seventh month, that Ishmael the son of Nethaniah the son of Elishama, of the royal seed, and [one] of the king's chief men, and ten men with him, came to Gedaliah the son of Ahikam unto Mizpah, and there they ate bread together, in Mizpah.
2 Ishmel nwa Netanaya na mmadụ iri ndị ahụ ya na ha so, biliri jiri mma agha tigbuo Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, bụ onye eze Babilọn họpụtara dịka onye na-achị ala ahụ niile.
And Ishmael the son of Nethaniah arose, and the ten men that were with him, and smote Gedaliah the son of Ahikam the son of Shaphan with the sword, and killed him, whom the king of Babylon had appointed over the land.
3 Ishmel gbukwara ndị ikom Juda niile ha na Gedaliya nọ na Mizpa, gbukwaa ndị agha Babilọn nọkwa nʼebe ahụ.
And Ishmael smote all the Jews that were with him, with Gedaliah, at Mizpah, and the Chaldeans that were found there, the men of war.
4 Nʼụbọchị na-eso ụbọchị ahụ ha gbusịrị Gedaliya, tupu mmadụ ọbụla anụ ihe banyere ya,
And it came to pass the second day after he had killed Gedaliah, and no man knew it,
5 o nwere iri mmadụ asatọ, bụ ndị kpụchara afụọnụ ha, dọwasịa uwe ha, gbukasịakwa onwe ha ahụ, sitere nʼobodo Shekem, na Shaịlo na Sameria buuru onyinye ịnata ihuọma, na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-abịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
that there came men from Shechem, from Shiloh, and from Samaria, eighty men, having their beards shaven and their clothes rent, and having cut themselves; with oblations and incense in their hand, to bring them to the house of Jehovah.
6 Ishmel nwa Netanaya sitere na Mizpa pụọ izute ha, na-akwa akwa mgbe ọ na-aga. Mgbe o zutere ha, ọ sịrị ha, “Bịakwutenụ Gedaliya nwa Ahikam.”
And Ishmael the son of Nethaniah went forth from Mizpah to meet them, weeping all along as he went; and it came to pass when he met them, he said unto them, Come to Gedaliah the son of Ahikam.
7 Mgbe ha batara nʼobodo, Ishmel nwa Netanaya na ndị ikom ahụ bụ ndị so ya, gburu ndị ahụ tụnye ozu ha nʼime olulu.
And it was so, when they came into the midst of the city, that Ishmael the son of Nethaniah, he and the men that were with him, slew them, [and cast them] into the midst of the pit.
8 Ma mmadụ iri nʼime ndị ahụ gwara Ishmel okwu sị ya, “Biko, egbula anyị, nʼihi na anyị nwere ọka wiiti na ọka balị, na mmanụ aṅụ anyị zoro nʼime ọhịa.” Nʼihi ya, o gbughị ha, kama ọ hapụrụ ha ndụ.
But ten men were found among them that said unto Ishmael, Do not kill us, for we have hidden stores in the field, of wheat, and of barley, and of oil, and of honey. So he forbore, and did not kill them among their brethren.
9 Olulu ahụ Ishmel tụnyere ozu Gedaliya na ozu ndị ọzọ ahụ niile bụ olulu nke Asa bụ eze gwuru maka ichebe Jerusalem mgbe Baasha eze Izrel na-ebuso ya agha. Ọ bụkwa ozu ndị mmadụ ka Ishmel, nwa Netanaya kpojuru nʼime olulu ahụ.
And the pit into which Ishmael had cast all the dead bodies of the men whom he had slain by the side of Gedaliah was the one which Asa the king had made for fear of Baasha king of Israel: Ishmael the son of Nethaniah filled it with the slain.
10 Ishmel dọtakwara ndị niile fọdụrụ nʼime Mizpa nʼagha. Ọ dọtara ụmụ ndị inyom eze nʼagha, dọtakwa ndị ahụ niile a hapụrụ nʼebe ahụ, bụ ndị ahụ Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze mere ka Gedaliya nwa Ahikam bụrụ onye na-achị ha. Ishmel nwa Netanaya dọtara ha niile nʼagha duru ha na-achọ ịgbapụ gaa nʼala ndị Amọn.
And Ishmael carried away captive all the remnant of the people that were in Mizpah, the king's daughters, and all the people that remained in Mizpah, whom Nebuzar-adan the captain of the body-guard had committed to Gedaliah the son of Ahikam: Ishmael the son of Nethaniah carried them away captive, and departed to go over to the children of Ammon.
11 Mgbe Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile ya na ha nọ nụrụ ihe ọjọọ Ishmel nwa Netanaya mere,
And Johanan the son of Kareah, and all the captains of the forces that were with him, heard of all the evil that Ishmael the son of Nethaniah had done;
12 ha duuru ndị agha ha niile pụọ ibuso Ishmel nwa Netanaya agha. Ha chụkwutere ya nʼebe dị nso nʼiyi ukwu Gibiọn.
and they took all the men, and went to fight with Ishmael the son of Nethaniah, and found him by the great waters that are at Gibeon.
13 Mgbe ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha hụrụ Johanan nwa Kariya na ndịisi agha so ya, ha ṅụrịrị ọṅụ.
And it came to pass when all the people that were with Ishmael saw Johanan the son of Kareah, and all the captains of the forces that were with him, then they were glad.
14 Ndị ahụ niile Ishmel dọtara nʼagha na Mizpa, chigharịrị gafee nʼebe Johanan nwa Kariya nọ.
And all the people that Ishmael had carried away captive from Mizpah turned about and came back, and went to Johanan the son of Kareah.
15 Ma Ishmel nwa Netanaya, na mmadụ asatọ nʼime ndị agha ya, gbapụrụ ọsọ gbanarị Johanan. Ha gbalagara nʼala ndị Amọn.
But Ishmael the son of Nethaniah escaped from Johanan with eight men, and went to the children of Ammon.
16 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha niile ya na ha so duuru ndị ahụ niile ha napụtara site nʼaka Ishmel pụọ, bụ ndị ahụ Ishmel nwa Netanaya dọtara nʼagha na Mizpa, mgbe o buuru ụzọ gbuo Gedaliya nwa Ahikam. Ndị ọzọ Johanan si na Gibiọn durukwa bụ ndị a, ndị agha, na ndị inyom, na ụmụntakịrị, na ndịisi ụlọ ikpe.
Then Johanan the son of Kareah, and all the captains of the forces that were with him, took all the remnant of the people whom he had recovered from Ishmael the son of Nethaniah, from Mizpah, after he had slain Gedaliah the son of Ahikam, the mighty men of war, and the women, and the children, and the eunuchs, whom he had brought again from Gibeon;
17 Ha duuru ha na-aga, ma kwụsị nʼobodo Gerut Kimham, nke dị nso na Betlehem, ebe ha bu nʼobi ịga Ijipt,
and they departed, and dwelt at Geruth-Chimham, which is by Bethlehem, to go to enter into Egypt,
18 nʼihi ịgbanarị ndị Babilọn. Ha tụrụ egwu ihe ndị Babilọn ga-eme ha nʼihi ogbugbu Ishmel nwa Netanaya gburu Gedaliya nwa Ahikam, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ bụrụ onye na-achị ala ahụ.
because of the Chaldeans; for they feared them, because Ishmael the son of Nethaniah had smitten Gedaliah the son of Ahikam, whom the king of Babylon had appointed over the land.

< Jeremaya 41 >