< Jeremaya 35 >

1 Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị nke ruru Jeremaya ntị nʼoge ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda sị ya,
The word which came to Jeremiah from the LORD in the days of Jehoiakim the son of Josiah, king of Judah, saying,
2 “Jee nʼụlọ ụmụ Rekab kpọọ ha oku ka ha bịa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼotu nʼime ọnụụlọ ya, nọdụ nʼebe ahụ nye ha mmanya ka ha ṅụọ.”
“Go to the house of the Rechabites, and speak to them, and bring them into the LORD’s house, into one of the rooms, and give them wine to drink.”
3 Ya mere, ejekwuuru m Jaazanaya nwa Jeremaya, nwa Habazinaya na ụmụnne ya, na ụmụ ya ndị ikom, ya bụ, ndị ezinaụlọ Rekab niile.
Then I took Jaazaniah the son of Jeremiah, the son of Habazziniah, with his brothers, all his sons, and the whole house of the Rechabites;
4 Akpọbatara m ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, nʼime ọnụụlọ ụmụ Hanan nwa Igdalaya, onye nke Chineke. Ọnụụlọ a dị nso nʼọnụụlọ ndịisi ụlọnsọ, nke dị nʼelu ọnụụlọ Maaseia nwa Shalum, onye nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ.
and I brought them into the LORD’s house, into the room of the sons of Hanan the son of Igdaliah, the man of God, which was by the room of the princes, which was above the room of Maaseiah the son of Shallum, the keeper of the threshold.
5 Mgbe ahụ, e doziri m ọkwa ụfọdụ jupụtara na mmanya na iko ụfọdụ nʼihu ụmụ Rekab, sị ha, “Ngwanụ, ṅụanụ mmanya.”
I set before the sons of the house of the Rechabites bowls full of wine, and cups; and I said to them, “Drink wine!”
6 Ma ha zara sị, “Anyị adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab nyere anyị iwu sị anyị, ‘Unu aṅụkwala mmanya, unu na ụmụ ụmụ unu.
But they said, “We will drink no wine; for Jonadab the son of Rechab, our father, commanded us, saying, ‘You shall drink no wine, neither you nor your children, forever.
7 Ọzọkwa, unu ewurula onwe unu ụlọ, unu akụla mkpụrụ ubi, maọbụ kụọ ubi vaịnị. Unu adọtarala onwe unu ihe ndị a niile, kama na-ebinụ nʼụlọ ikwuu. Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka unu ga-esi bie ogologo ndụ nʼala ahụ unu bụ ndị ọbịa nʼime ya.’
You shall not build a house, sow seed, plant a vineyard, or have any; but all your days you shall dwell in tents, that you may live many days in the land in which you live as nomads.’
8 Anyị erubela isi nʼihe niile nna nna anyị Jehonadab nwa Rekab gwara anyị. Anyị na ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ndị ikom na ndị inyom adịghị aṅụ mmanya,
We have obeyed the voice of Jonadab the son of Rechab, our father, in all that he commanded us, to drink no wine all our days, we, our wives, our sons, or our daughters;
9 maọbụ wuo ụlọ, maọbụ nwee ubi vaịnị, ala ubi maọbụ mkpụrụ ọkụkụ.
and not to build houses for ourselves to dwell in. We have no vineyard, field, or seed;
10 Ọ bụkwa nʼụlọ ikwuu ka anyị na-ebi dị ka nna nna anyị Jehonadab nyere anyị nʼiwu.
but we have lived in tents, and have obeyed, and done according to all that Jonadab our father commanded us.
11 Ma mgbe Nebukadneza eze Babilọn busoro ala anyị agha, anyị kpebiri sị, ‘Bịanụ ka anyị gbaba Jerusalem si otu a gbanarị ndị agha Babilọn, na ndị agha ndị Aram.’ Ọ bụ nke a mere anyị ji biri na Jerusalem.”
But when Nebuchadnezzar king of Babylon came up into the land, we said, ‘Come! Let’s go to Jerusalem for fear of the army of the Kasdim, and for fear of the army of the Syrians; so we will dwell at Jerusalem.’”
12 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya
Then the LORD’s word came to Jeremiah, saying,
13 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Gaa gwa ndị Juda na ndị bi na Jerusalem, ‘Ọ bụ na unu agaghị esite nʼịdọ aka na ntị mụta irubere okwu m isi?’ ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“The LORD of Hosts, the God of Israel, says: ‘Go and tell the men of Judah and the inhabitants of Jerusalem, “Will you not receive instruction to listen to my words?” says the LORD.
14 ‘Jehonadab nwa Rekab nyere ụmụ ụmụ ya iwu sị ha aṅụla mmanya, ha na-edebe iwu ahụ. Ruo taa, ha adịghị aṅụ mmanya, nʼihi na ha na-edebe iwu nna nna ha nyere ha. Ma mụ onwe m agwala unu okwu mgbe na mgbe, ma unu jụrụ irubere m isi.
“The words of Jonadab the son of Rechab that he commanded his sons, not to drink wine, are performed; and to this day they drink none, for they obey their father’s commandment; but I have spoken to you, rising up early and speaking, and you have not listened to me.
15 Mgbe mgbe ka m ziteere unu ụmụ ohu m bụ ndị amụma, ndị bịara gwa unu okwu sị, “Dozienụ ụzọ unu, sitekwanụ nʼajọ omume unu tụgharịa. Unu niile nʼotu nʼotu, unu agbasola chi ndị ọzọ ife ha. Ọ bụrụ na unu emee otu a, unu ga-ebi nʼala a m nyere unu na nna nna unu ha.” Ma unu jụrụ ịṅa ntị, jụkwa ige m ntị.
I have sent also to you all my servants the prophets, rising up early and sending them, saying, ‘Every one of you must return now from his evil way, amend your doings, and don’t go after other gods to serve them. Then you will dwell in the land which I have given to you and to your fathers;’ but you have not inclined your ear, nor listened to me.
16 Ụmụ ụmụ Jehonadab, nwa Rekab, emeela ihe nna nna ha nyere ha nʼiwu, ma ndị a jụrụ irubere m isi.’
The sons of Jonadab the son of Rechab have performed the commandment of their father which he commanded them, but this people has not listened to me.”’
17 “Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel kwuru: ‘Geenụ ntị! Lee, ana m aga ime ka ihe ọjọọ bịakwasị Juda na ndị niile bi na Jerusalem, dịka m kwuru na ọ ga-adị. Nʼihi na agwala m ha okwu, ma ha jụrụ ige m ntị. Akpọrọ m ha oku, ma ha jụrụ ịza.’”
“Therefore the LORD, the God of Hosts, the God of Israel, says: ‘Behold, I will bring on Judah and on all the inhabitants of Jerusalem all the evil that I have pronounced against them, because I have spoken to them, but they have not heard; and I have called to them, but they have not answered.’”
18 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị ezinaụlọ Rekab, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Unu erubeela isi mee ihe niile nna nna unu bụ Jehonadab nyere unu nʼiwu.’
Jeremiah said to the house of the Rechabites, “The LORD of Hosts, the God of Israel, says: ‘Because you have obeyed the commandment of Jonadab your father, and kept all his precepts, and done according to all that he commanded you,’
19 Nʼihi ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru sị, ‘O nweghị mgbe ọbụla nwoke ga-ejere m ozi ga-akọ nʼezinaụlọ Jehonadab nwa Rekab.’”
therefore the LORD of Hosts, the God of Israel, says: ‘Jonadab the son of Rechab will not lack a man to stand before me forever.’”

< Jeremaya 35 >