< Aịzaya 65 >

1 “Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m. Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m. Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m, asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’ 2 Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọ nye ndị na-enupu isi, bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezi ndị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha, 3 ndị na-anọgide na-akpasu m iwe nʼihu m mgbe niile, ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige, nʼebe ịchụ aja eji brik wuo, 4 ndị na-anọdụ nʼetiti ili, ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche; ndị na-eri anụ ezi, ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha; 5 ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso, nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’ Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m. Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị. 6 “Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị: Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju. E, aga m akwụghachi ha. 7 Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche, kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile. Aga m akwụghachi ha nʼuju, nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.” 8 Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnị ndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya, nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’ otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m; Agaghị m ebibicha ha niile. 9 Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta, sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile. Ndị m họpụtara ga-eketa ha, ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ. 10 Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ; Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi, na ndị m na-achọsi m ike. 11 “Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ, ndị chezọrọ ugwu nsọ m, ndị na-edozi tebul maka Ihuọma, ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka. 12 Aga m eme ka unu zute mma agha; unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu. Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị; mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị. Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu, họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.” 13 Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “Ndị ohu m ga-eriju afọ, ma unu ga-anọ agụụ, akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ, ma ha ga-aṅụ mmiri. Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere, ma ha ga-anọ nʼọṅụ. 14 Ndị ohu m ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha, ma unu ga-akwa akwa, nʼihi ihe mgbu nke obi unu, tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu. 15 Unu ga-ahapụ aha unu nye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ; nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-etigbu unu, ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ. 16 Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ, ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu, onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu. Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga, zokwa ha site nʼanya m. 17 “Nʼihi na lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ; ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla. 18 Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke, nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ. 19 Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem, nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m; a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ, maọbụ olu iti mkpu akwa. 20 “Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu ga-adị nʼebe ahụ ọzọ, a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya; nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ dị ka nwantakịrị; a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ dịka onye a bụrụ ọnụ. 21 Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya; ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha. 22 Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ, maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie. Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge. Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta. 23 Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ. Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri, ha na ụmụ ụmụ ha. 24 Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha. Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha. 25 Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe, ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi, ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja! Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ, maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m.” Ka Onyenwe anyị kwuru.

< Aịzaya 65 >