< Aịzaya 60 >

1 “Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala, ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ.
兴起,发光!因为你的光已经来到! 耶和华的荣耀发现照耀你。
2 Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile, oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa, ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ.
看哪,黑暗遮盖大地, 幽暗遮盖万民, 耶和华却要显现照耀你; 他的荣耀要现在你身上。
3 Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị, ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.
万国要来就你的光; 君王要来就你发现的光辉。
4 “Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu, ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị; ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa, ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.
你举目向四方观看; 众人都聚集来到你这里。 你的众子从远方而来; 你的众女也被怀抱而来。
5 Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee, obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ, nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị, akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.
那时,你看见就有光荣; 你心又跳动又宽畅; 因为大海丰盛的货物必转来归你; 列国的财宝也必来归你。
6 Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia na Efaa ga-ejupụta nʼala gị, ma ndị sikwa nʼobodo Sheba ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ. Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.
成群的骆驼, 并米甸和以法的独峰驼必遮满你; 示巴的众人都必来到; 要奉上黄金乳香, 又要传说耶和华的赞美。
7 A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda. Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị. A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m. Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa.
基达的羊群都必聚集到你这里, 尼拜约的公羊要供你使用, 在我坛上必蒙悦纳; 我必荣耀我荣耀的殿。
8 “Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii, ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha?
那些飞来如云、 又如鸽子向窗户飞回的是谁呢?
9 Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere; ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ, na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya, ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile. Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ, Onye nsọ nke Izrel, nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị.
众海岛必等候我, 首先是他施的船只, 将你的众子连他们的金银从远方一同带来, 都为耶和华—你 神的名, 又为以色列的圣者, 因为他已经荣耀了你。
10 “Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile. Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi. Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m, ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.
外邦人必建筑你的城墙; 他们的王必服事你。 我曾发怒击打你, 现今却施恩怜恤你。
11 Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ, ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche. A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha.
你的城门必时常开放, 昼夜不关; 使人把列国的财物带来归你, 并将他们的君王牵引而来。
12 Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi; a ga-ekpochapụ ha.
哪一邦哪一国不事奉你,就必灭亡, 也必全然荒废。
13 “Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị. Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres, ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma. Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile.
黎巴嫩的荣耀, 就是松树、杉树、黄杨树, 都必一同归你, 为要修饰我圣所之地; 我也要使我脚踏之处得荣耀。
14 Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị. Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ. Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị, Zayọn nke Onye nsọ Izrel.
素来苦待你的,他的子孙都必屈身来就你; 藐视你的,都要在你脚下跪拜。 他们要称你为“耶和华的城”, 为“以色列圣者的锡安”。
15 “Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu, onye mmadụ niile na-eweda nʼala, ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi; ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị.
你虽然被撇弃被厌恶, 甚至无人经过, 我却使你变为永远的荣华, 成为累代的喜乐。
16 Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị. Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.
你也必吃万国的奶, 又吃君王的奶。 你便知道我—耶和华是你的救主, 是你的救赎主,雅各的大能者。
17 Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo, nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha. Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla, nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe. M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gị ezi omume ga-abụ onye na-achị gị.
我要拿金子代替铜, 拿银子代替铁, 拿铜代替木头, 拿铁代替石头; 并要以和平为你的官长, 以公义为你的监督。
18 Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ. Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa. Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta, ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto.
你地上不再听见强暴的事, 境内不再听见荒凉毁灭的事。 你必称你的墙为“拯救”, 称你的门为“赞美”。
19 Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ, maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi, Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.
日头不再作你白昼的光; 月亮也不再发光照耀你。 耶和华却要作你永远的光; 你 神要为你的荣耀。
20 Anwụ gị agaghị ada ada, ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha; nʼihi na Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile, iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa.
你的日头不再下落; 你的月亮也不退缩; 因为耶和华必作你永远的光。 你悲哀的日子也完毕了。
21 Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume, ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi. Ha bụ ome nke m kụrụ, bụ ọrụ aka m, ime ka ịma mma m pụta ìhè.
你的居民都成为义人, 永远得地为业; 是我种的栽子,我手的工作, 使我得荣耀。
22 Ezinaụlọ dị nta ga-aba ụba ghọọ obodo, mba nta ga-aghọ obodo buru ibu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, ga-eme ka ha niile mezuo ọsịịsọ nʼoge ya.”
至小的族要加增千倍; 微弱的国必成为强盛。 我—耶和华要按定期速成这事。

< Aịzaya 60 >