< Aịzaya 22 >

1 Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ. Ọ bụkwa gịnị na-eme unu ugbu a nke mere na unu niile rịgooro nʼelu ụlọ?
The burden of the valley of vision. What ails you now, that you have all gone up to the housetops?
2 Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara, gị obodo oke ụzụ na-aṅụrị obi ụtọ? Ndị unu niile nwụrụ anwụghị nʼime ọgbọ agha, ma ọ bụkwanụ site na mma agha.
You that are full of shouting, a tumultuous city, a joyous town, your slain are not slain with the sword, neither are they dead in battle.
3 Ndịisi unu niile agbapụchaala. E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ. Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya.
All your rulers fled away together. They were bound by the archers. All who were found by you were bound together. They fled far away.
4 Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m; ka m bee akwa dị ilu. Unu anwakwala ịkasị m obi, nʼihi mbibi e bibiri ndị m.”
Therefore I said, “Look away from me. I will weep bitterly. Don’t labor to comfort me for the destruction of the daughter of my people.
5 Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị, nʼime ndagwurugwu nke ọhụ, ọ bụ ụbọchị itida mgbidi na nke itiku ugwu niile mkpu akwa.
For it is a day of confusion, and of treading down, and of perplexity from the Lord, GOD of Hosts, in the valley of vision, a breaking down of the walls, and a crying to the mountains.”
6 Elam bu akpa àkụ, ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha; Kia ewepụtakwala ọta.
Elam carried his quiver, with chariots of men and horsemen; and Kir uncovered the shield.
7 Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma; ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu.
Your choicest valleys were full of chariots, and the horsemen set themselves in array at the gate.
8 Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda, nʼụbọchị ahụ unu legidere anya na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa.
He took away the covering of Judah; and you looked in that day to the armor in the house of the forest.
9 Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya. Unu chekọtara mmiri nʼọdọ mmiri nke ala ala.
You saw the breaches of David’s city, that they were many; and you gathered together the waters of the lower pool.
10 Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ, tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike.
You counted the houses of Jerusalem, and you broke down the houses to fortify the wall.
11 Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie, ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya, unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe.
You also made a reservoir between the two walls for the water of the old pool. But you didn’t look to him who had done this, neither did you have respect for him who planned it long ago.
12 Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọrọ unu ụbọchị ahụ ka unu kwaa akwa, ruo ụjụ, kpụchaa agịrị isi unu ma yirikwa akwa mkpe.
In that day, the Lord, GOD of Hosts, called to weeping, to mourning, to baldness, and to dressing in sackcloth;
13 Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu; igbu ehi na igbu atụrụ, iri anụ nakwa ịṅụ mmanya. Unu na-asị, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi ka anyị ga-anwụ.”
and behold, there is joy and gladness, killing cattle and killing sheep, eating meat and drinking wine: “Let’s eat and drink, for tomorrow we will die.”
14 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpugheerala m mee ka m nụrụ, “Nʼezie, agaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo ụbọchị unu ga-anwụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
The LORD of Hosts revealed himself in my ears, “Surely this iniquity will not be forgiven you until you die,” says the Lord, GOD of Hosts.
15 Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru: “Gaa, gwa odozi akụ a bụ Shebna, nke bụ onye na-elekọta ụlọ ukwu eze:
The Lord, GOD of Hosts says, “Go, get yourself to this treasurer, even to Shebna, who is over the house, and say,
16 Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a, na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ?
‘What are you doing here? Who has you here, that you have dug out a tomb here?’ Cutting himself out a tomb on high, chiseling a habitation for himself in the rock!”
17 “Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka, tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke.
Behold, the LORD will overcome you and hurl you away violently. Yes, he will grasp you firmly.
18 Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ, tufuo gị nʼobodo sara mbara. Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ, nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị.
He will surely wind you around and around, and throw you like a ball into a large country. There you will die, and there the chariots of your glory will be, you disgrace of your lord’s house.
19 Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị, na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala.
I will thrust you from your office. You will be pulled down from your station.
20 “Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya.
It will happen in that day that I will call my servant Eliakim the son of Hilkiah,
21 Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem na ndị Juda nna.
and I will clothe him with your robe, and strengthen him with your belt. I will commit your government into his hand; and he will be a father to the inhabitants of Jerusalem, and to the house of Judah.
22 Aga m enyefekwa ya nʼaka ihe ntụghe ụzọ nke ụlọ Devid. A ga-emeghe ihe niile ọ sị na a ga-emeghe, mechiekwa ihe niile ọ sị na a ga-emechi,
I will lay the key of David’s house on his shoulder. He will open, and no one will shut. He will shut, and no one will open.
23 Aga m eme ka o guzosie ike dịka ǹtu a kpọgidere nʼaja ụlọ. Ocheeze ya ga-ewetara ụlọ nna ya nsọpụrụ.
I will fasten him like a nail in a sure place. He will be for a throne of glory to his father’s house.
24 A ga-ekokwasị ya ebube nke ezinaụlọ ya, ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya, ihe niile nke dị nta, site na ite na efere, sitekwa nʼọba ruo na karama niile.
They will hang on him all the glory of his father’s house, the offspring and the issue, every small vessel, from the cups even to all the pitchers.
25 “Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Nʼoge ahụ, ǹtu ahụ a kpọgidesịrị ike nʼaja ụlọ ga-apụ nʼọnọdụ ya, a ga-akpajipụ ya ọ dapụ nʼala. Ibu niile nke kokwasịrị nʼelu ya ka a ga-egbuda nʼala.” Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.
“In that day,” says the LORD of Hosts, “the nail that was fastened in a sure place will give way. It will be cut down and fall. The burden that was on it will be cut off, for the LORD has spoken it.”

< Aịzaya 22 >