< Hegai 2 >

1 nʼụbọchị nke iri abụọ na otu, nʼọnwa nke asaa, okwu Onyenwe anyị si nʼọnụ onye amụma Hegai bịakwa na-asị:
on the twenty-first day of the seventh month, this message from the Lord came to Haggai the prophet,
2 “Gwa Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị Izrel ahụ fọdụrụ nʼala ahụ sị:
telling him to speak to Zerubbabel son of Shealtiel, governor of Judah, and to Joshua, the son of Jehozadak, the high priest, and to all the rest of the people:
3 ‘Onye nʼime unu nwere ike icheta otu ụlọnsọ ukwu nke mbụ si dị ebube? Ọ dị aṅaa nʼanya unu ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị unu ka ihe efu ugbu a.
Who is left among you that saw this temple in its former glory? And how do you see it now? Doesn’t it seem as though there is nothing there?
4 Ma ugbu a nwee obi ike Zerubabel,’ ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Nwekwaa obi ike gị Joshua onyeisi nchụaja, nwa Jehozadak. Nwekwaanụ obi ike unu ndị niile bi nʼala a.’ Ka Onyenwe anyị kwuru. ‘Rụọnụ ọrụ nʼihi na anọnyeere m unu,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.
The Lord says: Yet now be strong, Zerubbabel, be strong, Joshua, son of Jehozadak, the high priest, be strong, all you people of the land. The Lord says: Begin the work, for I am with you. The Lord of hosts says:
5 ‘Nke a bụ ihe merenụ mgbe mụ na unu gbara ndụ nʼoge ahụ unu si nʼIjipt pụta. Mmụọ m na-anọgidekwa nʼetiti unu. Unu atụla egwu.’
When your ancestors left Egypt I made a promise to you, and I am still with you. Do not be afraid!
6 “Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa oge nta gasịa, aga m ayọgharị eluigwe na ụwa, na osimiri na ala akọrọ.
The Lord of hosts says: In a little while, I will shake the heavens, and the earth, and the sea, and the land.
7 Aga m ayọgharịkwa mba niile; ihe mba niile na-achọsi ike ga-abịa. Aga m eme ka ụlọ a jupụta nʼebube,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.
And I will shake all nations, and the precious things of all nations shall come here; and I will fill this temple with glory. The Lord of hosts says:
8 ‘Ọlaọcha niile na ọlaedo niile, bụ nke m.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.
The silver is mine, and the gold is mine,
9 ‘Ebube nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube nke mbụ,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Ọ bụkwa nʼebe a ka m ga-enye ọganihu na udo,’ otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.”
The later glory of this temple shall be greater than the former. The Lord of hosts says: In this place I will grant prosperity. This is the message of the Lord of hosts.
10 Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa itoolu, nke afọ abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs, okwu Onyenwe anyị bịakwutere onye amụma, bụ Hegai.
In the twenty-fourth day of the ninth month, in the second year of Darius, this message from the Lord came to Haggai the prophet:
11 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Jụọ ndị nchụaja ihe iwu na-ekwu.
The Lord of hosts says: “Ask the priests for a ruling:
12 Ọ bụrụ na mmadụ etinye anụ e doro nsọ nʼakpa uwe ya, ọ bụrụkwa na uwe ahụ anụ nsọ ahụ dị nʼime ya emetụ achịcha, maọbụ ofe, maọbụ nri ọzọ dị iche, mmetụ uwe ahụ metụrụ ha ọ ga-eme ka ha dịrị nsọ?’” Ndị nchụaja zara sị: “Mba!”
‘If one carries consecrated meat in the fold of his garment, and with that garment touches bread, or stew, or wine, or oil, or any food, will it become holy?’” And the priests answered: “No.”
13 Mgbe ahụ Hegai kwukwara, “Ọ bụrụ na mmadụ emerụọ onwe ya site nʼimetụ onye nwụrụ anwụ aka, mesịa metụ otu nʼime ihe ndị a aka, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ?” Ndị nchụaja zara sị, “E, ọ ga-abụ ihe rụrụ arụ.”
Then said Haggai, “If one who is unclean by reason of a dead body touches any of these, will it be unclean?” And the priests answered: “It would be unclean.”
14 Mgbe ahụ Hegai kwuru sị, “‘Otu a ka mba a na ndị bi nʼime ya dị nʼihu m. Ihe ọbụla aka ha rụpụtara na onyinye ọbụla ha nyere bụ ihe rụrụ arụ.’ Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.
Haggai replied: “So is this people and so is this nation before me, the Lord declares, and so is every work of their hands; and that which they offer there is unclean.
15 “‘Ma ugbu a, chezienụ echiche banyere ihe ndị ga-emenụ site taa gaa nʼihu. Tuleenụ otu ihe si dị tupu adọnye otu nkume nʼelu ibe ya nʼụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
Think back from this day, before a stone was laid upon a stone in the temple of the Lord.
16 Kedụ ọnọdụ unu? Mgbe mmadụ bịara nʼebe o debere ọtụtụ iri efere ọka abụọ, ihe ọ na-ahụ bụ naanị ọtụtụ efere ọka iri. Ọ bụrụkwa na ọ bịa nʼebe ịnara mmanya ka o were iri ite mmanya ise, ọ bụ naanị iri ite mmanya abụọ ka ọ ga-enweta.
How were you? When you came to a heap of grain expecting twenty measures, there were only ten; when you came to the wine vat to draw out fifty vessels, there were only twenty.
17 Eji m ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu, na mkpụrụ mmiri igwe bibie ọrụ aka unu niile; ma unu alọghachikwuteghị m,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.
‘I struck all the work of your hands with blasting and blight, with mildew and with hail. Yet you didn’t turn to me,’ says the Lord,
18 ‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, site nʼụbọchị taa bụ iri ụbọchị anọ nke ọnwa itoolu, chenụ echiche banyere ụbọchị a bụ ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Chezienụ echiche banyere ya.
‘Think back from this day, think! From the twenty-fourth day of the ninth month, from the day when the foundations of the temple of the Lord were laid, and consider.
19 Ọ ka nwere mkpụrụ ọghịgha unu nwere nʼọba unu? Ọzọkwa, osisi vaịnị, osisi fiig, osisi pomegranet na osisi oliv amịghị mkpụrụ, ruo ugbu a. “‘Ma site nʼụbọchị taa gaa nʼihu aga m agọzi unu.’”
The seed is in the granary, but the vine and the fig tree and the pomegranate and the olive tree have not yet brought forth fruit. From this day will I bless you.’”
20 Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Hegai nke ugboro abụọ, nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa ahụ, sị,
This message from the Lord came to Haggai a second time on the twenty-fourth day of the month:
21 “Gwa Zerubabel, onye na-achị Juda sị ana m aga ịyọgharị eluigwe na ụwa.
Tell Zerubbabel, governor of Judah: I will shake the heavens and the earth;
22 Aga m akwatu ocheeze alaeze dị iche iche, ana m agakwa imebi ike alaeze nke mba dị iche iche. Aga m akwatu ụgbọ ịnyịnya nʼala na ndị na-anya ha; ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-adakwa. Onye ọbụla ga-adakwa site na mma agha nke onye otu ya.
and I will overthrow the throne of kingdoms; and I will destroy the strength of the kingdoms of the nations; and I will overthrow the chariots, and those who ride in them; and the horses and their riders shall come down, each by the sword of his fellow.
23 “‘Nʼụbọchị ahụ,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, ‘Aga m ewere gị bụ onyeozi m Zerubabel nwa Shealtiel,’ ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ‘mee gị ka ị dị ka mgbaaka akara m, nʼihi na ahọrọla m gị,’ Ọ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu.”
In that day, the Lord of hosts says, I will take you, Zerubbabel, my servant, the son of Shealtiel, the Lord says, and will make you like a signet ring, for I have chosen you, the Lord of hosts says.

< Hegai 2 >