< Hegai 1 >

1 Ozi Onyenwe anyị, nke rutere Hegai onye amụma, nke o ziri Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja. Ozi a rutere ya nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị eze Daraiọs, nʼụbọchị nke mbụ nʼọnwa nke isii.
In the second year of Darius the king, on the first day of the sixth month, this message from the Lord came through Haggai the prophet to Zerubbabel the son of Shealtiel, governor of Judah, and to Joshua the son of Jehozadak, the high priest:
2 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Ndị a na-asị, ‘Nʼoge ahụ erubeghị mgbe anyị ga-ewu ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.’”
The Lord of hosts says: The people say that the time has not yet come to rebuild the temple of the Lord.
3 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị bịara site nʼọnụ Hegai, onye amụma na-asị,
Then this message from the Lord came to Haggai the prophet:
4 “Nke a ọ bụ oge unu onwe unu ji ebi nʼụlọ unu e ji osisi machie, mgbe ụlọnsọ ukwu a nọgidere na-adakpọsị?”
Is it a time for you yourselves to live in your own well-roofed houses, while this temple lies in ruins?
5 Ugbu a, ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Lezienụ ụzọ unu anya.
The Lord of hosts says: Consider your past experiences.
6 Unu na-agha mkpụrụ, ma na-enweta naanị ihe ntakịrị. Unu na-eri nri, ma ihe unu na-eri adịghị ezuru unu. Unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu adịghị aṅụju afọ ka o si mmasị unu. Unu na-eyikwasị onwe unu uwe, ma ọ dịghị achụ unu oyi. Unu na-anata ụgwọ ọrụ, maọbụ nʼakpa puru epu ka unu na-etinye ya.”
You sow much, but bring in little; you eat, but you do not have enough; you drink, but are not filled; you clothe yourselves, but not enough to be warm; and those who earn wages, put those wages in a bag with holes.
7 Ihe a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwu, “Chezienụ echiche banyere ndụ unu.
The Lord of hosts says: Consider your experiences.
8 Jeenụ nʼelu ugwu, wedata osisi, jiri ya wuo ụlọnsọ ukwu ahụ. Mgbe ahụ, obi ga-atọ m ụtọ na ya, a ga-asọpụkwara m nʼebe ahụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwuru.
Go up to the mountains, and bring wood and rebuild the temple; then I will be pleased with it, and I will reveal my glory. The Lord says:
9 “Unu na-ele anya ihe ukwu, ma lee, ọ bụ naanị ihe ntakịrị ka ọ pụtara. Mgbe unu welatara ha nʼụlọ, a fụfụsiri m ha niile. Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara. “Ọ bụ nʼihi na ụlọnsọ ukwu m, nke nọgidere na-abụ mkpọmkpọ ebe, ma onye ọbụla nʼime unu na-agba mbọ ịrụ naanị ihe gbasara ụlọ nke aka ya.
You looked for much, and it came to little; and when you brought the harvest home, I blew it away. Why? The Lord of hosts says: Because my temple lies in ruins, while you shelter in your own houses.
10 Ya mere, nʼihi unu ka eluigwe ji jide igirigi ha, ala ejidekwala ihe omume nke ubi.
The heavens withhold the dew, and the earth withholds its fruit,
11 Akpọọla m ka okpomọkụ bịakwasị nʼala ubi niile nakwa nʼelu ugwu niile, nʼelu ọka na mmanya ọhụrụ, mmanụ oliv na ihe niile nke ala na-emepụta. Ka ọ bịakwasị mmadụ na anụmanụ niile, nakwa ihe niile unu dọgburu onwe unu nʼọrụ inweta.”
and I have called forth a drought upon the land and upon the mountains, and upon the grain and the new wine and the oil and upon that which the ground brings forth, and upon people and animals, and upon all the labor of your hands.
12 Mgbe ahụ, Zerubabel nwa Shealtiel, na Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja, na ndị niile fọdụrụ, ṅara ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke ha, na nʼozi Hegai onye amụma, dịka Onyenwe anyị Chineke ha zitere ya. Ndị Izrel niile tụkwara egwu Onyenwe anyị.
Then Zerubbabel the son of Shealtiel and Joshua the son of Jehozadak the high priest, with all the rest of the people, obeyed the command of the Lord their God and the words of Haggai the prophet, as the Lord their God had sent him to them. They showed proper respect for the Lord.
13 Mgbe ahụ Hegai, onyeozi Onyenwe anyị, ziri ndị mmadụ ahụ niile ozi Onyenwe anyị, sị: “Mụ onwe m nọnyeere unu,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Haggai, the prophet of the Lord, as the Lord commanded him, told the people: ‘The Lord says: I am with you.’
14 Ya mere, Onyenwe anyị kwaliri mmụọ Zerubabel nwa Shealtiel, onye na-achị Juda, na mmụọ Joshua nwa Jehozadak, onyeisi nchụaja na mmụọ ndị niile ahụ fọdụrụ nʼala ahụ. Ha niile bịara bido ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke ha,
And the Lord stirred up the spirit of Zerubbabel the son of Shealtiel, governor of Judah, and the spirit of Joshua the son of Jehozadak the high priest, and the spirit of all the rest of the people, so that they came and worked on the temple of the Lord of hosts, their God,
15 nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ, nʼọnwa nke isii. Ọ bụ nʼafọ nke abụọ, nke ọchịchị eze Daraiọs,
in the twenty-fourth day of the sixth month. In the second year of Darius the king,

< Hegai 1 >