< Jenesis 22 >

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Chineke nwara Ebraham. Ọ sịrị ya, “Ebraham.” Ebraham zara sị, “Lekwa m.”
Après cela, Dieu mit Abraham à l'épreuve et lui dit: " Abraham! " Il répondit: " Me voici. "
2 Chineke sịrị, “Duru nwa gị nwoke, naanị otu nwa gị nwoke, Aịzik onye ị hụrụ nʼanya, gaa nʼala Mọrịa. Jiri ya chụọrọ m aja nsure ọkụ nʼelu otu nʼime ugwu dị nʼebe m ga-egosi gị.”
Et Dieu dit: " Prends ton fils, ton unique, celui que tu aimes, Isaac, et va-t'en au pays de Moria, et là offre-le en holocauste sur l'une des montagnes que je t'indiquerai. "
3 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Ebraham biliri kwadoo ịnyịnya ibu ya. O duuru ndị ikom abụọ na-ejere ya ozi, na nwa ya nwoke Aịzik. O gbutere nkụ ga-ezuru ya ịchụ aja nsure ọkụ, bilie gawa ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya.
Abraham se leva de bon matin et, ayant sellé son âne, il prit avec lui deux de ses serviteurs et son fils Isaac; il fendit le bois de l'holocauste et partit pour aller au lieu que Dieu lui avait dit.
4 Nʼụbọchị nke atọ, Ebraham lepụrụ anya hụ ebe ahụ nʼebe dị anya.
Le troisième jour, Abraham, levant les yeux, aperçut le lieu de loin;
5 Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.”
et Abraham dit à ses serviteurs: " Restez ici avec l'âne; moi et l'enfant, nous voulons aller jusque-là et adorer, puis nous reviendrons vers vous. "
6 Ebraham boro nwa ya nwoke Aịzik ukwu nkụ ahụ e ji achụ aja nsure ọkụ nʼisi, ma ya onwe ya jidere ọkụ na mma.
Et Abraham prit le bois de l'holocauste, et le mit sur Isaac, son fils, lui-même portait dans sa main le feu et le couteau, et ils s'en allèrent tous deux ensemble.
7 Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?”
Isaac parla à Abraham, son père, et dit: " Mon père! " Il répondit: " Me voici, mon fils. " Et Isaac dit: " Voici le feu et le bois; mais où est l'agneau pour l'holocauste? "
8 Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha.
Abraham répondit: " Dieu verra à trouver l'agneau pour l'holocauste, mon fils. " Et ils allaient tous deux ensemble.
9 Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ.
Lorsqu'ils furent arrivés au lieu que Dieu lui avait désigné, Abraham y éleva l'autel et arrangea le bois; puis il lia Isaac, son fils, et le mit sur l'autel, au-dessus du bois.
10 Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke.
Et Abraham étendit la main et prit le couteau pour égorger son fils.
11 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.”
Alors l'ange de Yahweh lui cria du ciel et dit: " Abraham! Abraham! " Il répondit: " Me voici. "
12 Ọ sịrị ya, “Emetụkwala nwokorobịa ahụ aka. Emekwala ya ihe ọbụla. Nʼihi na amatala m ugbu a na ị na-atụ egwu Chineke, ebe ọ bụ na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwa nwoke i nwere chụọrọ m aja.”
Et l'ange dit: " Ne porte pas la main sur l'enfant et ne lui fais rien; car je sais maintenant que tu crains Dieu et que tu ne m'as pas refusé ton fils, ton unique. "
13 Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke.
Abraham, ayant levé les yeux, vit derrière lui un bélier pris dans un buisson par les cornes; et Abraham alla prendre le bélier et l'offrit en holocauste à la place de son fils.
14 Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “Onyenwe anyị ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu Onyenwe anyị, a ga-arọpụta.”
Et Abraham nomma ce lieu: " Yahweh-Yiréh ", d'où l'on dit aujourd'hui: " Sur la montagne de Yahweh, il sera vu. "
15 Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ,
L'ange de Yahweh appela du ciel Abraham une seconde fois, en disant:
16 sị, “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja,
" Je l'ai juré par moi-même, dit Yahweh: parce que tu as fait cela, et que tu ne m'as pas refusé ton fils, ton unique,
17 aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.
je te bénirai; je multiplierai ta postérité comme les étoiles du ciel et comme le sable qui est au bord de la mer, et ta postérité possédera la porte de ses ennemis.
18 Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”
En ta postérité seront bénies toutes les nations de la terre, parce que tu as obéi à ma voix. "
19 Emesịa, Ebraham laghachikwuru ndị na-ejere ya ozi. Ha niile laghachikwara Bịasheba. Ebraham birikwara na Bịasheba.
Abraham retourna vers ses serviteurs et, s'étant levés, ils s'en allèrent ensemble à Bersabée. Et Abraham habita à Bersabée.
20 Mgbe ihe ndị a gasịrị, e ziri Ebraham ozi si ya, “Lee, Milka ya onwe ya amụkwaarala nwanne gị nwoke bụ Nahọ, ụmụ ndị ikom.
Après ces événements, on apporta à Abraham cette nouvelle: " Voici, Melcha a aussi enfanté des fils à Nachor, ton frère:
21 Aha ha bụ Uz, onye bụ ọkpara, na Buz nwanne ya, Kemuel bụ (nna Aram),
Hus, son premier-né, Buz, son frère, Camuel, père d'Aram,
22 Kesed, Hazọ, Pildash, Jidlaf na Betuel.”
Cased, Azau, Pheldas, Jedlaph et Bathuel. "
23 Betuel mụrụ Ribeka. Milka mụtaara Nahọ, nwanne Ebraham ụmụ ndị ikom asatọ ndị a.
Bathuel fut père de Rébecca. Ce sont là les huit fils que Melcha enfanta à Nachor, frère d'Abraham.
24 Iko ya nwanyị, onye aha ya bụ Reuma, mụkwaara ya ụmụ ndị ikom. Ha bụ Teba, Gaham, Tahash na Maaka.
Sa concubine, nommée Roma, eut aussi des enfants: Tabée, Gaham, Taas et Maacha.

< Jenesis 22 >