< Izikiel 13 >

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
And the word of the Lord came to me, saying,
2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma megide ndị amụma nke Izrel ndị na-ebu amụma ugbu a, gwa ndị amụma ahụ na-ekwu ihe sitere ha nʼuche: ‘Nụrụnụ okwu nke Onyenwe anyị.
Son of man, prophesy against the prophets of Israel, and you shall prophesy, and shall say to them, Hear you the word of the Lord:
3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ahụhụ ga-adịrị ndị amụma nzuzu ndị na-agbaso mmụọ nke onwe ha, ndị ọ dịghị ihe ha na-ahụ.
Thus says the Lord, Woe to them that prophesy out of their own heart, and who see nothing at all.
4 Gị Izrel, lee, ndị amụma gị niile dị ka nkịta ọhịa bi na mkpọmkpọ ebe.
Your prophets, O Israel, are like foxes in the deserts.
5 Unu arịgobeghị na oghere jupụtara na mgbidi maọbụ rụzie mgbidi aja ndị ahụ maka nchekwa ndị Izrel ka o nwee ike kwudosie ike nʼụbọchị agha nke Onyenwe anyị.
They have not continued steadfast, and they have gathered flocks against the house of Israel, they that say,
6 Ọhụ ha bụ ụgha, otu a, ịjụ ase ha bụkwa ụgha, ha na-asị, “Onyenwe anyị kwupụtara,” ebe Onyenwe anyị ezipụghị ha, ha na-agakwa nʼihu na-atụ anya ka o mezuo okwu ha.
In the day of the Lord, have not stood, seeing false [visions], prophesying vanities, who say, The Lord says, and the Lord has not sent them, and they began [to try] to confirm the word.
7 Ọ bụghị ọhụ ụgha ka unu hụrụ, ọ bụghịkwa okwu ịjụ ase ụgha ka unu kwuru, mgbe unu na-asị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m ekwughị okwu?
Have you not seen a false vision? and spoken vain prophecies?
8 “‘Nʼihi ya, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m ebibi unu nʼihi okwu ụgha na ọhụ ụgha unu niile. Edoola m onwe m imegide unu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
And therefore say, Thus says the Lord; Because your words are false, and your prophecies are vain, therefore, behold, I am against you, says the Lord.
9 Aka m ga-emegide ndị amụma niile ahụ bụ ndị na-ahụ ọhụ ụgha, na-agbakwa afa ụgha. Ha a gaghị esonye na otu ọgbakọ ndị m maọbụ bụrụ ndị agụnyekọrọ nʼakwụkwọ ndekọta aha ụlọ nke Izrel, ha agaghị abakwa nʼala ndị Izrel. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.
And I will stretch forth my hand against the prophets that see false [visions], and those that utter vanities: they shall not partake of the instruction of my people, neither shall they be written in the roll of the house of Israel, and they shall not enter into the land of Israel; and they shall know that I am the Lord.
10 “‘Nʼihi na ha eduhiela ndị m, mgbe ha na-asị, “Udo,” ebe udo na-adịghị, nʼihi na mgbe e wuru mgbidi na-esighị ike, ndị amụma ndị a jara ha mma, werekwa nzu techie ya.
Because they have caused my people to err, saying, Peace; and there is no peace; and one builds a wall, and they plaster it, —it shall fall.
11 Ya mere, gwa ndị ahụ jiri nzu techie mgbidi ahụ na ọ ga-ada. Oke mmiri ozuzo nke ga-ezobiga oke ga-ezo, aga m ezitekwa mkpụrụ mmiri dị ukwuu nke ga-ada, na oke ifufe nke ga-akwada ya.
Say to them that plaster [it], It shall fall; and there shall be a flooding rain; and I will send great stones upon their joinings, and they shall fall; and there shall be a sweeping wind, and it shall be broken.
12 Mgbe mgbidi ahụ dara, ndị mmadụ ọ gaghị ajụ, “Olee ebe mgba ọcha ahụ ị ji techie ya dị?”
And behold! the wall has fallen; and will they not say to you, Where is your plaster wherewith you plastered [it]?
13 “‘Ya mere, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, aga m eji oke ifufe nke ọnụma m, na oke mmiri ozuzo nke iwe m, ma oke akụmmiri nke oke iwe m mebie ya.
Therefore thus says the Lord; I will even cause to burst forth a sweeping blast with fury, and there shall be a flooding rain in my wrath; and in [my] fury I will bring on great stones for complete destruction.
14 Aga m akwada mgbidi ahụ unu tere nzu, aga m emekwa ka ọ daruo ala nke ga-eme ka ahụ ntọala ya anya; ọ ga-adakwasịkwa unu, gwepịa unu. Mgbe ọ dara ọ ga-egbuchapụ unu niile; unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
And I will break down the wall which you have plastered, and it shall fall; and I will lay it on the ground, and its foundations shall be discovered, and it shall fall; and you shall be consumed with rebukes: and you shall know that I am the Lord.
15 Otu a ka m ga-esi gosipụta iwe m nʼebe mgbidi ahụ nọ, na nʼahụ ndị ahụ ji nzu techie ya. Aga m asị unu, “Mgbidi ahụ adịghịkwa, otu a ka ọ dịkwa ndị ahụ ji nzu techie ya,
And I will accomplish my wrath upon the wall, and upon them that plaster it; it shall fall: and I said to you, The wall is not, nor they that plaster it,
16 bụ ndị amụma Izrel ndị ahụ buru amụma nye Jerusalem, ndị hụkwara ya ọhụ udo mgbe udo na-adịghị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”’
even the prophets of Israel, who prophesy concerning Jerusalem, and who see [visions of] peace for her, and there is no peace, says the Lord.
17 “Ma ugbu a, gị nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe ụmụada ndị unu nọ, ndị nke na-ebu amụma dị ka o si si ha nʼobi pụta. Buo amụma megide ha
And you, son of man, set your face firmly against the daughters of your people, that prophesy out of their own heart; and prophesy against them.
18 sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Ahụhụ dịrị ndị inyom na-adụnye ọgwụ mgbaasị na nkwoji aka ha na-emekwa akwa mgbokwasị nke ikpuchi isi maka ndị mmadụ dị iche iche, iji raata ha. Unu si aṅaa chee na unu ga-echebe ndụ unu mgbe unu buru ụzọ mee ka ndị m maa nʼọnya?
And you shall say, Thus says the Lord, Woe to the [women] that sew pillows under every elbow, and make kerchiefs on the head of every stature to pervert souls! The souls of my people are perverted, and they have saved souls alive.
19 Unu emeela ka m ghara ịdị nsọ nʼetiti ndị m, nʼihi mkpoju aka ọka balị na iberibe achịcha ole na ole. Nʼihi ya, unu emeela ka ha nwụọ bụ ndị na-ekwesighị ịnwụ anwụ. Unu edebekwala ha ndụ bụ ndị na-ekwesighị ịdị ndụ, site nʼokwu ụgha unu na-agwa ndị m, bụ ndị na-aṅa ntị nʼokwu ụgha.
And they have dishonoured me before my people for a handful of barley, and for pieces of bread, to kill the souls which should not die, and to save alive the souls which should not live, while you speak to a people hearing vain speeches.
20 “‘Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, ana m emegide ọgwụ mgbaasị niile nke unu ji achụ nta mkpụrụobi ndị m dịka nnụnụ. Aga m adọwapụ ha site nʼaka unu, napụtakwa ndị m, bụ ndị unu ji nʼọnya dị ka nnụnụ e tinyere nʼụlọ akpara akpa.
Therefore thus says the Lord God, Behold, I am against your pillows, whereby you there confound souls, and I will tear them away from your arms, and will set at liberty their souls which you pervert to scatter them.
21 Aga m adọwa akwa mgbokwasị ọgwụ unu, napụta ndị m site nʼaka unu. Ha agaghị amakwa nʼọnya nke ike unu ọzọ. Nʼụzọ dị otu a unu ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
And I will tear your kerchiefs, and will rescue my people out of your hands, and they shall no longer be in your hands to be confounded; and you shall know that I am the Lord.
22 Nʼihi na ụgha unu emeela ka obi ndị ezi omume daa mba, mgbe ọ na-abụghị uche m na ihe dị otu a ga-eme. Ma unu emeela ka obi ndị ajọ omume sie ike site na nkwa ogologo ndụ unu kwere ha, mee ka ha ghara isite nʼụzọ ọjọọ ha chegharịa ma zọpụta ndụ ha.
Because you have perverted the heart of the righteous, whereas I perverted him not, and [that] in order to strengthen the hands of the wicked, that he should not at all turn from his evil way and live:
23 Nʼihi nke a, unu agaghị ahụkwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ gbaa afa. M ga-anapụta ndị nke m site nʼaka unu. Mgbe ahụ unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
therefore you shall not see false [visions], and you shall no more utter prophecies: but I will deliver my people out of your hand; and you shall know that I am the Lord.

< Izikiel 13 >